Ilu 30:1-33
30 Okwu Egọ nwa Jeke, okwu gbara ọkpụrụkpụ.+ Okwu dimkpa gwara Itiel, bụ́ nke ọ gwara Itiel na Yukal.
2 N’ihi na adị m nzuzu karịa onye ọ bụla ọzọ,+ adịghịkwa m aghọta ihe dị ka ụmụ mmadụ si aghọta;+
3 amụtaghịkwa m ihe bụ́ amamihe;+ ọ bụkwa ihe ọmụma nke Onye Kasị Nsọ ka m na-amaghị.+
4 Ònye rịgoworo n’eluigwe, ka o wee rịdata?+ Ònye jiworo ọbụ aka ya abụọ kpokọta ifufe?+ Ònye jiworo ákwà mgbokwasị kechie mmiri?+ Ònye meworo ka nsọtụ niile nke ụwa dịrị?+ Gịnị bụ aha ya,+ gịnịkwa bụ aha ọkpara ya, ma ọ bụrụ na ị maara?+
5 Okwu niile Chineke kwuru bụ nke a nụchara anụcha.+ Ya onwe ya bụụrụ ndị na-agbaba n’ime ya ọta.+
6 Atụkwasịla ihe ọ bụla n’okwu ya,+ ka ọ ghara ịbara gị mba, ka ị gharakwa ịbụ onye ụgha.+
7 Ihe abụọ ka m rịọworo gị.+ Ahapụla imere m ha tupu mụ anwụọ.+
8 Mee ka ụgha na okwu ụgha dị anya n’ebe m nọ.+ Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba.+ Ka m rie nri e kenyere m,+
9 ka afọ ghara iju m, m wee gọnahụ gị,+ sị: “Ònye bụ Jehova?”+ ka m gharakwa ịda ogbenye, m wee zuo ohi ma metọọ aha Chineke m.+
10 Ekwutọla onye na-eje ozi ná ntị nna ya ukwu,+ ka o wee ghara ịkọcha gị, ka i wee ghara ịbụ onye ikpe mara.+
11 E nwere ọgbọ nke na-akpọ ọbụna nna ya iyi, nke na-adịghịkwa agọzi ọbụna nne ya.+
12 E nwere ọgbọ nke dị ọcha n’anya onwe ya,+ ma a sachapụbeghị nsị ya n’ahụ́ ya.+
13 E nwere ọgbọ nke anya ya dị oké elu, nke anya ya nke na-enwu gbaa dị elu.+
14 E nwere ọgbọ nke ezé ya bụ mma agha, nke ọkpụkpụ agba ya bụ mma e ji egbu anụ,+ irichapụ ndị nọ n’ahụhụ n’ụwa, irichapụkwa ndị ogbenye n’etiti ụmụ mmadụ.+
15 Etu mụrụ ụmụ abụọ ndị na-ebe, sị: “Nye m! Nye m!” E nwere ihe atọ afọ na-adịghị eju eju, ee, ihe anọ na-adịghị asị: “O zuola!”
16 Shiol+ na akpa nwa e mechiri emechi,+ ala nke mmiri na-adịghị eju afọ,+ na ọkụ+ nke na-adịghị asị: “O zuola!”+
17 Anya nke na-akwa nna ya emo, nke na-elegharakwa irubere nne ya isi+—ugoloọma nke ndagwurugwu ga-aghụpụta ya, ụmụ ugo ga-erikwa ya.
18 E nwere ihe atọ na-atụ m n’anya nke ukwuu, ee, ihe anọ nke m na-amatabeghị:
19 ụzọ ugo n’eluigwe, ụzọ agwọ n’elu oké nkume, ụzọ ụgbọ mmiri n’etiti oké osimiri+ na ụzọ nwoke n’ebe nwa agbọghọ nọ.+
20 Otú a ka ụzọ nwaanyị na-akwa iko dị: o riwo ihe ma hichaa ọnụ ya, ọ sịwokwa: “Ọ dịghị ihe ọjọọ m mere.”+
21 Ihe atọ emewo ka ụwa maa jijiji, ihe anọ ekweghịkwa ya odidi:
22 ohu, mgbe ọ na-achị dị ka eze,+ na onye iberiibe, mgbe o nwere ihe oriri na-ezuru ya;+
23 nwaanyị a kpọrọ asị, mgbe a lụụrụ ya,+ na nwaanyị na-eje ozi, mgbe ọ nọchiri nne ya ukwu.+
24 E nwere ihe anọ kasị nta n’ụwa, ma amamihe ha nwere bụ nke ha bu pụta ụwa:+
25 ndanda bụ ndị na-adịghị ike,+ ma ha na-akwadebe ihe oriri ha n’ọkọchị;+
26 ewi nkume+ bụ ndị na-adịghị ike, ma n’elu nkume dị elu ka ha na-ewu ụlọ ha;+
27 igurube+ enweghị eze, ma ha niile na-aga n’ìgwè n’ìgwè;+
28 agụ ụlọ+ na-agagide aka n’ihe, ọ na-anọkwa ná nnukwu obí eze.
29 E nwere ihe atọ na-eme nke ọma n’otú ha si agba ọsọ, e nwekwara ihe anọ na-aga ije nganga:
30 ọdụm, anụ kasị ike n’etiti anụ ọhịa, nke na-adịghịkwa alaghachi azụ n’ihu onye ọ bụla;+
31 nkịta ntá ma ọ bụ mkpi, na eze nke nwere ìgwè ndị agha bụ́ ndị ya.+
32 Ọ bụrụ na i mewo omume nzuzu site n’ibuli onwe gị elu,+ ọ bụrụkwa na i tinyewo uche gị ime ya, kpuchie aka n’ọnụ.+
33 N’ihi na ọ bụ ịkpagharịsi mmiri ara ehi ike na-eme ka e nweta mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, ọ bụ ịpịsi aka ike n’imi na-akpata ọzọimi, ọ bụkwa iwe iwe na-akpata esemokwu.+