Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jeremaya 18:1-23

18  Nke a bụ okwu Jehova nke ruru Jeremaya ntị, sị:  “Bilie gbadaa n’ụlọ ọkpụite,+ m ga-eme ka ị nụ okwu m n’ebe ahụ.”  M wee gbadaa n’ụlọ ọkpụite, lee, o ji wiil e ji akpụ ite na-akpụ ite.  Aka ọkpụite ahụ wee mebie arịa o ji ụrọ na-akpụ, o wee tụgharịa were ya kpụọ ụdị arịa ọzọ, dị ka ọ dị mma n’anya ọkpụite ahụ isi kpụọ ya.+  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “‘Unu ụlọ Izrel, ọ̀ bụ na mụ enweghị ike ime unu ihe ọkpụite a mere?’ ka Jehova kwuru. ‘Lee! Dị ka ụrọ ọkpụite ji n’aka, otú ahụ ka unu dị n’aka m, unu ụlọ Izrel.+  Mgbe ọ bụla m kwuru okwu banyere mba ọ bụla, kwuokwa okwu banyere alaeze ọ bụla, na m ga-efopụ ya, kwatuokwa ya ma bibie ya,+  mba ahụ wee hapụ ihe ọjọọ ya nke m kwuru na ọ dịghị mma,+ m ga-agbanwe obi m n’ọdachi ahụ m bu n’obi ime ka ọ dakwasị ya.+  Ma mgbe ọ bụla m kwuru okwu banyere mba, kwuokwa okwu banyere alaeze, na m ga-ewu ya ma kụọ ya dị ka osisi,+ 10  o wee mee ihe ọjọọ n’anya m site n’erubeghị isi n’ihe m kwuru,+ m ga-agbanwe obi m banyere ihe ọma m kwuru n’obi m na m ga-eme maka ọdịmma ya.’ 11  “Ugbu a, biko, gwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m na-akwadebere unu ọdachi, na-echekwa echiche ime unu ihe.+ Biko, onye ọ bụla n’ime unu hapụ ụzọ ọjọọ ya, meekwanụ ka ụzọ unu na omume unu dị mma.”’”+ 12  Ha wee sị: “Ọ baghị uru!+ N’ihi na anyị ga na-eme uche anyị, onye ọ bụla n’ime anyị ga na-emekwa isi ike nke dị n’ajọ obi ya.”+ 13  Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Biko, jirinụ ọnụ unu jụọ ajụjụ n’etiti mba dị iche iche. Ònye nụtụworo ụdị ihe ndị a? E nwere ihe jọgburu onwe ya nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Izrel mebigaworo ókè.+ 14  Snoo nke na-ada na Lebanọn ọ̀ ga-akwụsị ịdị n’elu oké nkume dị n’ọhịa? Ka mmiri si n’ala ọzọ, nke jụrụ oyi, nke na-asọ asọ, ọ̀ ga-ata? 15  N’ihi na ndị m echefuwo m+ n’ihi na ha na-esurere ihe na-abaghị uru ihe nsure ọkụ,+ n’ihi na ha na-emekwa ka ndị mmadụ sụọ ngọngọ n’ụzọ ha,+ bụ́ ụzọ nke dịwara kemgbe oge ochie,+ wee soro okporo ụzọ ọzọ, bụ́ ụzọ a na-awụghị ájá, 16  ka ha wee mee ka ala ha bụrụ ihe ijuanya,+ nke a ga na-afụrụ mkpọrọhịhị ruo mgbe a na-akaghị aka.+ Onye ọ bụla nke na-agafere ya ga-ekporopụ anya na-ele ya, fufeekwa n’isi.+ 17  M ga-achụsasị ha n’ihu ndị iro ha dị ka ebe ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ fesasịrị ihe.+ M ga-agbakụta ha azụ, agaghị m eche ihu+ n’ebe ha nọ n’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị ha.” 18  Ha wee sị: “Bịanụ ka anyị chepụta ihe anyị ga-eme Jeremaya,+ n’ihi na iwu agaghị akọ ụkọ n’ọnụ ndị nchụàjà,+ ndụmọdụ agaghị akọ ụkọ n’ọnụ onye maara ihe, okwu agaghịkwa akọ ụkọ n’ọnụ onye amụma.+ Bịanụ ka anyị were ire anyị mee ya ihe,+ ka anyị gharakwa ịṅa ntị n’ihe ọ bụla ọ na-ekwu.” 19  Jehova, biko, ṅaa m ntị, nụrụkwa ihe ndị na-emegide m na-ekwu.+ 20  È kwesịrị iji ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọma?+ N’ihi na ha egwuworo mkpụrụ obi m olulu.+ Cheta otú m si guzoro n’ihu gị kwuo ihe ọma banyere ha, iji mee ka oké iwe ị na-eweso ha dajụọ.+ 21  Ya mere, nyefee ụmụ ha n’aka ụnwụ,+ nyefeekwa ha n’aka mma agha;+ ka ndị nwunye ha ghọọ ụmụ nwaanyị gba aka ụmụ na ndị inyom di ha nwụrụ.+ Ka ajọ ọrịa gbuo ndị ikom ha, ka mma agha gbuokwa ụmụ okorobịa ha n’agha.+ 22  Ka a nụ mkpu ákwá n’ụlọ ha mgbe ị ga-eme ka ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga wakpo ha na mberede.+ N’ihi na ha egwuwo olulu ka ha wee jide m, ha esiwokwa ọnyà ka ọ ma m n’ụkwụ.+ 23  Ma gị onwe gị, Jehova, maara nke ọma atụmatụ niile ha na-eme igbu m.+ Ekpuchila njehie ha, ehichapụkwala mmehie ha n’ihu gị;+ kama, ka e mee ka ha sụọ ngọngọ n’ihu gị. N’oge ị ga-ewe iwe, mee ha ihe.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji