Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Hosia 2:1-23

2  “Sịnụ ụmụnne unu ndị ikom, ‘Unu bụ ndị m!’+ sịkwanụ ụmụnne unu ndị inyom, ‘Unu bụ ndị inyom e meere ebere!’+  Kpeenụ nne unu ikpe;+ kpeenụ ya ikpe n’ihi na ọ bụghị nwunye m,+ abụghịkwa m di ya.+ O kwesịrị iwepụ ịkwa iko ya n’ihu ya, wepụkwa ịkwa iko ya n’agbata ara ya abụọ,+  ka m ghara ịgba ya ọtọ+ wee mee ka ọ dịrị otú ọ dị n’ụbọchị a mụrụ ya,+ meekwa ka ọ dị ka ala ịkpa,+ meekwa ka ọ dị ka ala mmiri na-adịghị,+ meekwa ka agụụ mmiri gụgbuo ya.+  Agaghị m emere ụmụ ya ebere,+ n’ihi na ha bụ ụmụ a kwatara n’iko.+  N’ihi na nne ha kwara iko.+ Onye buru ha n’afọ mere omume ihere,+ n’ihi na ọ sịrị, ‘Achọrọ m ịgakwuru ndị mụ na ha na-eme enyi,+ ndị na-enye m nri m na-eri na mmiri m na-aṅụ, ajị anụ m na ákwà linin m, mmanụ m na ihe ọṅụṅụ m.’+  “Ya mere, m ga-eji ogwu gbaa ụzọ gị ogige; m ga-ejikwa nkume wuchibido ya mgbidi,+ ka ọ ghara ịchọta okporo ụzọ ya.+  Ọ ga-achụwa ndị ya na ha na-eme enyi, ma ọ gaghị achụkwute ha;+ ọ ga-achọ ha, ma ọ gaghị achọta ha. Ọ ga-asịkwa, ‘Achọrọ m ịlaghachikwuru di m,+ di m nke mbụ,+ n’ihi na ihe dịịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’+  Ma ọ mataghị+ na ọ bụ m nyere ya nri+ na mmanya dị ụtọ na mmanụ, nakwa na ọ bụ m mere ka o nwejuo ọlaọcha na ọlaedo enweju, bụ́ ndị ha ji fee Bel.+  “‘N’ihi ya, m ga-atụgharị wepụ nri m na-enye ya n’oge ya, wepụkwa mmanya m dị ụtọ n’oge ya,+ m ga-anapụkwa ya ajị anụ m na ákwà linin m o ji kpuchie ọtọ ya.+ 10  Ugbu a, m ga-ekpughe ihe o ji bụrụ nwaanyị n’ihu ndị ya na ha na-eme enyi,+ ọ dịghịkwa onye ga-anapụta ya n’aka m.+ 11  M ga-emekwa ka ịṅụrị ọṅụ ya niile,+ ememme ya,+ ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ ya+ na ụbọchị izu ike ya na oge ememme ya niile kwụsị. 12  M ga-eme ka osisi vaịn ya+ na osisi fig ya+ tọgbọrọ n’efu, bụ́ ndị o kwuru banyere ha, sị: “Ha bụ onyinye ndị mụ na ha na-eme enyi nyere m”; m ga-emekwa ka ha dị ka oké ọhịa,+ anụ ọhịa ga-erichapụ ha. 13  M ga-eme ka ọ zaa ajụjụ+ maka ụbọchị niile ọ nọ na-esurere ihe oyiyi Bel+ ihe nsure ọkụ,+ mgbe o ji ọla ntị ya na ihe ịchọ mma ya na-achọ onwe ya mma,+ na-agakwurukwa ndị ya na ha na-eme enyi,+ ma, ọ bụ m ka o chefuru,’+ ka Jehova kwuru. 14  “‘Ya mere, lee, m gaje ime ka o kweta, m ga-emekwa ka ọ gaa n’ala ịkpa,+ m ga-agwa ya okwu ga-eru ya n’obi.+ 15  M ga-enye ya ubi vaịn ya malite mgbe ahụ gaa n’ihu,+ nyekwa ya ndagwurugwu Ekọ+ ka ọ bụrụ ọnụ ụzọ olileanya; ọ ga-aza òkù n’ebe ahụ dị ka ọ zara n’oge ọ bụ agbọghọ+ nakwa n’ụbọchị o si n’ala Ijipt pụta.+ 16  Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ,’ ka Jehova kwuru, ‘na ị ga-akpọ m Di m, ị gakwaghị akpọ m Onyenwe m.’+ 17  “‘M ga-ewepụ aha niile nke ihe oyiyi Bel n’ọnụ ya,+ a gakwaghị echeta aha ha.+ 18  Mụ na anụ ọhịa+ na anụ ufe nke eluigwe na ihe na-akpụ akpụ n’ala ga-agba ndụ n’ụbọchị ahụ n’ihi ha, m ga-emekwa ka ụta na mma agha na agha ghara ịdịkwa n’ala ha,+ m ga-emekwa ka ha dinara ala n’obi iru ala.+ 19  M ga-ekwe nkwa ịlụ gị ruo mgbe a na-akaghị aka,+ m ga-ekwe nkwa ịlụ gị n’ezi omume na n’ikpe ziri ezi na n’obiọma* nakwa n’ebere.+ 20  M ga-ekwe nkwa ịlụ gị n’ikwesị ntụkwasị obi; ị ga-amarakwa Jehova.’+ 21  “‘Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na m ga-aza òkù,’ ka Jehova kwuru, ‘m ga-aza eluigwe òkù, eluigwe ga-aza ala òkù;+ 22  ala ga-aza nri+ na mmanya dị ụtọ na mmanụ òkù; ha onwe ha ga-aza Jezril* òkù.+ 23  M ga-aghara ya onwe m n’ala dị ka mkpụrụ,+ m ga-emekwara onye ahụ ebere bụ́ onye a na-emereghị ebere,+ m ga-agwa ndị na-abụghị ndị m: “Unu bụ ndị m”;+ ha onwe ha ga-asịkwa: “Ị bụ Chineke m.”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”
Nke pụtara, “Chineke ga-agha mkpụrụ.”