Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jems 4:1-17

4  Olee ebe agha si bịa, oleekwa ebe ọgụ a na-alụ n’etiti unu si bịa? Ọ̀ bụ na ebe ihe ndị a si bịa+ abụghị n’agụụ unu na-enwe maka ihe ụtọ anụ ahụ́ nke na-alụ ọgụ n’akụkụ ahụ́ unu?+  Unu na-achọ, ma unu adịghị enweta. Unu na-egbu ọchụ,+ na-enwekwa anyaukwu,+ ma unu enweghị ike inweta. Unu na-alụ ọgụ+ ma na-ebu agha. Unu adịghị enweta n’ihi na unu adịghị arịọ.  Unu na-arịọ, ma unu adịghị arịọta, n’ihi na ihe mere unu ji na-arịọ ezighị ezi,+ ka unu wee mefuo ya n’agụụ ihe ụtọ anụ ahụ́ nke na-agụ unu.+  Ndị na-akwa iko,+ ùnu amaghị na ịbụ enyi ụwa bụ ịbụ onye iro Chineke?+ Ya mere, onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ enyi+ ụwa na-eme onwe ya onye iro Chineke.+  Ka ùnu chere na ọ bụ n’efu ka Akwụkwọ Nsọ kwuru, sị: “Mmụọ+ nke anyaụfụ nke bi n’ime anyị na-enwe agụụ siri ike maka ihe dị iche iche”?  Ma, obiọma na-erughịrị mmadụ nke ọ na-egosi ka ukwuu.+ N’ihi ya, o kwuru, sị: “Chineke na-emegide ndị mpako,+ ma ọ na-egosi ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.”+  Ya mere, doonụ onwe unu+ n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu,+ ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.+  Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.+ Meenụ ka aka unu dị ọcha, unu ndị mmehie,+ meekwanụ ka obi unu dị ọcha,+ unu ndị nwere uche abụọ.+  Hụsienụ anya, ruonụ uju, kwaakwanụ ákwá.+ Ka ọchị unu ghọọ iru uju, ka ọṅụ unu ghọọkwa nkụda mmụọ.+ 10  Wedanụ onwe unu ala n’anya Jehova,+ ọ ga-ebulikwa unu elu.+ 11  Ụmụnna m, kwụsịnụ ikwugide ibe unu.+ Onye na-ekwugide nwanna ya ma ọ bụ na-ekpe nwanna ya ikpe+ na-ekwugide iwu, na-ekpekwa iwu ikpe. Ma ọ bụrụ na ị na-ekpe iwu ikpe, ị bụghị onye na-edebe iwu, kama onyeikpe.+ 12  E nwere otu onye nke bụ́ onye na-enye iwu na onyeikpe,+ onye nwere ike ịzọpụta mmadụ na ibibi mmadụ.+ Ma gị onwe gị, ònye ka ị bụ na ị ga na-ekpe onye agbata obi gị ikpe?+ 13  Ugbu a, bịanụ, unu ndị na-asị: “Taa ma ọ bụ echi, anyị ga-eje obodo a, nọọkwa otu afọ n’ebe ahụ, anyị ga-azụkwa ahịa, rite uru,”+ 14  ma unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi.+ N’ihi na unu bụ alụlụụ nke na-apụta ruo nwa oge wee pụọ n’anya.+ 15  Kama nke ahụ, unu kwesịrị ikwu, sị: “Ọ bụrụ uche Jehova,+ anyị ga-adị ndụ wee mee nke a ma ọ bụ nke ọzọ.”+ 16  Ma ugbu a, unu na-akpa nganga n’ọnụ unu na-etu.+ Ụdị ịkpa nganga ahụ niile bụ ihe ọjọọ. 17  Ya mere, ọ bụrụ na mmadụ maara otú ọ ga-esi mee ihe ziri ezi ma o meghị ya,+ ọ bụụrụ ya mmehie.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji