Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ilu 19:1-29

19  Onye ọ bụla nke dara ogbenye, nke na-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe, ka onye egbugbere ọnụ ya gbagọrọ agbagọ mma,+ kakwa onye nzuzu mma.+  Ọ dịghị mma ma ọ bụrụ na mkpụrụ obi enweghị ihe ọmụma,+ onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-emekwa mmehie.+  Ọ bụ nzuzu mmadụ na-agbagọ ụzọ ya,+ obi ya ewee na-eweso Jehova oké iwe.+  Akụ̀ na-eme ka mmadụ nwee ọtụtụ enyi,+ ma a na-ekewapụ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya n’ebe enyi ya nọ.+  Onye akaebe ụgha agaghị agbanahụ ntaramahụhụ,+ onye na-ekupụkwa okwu ụgha dị ka ume agaghị alanahụ.+  Ndị na-eme ka obi onye a ma ama jụrụ dị ọtụtụ,+ mmadụ niile bụkwa enyi onye na-enye onyinye.+  Ụmụnne niile nke onye dara ogbenye akpọwo ya asị.+ Lezienụ ka ndị enyi ya si nọrọ ya n’ebe dị ezigbo anya!+ Ọ kpụ okwu n’ọnụ chụrụ ha na-aga; ha anọghị ya.+  Onye na-enweta ezi uche+ hụrụ mkpụrụ obi nke ya n’anya. Onye na-eche nghọta nche ga-enweta ihe ọma.+  Onye akaebe ụgha agaghị agbanahụ ntaramahụhụ,+ onye na-ekupụkwa okwu ụgha dị ka ume ga-ala n’iyi.+ 10  Ndụ ọgaranya ekwesịghị onye ọ bụla dị nzuzu,+ ma ya fọdụzie ohu ịchị ndị isi!+ 11  Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ,+ ileghara mmejọ anya bụkwaara ya ịma mma.+ 12  Ọnụma eze bụ mbigbọ yiri nke nwa ọdụm tojuru etoju,+ ma amara ya na-adị ka igirigi nke dara n’elu ahịhịa ndụ.+ 13  Nwa nzuzu bụụrụ nna ya nhụjuanya,+ iseokwu nwunye dịkwa ka elu ụlọ na-ehi mmiri, nke na-achụpụ mmadụ n’ụlọ.+ 14  Ihe nketa nke na-esi n’aka nna bụ ụlọ na akụ̀,+ ma nwaanyị nke nwere uche na-esi n’aka Jehova.+ 15  Umengwụ na-eme ka oké ụra buru mmadụ,+ mkpụrụ obi nke dị umengwụ na-anọkwa agụụ.+ 16  Onye na-edebe ihe e nyere n’iwu na-edebe mkpụrụ obi ya;+ a ga-egbu onye na-eleghara ụzọ ya anya.+ 17  Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe,+ Ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.+ 18  Nye nwa gị ntaramahụhụ mgbe olileanya ka dị;+ ekwekwala ka igbu ya gụọ mkpụrụ obi gị agụụ.+ 19  Onye oké ọnụma ka a ga na-eri iwu;+ n’ihi na ọ bụrụ na ị gbapụta ya, ị ga na-eme ya ugboro ugboro.+ 20  Nụrụ ndụmọdụ, narakwa ịdọ aka ná ntị,+ ka i wee mara ihe n’ọdịnihu gị.+ 21  Atụmatụ ndị dị n’obi mmadụ dị ọtụtụ,+ ma, ọ bụ nzube Jehova ga-eguzosi ike.+ 22  Ihe a na-achọsi ike n’ime mmadụ bụ obiọma* ya;+ onye dara ogbenye kakwa onye ụgha mma.+ 23  Ịtụ egwu Jehova na-eduba ná ndụ,+ mmadụ ga-enwekwa afọ ojuju mgbe ọ na-arahụ ụra abalị;+ ihe ọjọọ agaghị abịara ya.+ 24  Onye umengwụ amanyewo aka ya n’ime efere nri;+ ọ pụghị iweghachite ya ọbụna n’ọnụ ya.+ 25  I kwesịrị iti onye na-akwa emo ihe,+ ka onye na-amaghị ihe wee mara ihe;+ e kwesịkwara ịbara onye na-aghọta ihe mba, ka o wee nweta ihe ọmụma.+ 26  Onye na-emegbu nna ya, nke na-achụpụkwa nne ya,+ bụ nwa nke na-emenye mmadụ ihere, na-emechukwa mmadụ ihu.+ 27  Nwa m, ọ bụrụ na ị kwụsị ịnụrụ ịdọ aka ná ntị, ọ ga-abụ isi n’okwu nwere ihe ọmụma kpafuo.+ 28  Onye akaebe nke na-abaghị n’ihe na-akwa ikpe ziri ezi emo,+ ọnụ ndị ajọ omume na-elodakwa ihe ọjọọ.+ 29  A ghaghị ikpe ndị na-akwa emo ikpe,+ ụtarị bụkwa maka azụ ndị nzuzu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ilu 19:22*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”