Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezra 1:1-11

1  N’afọ mbụ nke ọchịchị Saịrọs+ eze Peshia, ka ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Jeremaya+ wee mezuo, Jehova kpaliri+ mmụọ Saịrọs eze Peshia, o wee mee ka a kpọsaa+ n’ebe dum ọ na-achị, deekwa ya n’akwụkwọ,+ sị:  “Nke a bụ ihe Saịrọs eze Peshia kwuru,+ ‘Jehova bụ́ Chineke nke eluigwe+ enyewo m alaeze niile nke ụwa,+ ya onwe ya enyewokwa m ọrụ iwuru ya ụlọ na Jeruselem,+ nke dị na Juda.  Onye ọ bụla n’ime unu, n’etiti ndị ya niile, ka Chineke ya nọnyere ya.+ Ya lawa Jeruselem, nke dị na Juda, ma wughachi ụlọ Jehova bụ́ Chineke Izrel—ọ bụ ya bụ ezi Chineke+—bụ́ ụlọ dị na Jeruselem.+  Ma onye ọ bụla nke fọdụrụ n’ebe ọ bụla o bi dị ka ọbịa,+ ka ndị obodo ya nye ya ọlaọcha na ọlaedo na ngwongwo ndị ọzọ na anụ ụlọ, tinyere onyinye afọ ofufo+ maka ụlọ ezi Chineke, nke dị na Jeruselem.’”  Ndị isi+ nke ndị bụ́ nna ndị Juda na nke ndị Benjamin, tinyere ndị nchụàjà na ndị Livaị, wee bilie, ya bụ, ndị niile mmụọ+ nke ezi Chineke kpaliri, ka ha lawa gaa wughachi ụlọ Jehova,+ nke dị na Jeruselem.  Ma ndị niile gbara ha gburugburu ji arịa ọlaọcha, tinyere ọlaedo, na ngwongwo ndị ọzọ, na anụ ụlọ na ihe ndị dị oké ọnụ ahịa kwado+ ha, ma e wezụga ihe niile e nyere n’afọ ofufo.+  Eze Saịrọs jikwa aka ya chịta arịa ụlọ Jehova,+ bụ́ ndị Nebukadneza chịpụtara na Jeruselem+ wee debe ha n’ụlọ chi ya.+  Saịrọs eze Peshia wee mee ka Mitridat onye na-echekwa akụ̀ na-elekọta ha, o wee gụọ ha ọnụ ma nyefee ha Sheshbaza+ onyeisi Juda.+  Ha dị: arịa ọlaedo iri atọ ndị yiri nkata, otu puku arịa ọlaọcha ndị yiri nkata, arịa iri abụọ na itoolu e ji edochi arịa ndị ọzọ, 10  obere ọkwá+ ọlaedo iri atọ, narị obere ọkwá ọlaọcha anọ na iri, na otu puku arịa ndị ọzọ. 11  Arịa ọlaedo na arịa ọlaọcha niile dị puku ise na narị anọ. Sheshbaza+ bugotere ihe niile, o sikwa Babịlọn kpọpụta ndị a dọọrọ n’agha+ kpọta ha Jeruselem.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji