Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ilu 1:1-33

1  Ilu+ Sọlọmọn+ nwa Devid,+ bụ́ eze Izrel,+  ka mmadụ wee bụrụ onye a kụziiri amamihe+ na ịdọ aka ná ntị,+ iji ghọta okwu nghọta+ dị na ya,  iji nata ịdọ aka ná ntị+ nke na-enye nghọta,+ ezi omume+ na ikpe ziri ezi+ na ịkwụwa aka ọtọ,+  iji mee ka ndị na-enweghị amamihe nwee amamihe,+ meekwa ka nwa okorobịa nwee ihe ọmụma+ na ikike iche echiche.+  Onye maara ihe ga-ege ntị ma nwetakwuo ntụziaka,+ ọ bụkwa onye nwere nghọta na-enweta ezi ntụziaka,+  iji ghọta ilu na okwu dị mgbagwoju anya,+ okwu ndị maara ihe+ na okwu ilu ha.+  Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite ihe ọmụma.+ Ọ bụ amamihe na ịdọ aka ná ntị ka ndị nzuzu leghaara anya.+  Nwa m, ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị nna gị,+ ahapụkwala iwu nne gị.+  N’ihi na ha bụụrụ isi gị okpu mara mma e ji okooko kpaa,+ bụkwaara olu gị ihe olu mara mma.+ 10  Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie anwaa ịrata gị, ekwela.+ 11  Ọ bụrụ na ha ana-asị: “Soro anyị gaa. Ka anyị gaa zoo wee wụfuo ọbara.+ Ka anyị gaa zoo chebiri ndị aka ha dị ọcha, n’enweghị ihe kpatara ya.+ 12  Ka anyị loo ha ná ndụ+ dị ka Shiol,+ ọbụna ha dum, dị ka ndị na-agbadaru n’olulu.+ 13  Ka anyị chọọ ụdị ihe ọ bụla dị oké ọnụ ahịa.+ Ka anyị kpojuo ihe a kwatara akwata n’ụlọ anyị.+ 14  I kwesịrị ịbịa ka anyị na gị gbakọta aka. Ka ọ bụrụ naanị otu akpa ka anyị niile ga-enwe”+ 15  nwa m, esola ha gaa n’ụzọ ahụ.+ Gbochie ụkwụ gị ịga n’okporo ụzọ ha.+ 16  N’ihi na ụkwụ ha na-agbaga naanị n’ihe ọjọọ,+ ọ na-adịkwa ha ngwa ngwa ịwụfu ọbara.+ 17  N’ihi na ọ bụ n’efu ka a na-agbasa ụgbụ n’ihu ihe ọ bụla nwere nku.+ 18  Ọ bụ ya mere ha ji ezo ka ha wụfuo ọbara ihe ndị a;+ ha na-ezo chebiri mkpụrụ obi ihe ndị a.+ 19  Otú ahụ ka ụzọ onye ọ bụla nke na-eri uru na-ezighị ezi dị.+ Ọ na-anapụ ndị nwe ya mkpụrụ obi ha.+ 20  Ezi amamihe+ na-etisi mkpu ike n’okporo ámá.+ N’ámá ka ọ na-eti mkpu.+ 21  Ná mgbago mgbago ebe a na-eme ụzụ n’okporo ámá ka ọ na-akpọ òkù.+ N’ọnụ ụzọ ámá ndị e si abanye n’obodo ka ọ na-ekwu okwu ya,+ sị: 22  “Ruo ole mgbe ka unu ndị na-amaghị ihe ga na-ahụ amaghị ihe n’anya,+ ruokwa ole mgbe ka ihe doro anya na ọ bụ ịkwa emo ga na-agụ unu ndị na-akwa emo agụụ,+ ruokwa ole mgbe ka unu ndị nzuzu ga na-akpọ ihe ọmụma asị?+ 23  Lọghachinụ n’ihi ịdọ aka ná ntị m.+ Mgbe ahụ, m ga-eme ka mmụọ m baara unu ụba;+ m ga-eme ka unu mara okwu m.+ 24  N’ihi na akpọwo m òkù ma unu na-ajụ,+ esetịwo m aka ma ọ dịghị onye na-aṅa ntị,+ 25  unu na-elegharakwa ndụmọdụ m niile anya,+ unu anabataghịkwa ịdọ aka ná ntị m,+ 26  mụ onwe m ga-achịkwa ọchị n’ihi ọdachi nke ga-adakwasị unu,+ m ga-akwa unu emo mgbe ihe unu na-atụ ụjọ ga-abịa,+ 27  mgbe ihe unu na-atụ ụjọ ga-abịa dị ka oké ifufe mmiri, ọdachi unu abịarutekwa dị ka ifufe oké mmiri ozuzo,+ mgbe ahụhụ na oge ihe isi ike ga-abịakwasị unu.+ 28  Mgbe ahụ, ha ga na-akpọ m, ma agaghị m aza;+ ha ga na-achọ m, ma ha agaghị achọta m,+ 29  n’ihi na ha kpọrọ ihe ọmụma asị,+ ha ahọrọghịkwa egwu Jehova.+ 30  Ha anabataghị ndụmọdụ m;+ ha lelịrị ịdọ aka ná ntị m niile.+ 31  N’ihi ya, ha ga-eri mkpụrụ nke ụzọ ha mịpụtara,+ atụmatụ+ nke aka ha ga-ejukwa ha afọ. 32  N’ihi na ọ bụ nnupụisi+ nke ndị na-amaghị ihe ga-egbu ha,+ ọ bụkwa ejighị ihe kpọrọ ihe nke ndị nzuzu ga-ala ha n’iyi.+ 33  Ma onye na-ege m ntị ga-ebi n’obi iru ala,+ ụjọ ọdachi agaghịkwa enye ya nsogbu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji