Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ilu 29:1-27

29  Onye a na-adọ aka ná ntị ugboro ugboro+ ma ya ana-ekwesi olu ike,+ a ga-agbaji ya na mberede, ngwọta agaghịkwa adị.+  Mgbe ndị ezi omume dị ọtụtụ, ndị mmadụ na-aṅụrị ọṅụ;+ ma mgbe onye ajọ omume ọ bụla na-achị, ndị mmadụ na-asụ ude.+  Onye hụrụ amamihe n’anya na-eme ka nna ya ṅụrịa,+ ma onye ya na ndị akwụna na-akpakọrịta na-ebibi ihe ndị dị oké ọnụ ahịa.+  Eze na-eme ka obodo guzosie ike site n’ikpe ziri ezi,+ ma onye na-eri ngarị na-akwada ya akwada.+  Dimkpa nke na-eto mmadụ ibe ya otuto efu+ bụ ụgbụ ka ọ na-agbasara ụkwụ ya.+  Ọnyà dị ná njehie nke onye ọjọọ,+ ma onye ezi omume na-eti mkpu ọṅụ, na-enwekwa obi ụtọ.+  Onye ezi omume maara ihe ruuru ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha.+ Onye ajọ omume adịghị achọ ịma.+  Ndị na-etu ọnụ na-amụnye obodo ọkụ,+ ma ndị maara ihe na-eme ka iwe dajụọ.+  Onye maara ihe na onye nzuzu abawo n’ikpe—onye nzuzu ewewo oké iwe, chịakwa ọchị, izu ike adịghịrị onye maara ihe.+ 10  Ndị ịwụfu ọbara na-agụ agụụ kpọrọ onye ọ bụla nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta asị;+ ma ndị ziri ezi na-achọ ọdịmma nke mkpụrụ obi ibe ha.+ 11  Onye nzuzu adịghị ejide mmụọ ya ma ọlị, ma onye maara ihe na-ejideru ya n’isi.+ 12  N’ebe onye na-achị achị na-aṅa ntị n’okwu ụgha, ndị niile na-ejere ya ozi ga-abụ ndị ajọ omume.+ 13  Onye dara ogbenye na onye mmegbu ezutewo;+ ma Jehova na-eme ka anya ha abụọ nwee ìhè.+ 14  N’ebe onye eze na-ekpe ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ikpe n’eziokwu,+ a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe niile.+ 15  Ọ bụ ụtarị na ịdọ aka ná ntị na-enye amamihe;+ ma nwata a hapụrụ ka ọ na-eme otú masịrị ya ga na-emenye nne ya ihere.+ 16  Mgbe ndị ajọ omume dị ọtụtụ, mmebi iwu na-adị ukwuu; ma ndị ezi omume ga na-ele ọdịda ha anya.+ 17  Nye nwa gị ntaramahụhụ, ọ ga-eme ka i zuru ike, meekwa ka mkpụrụ obi gị ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu.+ 18  N’ebe ọhụụ na-adịghị, ndị mmadụ adịghị enwe nchịkwa,+ ma obi ụtọ na-adịrị ndị na-edebe iwu.+ 19  Onye na-eje ozi agaghị anabata okwu ọnụ a gwara ya iji gbazie ya,+ n’ihi na ọ na-aghọta ihe ma ọ dịghị aṅa ntị.+ 20  Ị̀ hụla onye ọ na-adị ngwa ikwu okwu?+ Olileanya dịịrị onye nzuzu karịa ka ọ dịịrị ya.+ 21  Ọ bụrụ na mmadụ na-azụtọ onye na-ejere ya ozi malite n’oge ọ bụ nwata, mgbe o mere okenye, ọ ga-aghọ onye na-enweghị ekele. 22  Onye na-ewekarị iwe na-akpalite esemokwu,+ onye ọ bụla nke na-ewekarị oké iwe na-eme ọtụtụ mmehie.+ 23  Ọ bụ mpako mmadụ ga-eweda ya ala,+ ma onye dị umeala na mmụọ ya ga-enweta otuto.+ 24  Onye ya na onye ohi na-akpakọrịta kpọrọ mkpụrụ obi onwe ya asị.+ Ọ pụrụ ịnụ iyi a ṅụrụ nke pụrụ iweta ọbụbụ ọnụ, ma ọ dịghị akọ ihe ọ bụla.+ 25  Ịtụ mmadụ egwu na-eweta ọnyà,+ ma a ga-echebe onye tụkwasịrị Jehova obi.+ 26  Ndị na-achọ ihu ọma onye na-achị achị dị ọtụtụ,+ ma mmadụ inweta ikpe ziri ezi na-esi n’aka Jehova.+ 27  Onye na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi bụ ihe arụ n’anya ndị ezi omume,+ onye ụzọ ya ziri ezi bụkwa ihe arụ n’anya onye ajọ omume.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji