Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 22:1-30

22  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Gbadaa n’ụlọ eze Juda, kwuo okwu a n’ebe ahu.  Kwuo, sị, “Nụrụ ihe Jehova kwuru, gị eze Juda, onye nọ n’ocheeze Devid,+ gị na ndị na-ejere gị ozi, tinyere ndị gị, bụ́ ndị na-esi n’ọnụ ụzọ ámá ndị a abata.+  Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Kpeenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ezi omume, napụtanụ onye a na-apụnara ihe n’aka onye na-erigbu ya; unu emegbula onye mbịarambịa ọ bụla, nwa na-enweghị nna ma ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ.+ Unu emesola ha ihe ike.+ Unu awụfukwala ọbara ọ bụla na-emeghị ihe ọjọọ n’ebe a.+  N’ihi na ọ bụrụ na unu edebe okwu a, ndị eze, bụ́ ndị na-anọchi Devid n’ocheeze ya,+ ga-esi n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ a na-abata, ha ga-anọ n’ime ụgbọ ịnyịnya, nọkwasịkwa n’elu ịnyịnya, eze nke ọ bụla na ndị na-ejere ya ozi, tinyere ndị ya.”’+  “‘Ma ọ bụrụ na unu erubeghị isi n’ihe ndị a m kwuru, eji m onwe m na-aṅụ iyi,’+ ka Jehova kwuru, ‘na ụlọ a ga-aghọ ebe a lara n’iyi kpamkpam.’+  “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere ụlọ eze Juda, ‘N’ebe m nọ, ị dị ka Gilied na ọnụ ọnụ ugwu Lebanọn.+ N’ezie, m ga-eme ka ị bụrụ ala ịkpa;+ ọ dịghịkwa nke ọ bụla n’ime obodo gị a ga-ebi ebi.+  M ga-edo ndị ga-ebibi gị nsọ,+ onye nke ọ bụla na ngwá ọgụ ya;+ ha ga-egbutu osisi sida gị ndị kasị mma,+ meekwa ka ha daba n’ọkụ.+  Ọtụtụ mba ga-agafere obodo a wee sị mba ibe ha: “Gịnị mere Jehova ji mee obodo ukwu a ihe a?”+  Ha ga-asịkwa: “Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke ha+ wee na-akpọrọ chi ọzọ dị iche iche isiala, na-efekwa ha.”’+ 10  “Unu akwarala onye nwụrụ anwụ ákwá,+ unu erurula ya uju. Kwasierenụ onye a dọọrọ n’agha ákwá ike, n’ihi na ọ gaghị alọta ọzọ, ọ gaghịkwa ahụ ala ndị ikwu ya anya ọzọ. 11  N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere Shalọm+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, onye na-achị n’ọnọdụ Josaya nna ya,+ bụ́ onye si ebe a pụọ, ‘Ọ gaghị alọta ebe a ọzọ. 12  N’ihi na n’obodo a dọọrọ ya n’agha laa ka ọ ga-anwụ, ọ gaghịkwa ahụ ala a anya ọzọ.’+ 13  “Ahụhụ ga-adịrị onye na-ejighị ezi omume na-ewu ụlọ ya,+ onye na-ejighịkwa ikpe ziri ezi na-ewu ọnụ ụlọ ya n’elu ya, site n’ime ka mmadụ ibe ya rụọ ọrụ n’efu, n’akwụghị ya ụgwọ;+ 14  ee, onye na-asị, ‘M ga-ewuru onwe m ụlọ sara mbara na ọnụ ụlọ ndị dị obosara n’elu ya;+ windo m ga-etinye ya ga-adị obosara, m ga-eji osisi sida kụchie ya,+ teekwa ya ágbá na-acha uhie uhie.