Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ilu 4:1-27

4  Ụmụ m, nụrụnụ ịdọ aka ná ntị nna unu,+ ṅaakwanụ ntị, ka unu wee nwee nghọta.+  N’ihi na m ga-enye unu ezi ntụziaka.+ Unu ahapụkwala iwu m.+  N’ihi na abụụrụ m nna m ezi nwa,+ bụrụkwa onye dị pekepeke nke a mụrụ naanị ya n’ihu nne m.+  Nna m na-ezikwa m ihe,+ sị m: “Ka obi gị+ jidesie okwu m ike.+ Debe ihe m nyere n’iwu, wee dịrị ndụ.+  Nweta amamihe,+ nweta nghọta.+ Echefula, ahapụkwala okwu ọnụ m.+  Ahapụla ya, ọ ga-edebe gị ndụ. Hụ ya n’anya, ọ ga-echebekwa gị.  Amamihe bụ isi.+ Nweta amamihe; were ihe niile ị na-enweta nweta nghọta.+  Were ya kpọrọ oké ihe, ọ ga-ebulikwa gị elu.+ Ọ ga-eme ka i nwee otuto n’ihi na ị na-amakụ ya.+  Ọ ga-atụkwasị okpu ọma e ji okooko kpaa n’isi gị;+ ọ ga-ekpuwe gị okpueze mara mma.”+ 10  Nwa m, nụrụ, nabatakwa ihe m na-ekwu.+ Afọ ndụ gị ga-adịkwa ọtụtụ.+ 11  M ga-ezi gị ụzọ amamihe;+ m ga-eme ka i jee ije n’ụzọ ziri ezi.+ 12  Mgbe ị na-eje ije, ijeụkwụ gị agaghị enwe ihe mgbochi;+ ọ bụrụkwa na ị na-agba ọsọ, ị gaghị asụ ngọngọ.+ 13  Jisie ịdọ aka ná ntị ike;+ ahapụla ya.+ Chekwaa ya, n’ihi na ọ bụ ya bụ ndụ gị.+ 14  Abanyela n’ụzọ ndị ajọ omume,+ abanyekwala n’ụzọ ndị ọjọọ+. 15  Zere ya,+ agala na ya;+ si na ya pụta, gawara onwe gị.+ 16  N’ihi na ha adịghị arahụ ụra ọ gwụla ma hà mere ihe ọjọọ,+ ụra adịghịkwa atụ ha ọ gwụla ma hà mere ka mmadụ sụọ ngọngọ.+ 17  N’ihi na ha eriwo nri ajọ omume,+ ọ bụkwa mmanya ime ihe ike ka ha na-aṅụ.+ 18  Ma ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè nke na-enwupụ enwupụ ka chi na-abọwanye ruo mgbe chi bọchara.+ 19  Ụzọ ndị ajọ omume yiri ọchịchịrị;+ ha amaghịkwa ihe na-akpọbi ha ụkwụ.+ 20  Nwa m, ṅaa ntị n’okwu m.+ Tọọkwa ntị n’ala n’ihe m na-ekwu.+ 21  Ka ọ ghara isi n’anya gị pụọ.+ Debe ya n’ime obi gị.+ 22  N’ihi na ọ bụụrụ ndị na-achọta ya ndụ,+ bụrụkwa ahụ́ ike nke anụ ahụ́ ha niile.+ 23  Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị,+ n’ihi na ọ bụ na ya ka isi iyi nke ndụ si apụta.+ 24  Wepụ okwu gbagọrọ agbagọ n’ebe ị nọ;+ meekwa ka egbugbere ọnụ aghụghọ dị anya n’ebe ị nọ.+ 25  Anya gị abụọ kwesịrị ilegide n’ihu,+ ee, anya gị nke na-enwu gbaa kwesịrị ilegide n’ihu gị.+ 26  Mee ka ụzọ nke ụkwụ gị na-aga dị larịị,+ ka e meekwa ka ụzọ gị niile guzosie ike.+ 27  Anwakwala ịga n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.+ Wepụ ụkwụ gị n’ihe ọjọọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji