Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Hosia 8:1-14

8  “Tinye opi n’ọnụ gị!+ E nwere onye na-abịa dị ka ugo+ imegide ụlọ Jehova, n’ihi na ha emebiwo ọgbụgba ndụ m,+ ọ bụkwa iwu m ka ha mebiri.+  Ha na-etiku m, sị, ‘Chineke m, anyị bụ́ Izrel maara gị.’+  “Izrel ajụwo ihe ọma.+ Ka onye iro chụọ ya ọsọ.+  Ha emewo ndị mmadụ eze,+ ma ọ bụghị site n’aka m. Ha emewo ndị mmadụ ndị isi, ma amaghị m banyere ya. Ha ejiriwo ọlaọcha ha na ọlaedo ha meere onwe ha arụsị,+ ka e wee bipụ ha.+  Sameria, a jụwo nwa ehi gị.+ M na-eweso ha iwe dị ọkụ.+ Ruo ole mgbe ka ha na-enweghị ike ịbụ ndị aka ha dị ọcha?+  N’ihi na ọ bụ Izrel mere ihe a.+ Ọ bụ omenkà mere ya,+ ọ bụghị Chineke; n’ihi na a ga-akụri nwa ehi Sameria.+  “N’ihi na ọ bụ ifufe ka ha na-agha dị ka mkpụrụ, ọ bụkwa oké ifufe mmiri ka ha ga-aghọrọ.+ Ọ dịghị ebe e nwere ọka* kwụ ọtọ.+ Ọ dịghị ome nke mepụtara ntụ ọka.+ Ọ bụrụ na e nwee nke mepụtara ihe, ndị ala ọzọ ga-eloda ya.+  “A ga-eloda Izrel.+ Ugbu a, ha ga-adị ka arịa na-adịghị enye obi ụtọ+ n’etiti mba dị iche iche.+  N’ihi na ha onwe ha agbagowo Asiria,+ dị ka ịnyịnya ọhịa nke nọ naanị ya.+ Ma Ifrem egowo ndị hụrụ ya n’anya.+ 10  Ọzọ, ọ bụ ezie na ha na-ego ha ná mba dị iche iche,+ m ga-achịkọta ha ọnụ ugbu a; ha ga-anọtụ n’oké ihe mgbu+ n’ihi ibu arọ eze na ndị isi boro ha. 11  “N’ihi na Ifrem arụwo ọtụtụ ebe ịchụàjà iji mehie.+ O nwewo ebe ịchụàjà dị iche iche iji mehie.+ 12  M wee deere ha ọtụtụ ihe dị n’iwu m;+ ha weere ya dị ka ihe na-agbasaghị ha.+ 13  Ha na-achụrụ m anụ n’àjà dị ka onyinye,+ ha na-erikwa ihe Jehova na-enweghị obi ụtọ na ya.+ Ugbu a, ọ ga-echeta njehie ha, meekwa ka ha zaa ajụjụ maka mmehie ha.+ Ha laghachiri n’Ijipt.+ 14  Izrel wee chefuo Onye kere ya,+ ọ na-ewukwa ụlọ nsọ dị iche iche;+ Juda wukwara ọtụtụ obodo siri ike.+ M ga-eziga ọkụ n’obodo ya niile, ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile dị na nke ọ bụla n’ime ha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.