+ 15  Ị̀ ga na-achị n’ihi na i ji osisi sida na-egosi na ị ka ndị ọzọ? Ọ̀ bụ na nna gị erighị ihe oriri, ṅụọ ihe ọṅụṅụ ma mee ihe n’ikpe ziri ezi, meekwa ezi omume?+ Ihe wee gaziere ya.+ 16  O kpechitere ọnụ onye nọ n’ahụhụ na ogbenye.+ Ihe wee gaziere ya. ‘Ọ́ bụghị nke ahụ bụ ịmara m?’ ka Jehova kwuru. 17  ‘Anya gị na obi gị dị naanị n’uru na-ezighị ezi,+ dịrịkwa n’ọbara onye aka ya dị ọcha ka ị wụfuo ya,+ dịrịkwa n’irigbu ndị mmadụ nakwa n’ịpụnara ha ihe ka i wee na-eme ihe ndị a.’ 18  “Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, ‘Ha agaghị akwara ya ákwá arịrị, sị: “Ewoo, nwanne m nwoke! Ewoo, nwanne m nwaanyị!” Ha agaghị akwara ya ákwá arịrị, sị: “Ewoo, nna m ukwu! Ewoo, ùgwù ya!”+ 19  A ga-eli ya dị ka oké ịnyịnya ibu,+ kpụrụ ya n’ala gaa tụfuo ná mpụga ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.’+ 20  “Gbagoo Lebanọn+ tie mkpu ákwá, kwaakwa ákwá n’oké olu na Beshan.+ Nọrọkwa n’Abarim tie mkpu ákwá,+ n’ihi na e bibiwo ndị niile hụrụ gị n’anya nke ukwuu.+ 21  M gwara gị okwu n’oge ị na-enweghị ihe na-echegbu gị.+ Ị sịrị, ‘Agaghị m erube isi.’+ Nke a bụ otú ị na-eme kemgbe ị bụ nwata, n’ihi na i rubeghị isi n’ihe m kwuru.+ 22  Ifufe ga-azụ ndị ọzụzụ atụrụ gị niile dị ka atụrụ;+ a ga-adọrọ ndị hụrụ gị n’anya nke ukwuu n’agha.+ N’ihi na ihere ga-eme gị n’oge ahụ, ị ga-abụkwa onye e mechuru ihu n’ihi ọdachi gị dum.+ 23  Gị onye bi na Lebanọn,+ onye kpara akwụ́ n’osisi sida,+ lee ka ị ga-esi sụọ ude mgbe ị ga-enwe ihe mgbu,+ dị ka ihe mgbu nke nwaanyị na-amụ nwa!”+ 24  “‘Dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Jehova kwuru, ‘Gị Konaya+ nwa Jehoyakim,+ bụ́ eze Juda, ọ bụrụgodị na ị bụ mgbaaka e ji aka ihe akara+ nke m gba n’aka nri, m ga-agbapụ gị n’ebe ahụ!+ 25  M ga-enyefe gị n’aka ndị na-achọ mkpụrụ obi gị+ nakwa n’aka ndị ị na-atụ egwu nakwa n’aka Nebukadreza bụ́ eze Babịlọn nakwa n’aka ndị Kaldia.+ 26  M ga-atụga gị na nne mụrụ gị+ n’ala ọzọ nke na-abụghị ebe a mụrụ unu, unu ga-anwụkwa n’ebe ahụ.+ 27  Ha agaghị alọta n’ala nke ga na-agụ mkpụrụ obi ha agụụ ka ha lọta.+ 28  Nwoke a bụ́ Konaya+ ọ̀ bụ arịa nkịtị e ledara anya, nke a kụriri akụri,+ ka ọ̀ bụ arịa mmadụ na-enweghị mmasị na ya?+ Gịnị mere a ga-eji tụda ya na mkpụrụ ya n’ala, tụgakwa ha n’ala ha na-amaghị?’+ 29  “Gị ala, ala, ala, nụrụ ihe Jehova kwuru.+ 30  Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Deenụ aha nwoke a dị ka onye na-amụtaghị nwa,+ dị ka dimkpa nke na-agaghị enwe ihe ịga nke ọma n’ụbọchị ya; n’ihi na ọ dịghị otu n’ime ụmụ ya ga-enwe ihe ịga nke ọma ọ bụla,+ ọ dịghị nke ga-anọkwasị n’ocheeze Devid+ wee chịa ọzọ na Juda.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji