Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 7:1-27

7  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara ala Izrel, ‘Ọgwụgwụ, nsọtụ anọ nke ala a eruwo ọgwụgwụ ya.+  Ọgwụgwụ gị eruwo,+ m ga-emekwa ka iwe m bịakwasị gị, m ga-ekpekwa gị ikpe dị ka ụzọ gị niile si dị+ ma mee ka ihe arụ gị niile bịakwasị gị.  Anya m agaghị emere gị ebere,+ agaghịkwa m enwe ọmịiko, n’ihi na m ga-emeso gị dị ka ụzọ gị niile si dị, ihe arụ gị ga-adị n’etiti gị;+ unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’+  “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ọdachi, lee! ọdachi pụrụ iche na-abịa.+  Ọgwụgwụ ga-abịa.+ Ọgwụgwụ ga-abịa; ọ ga-abịakwasị gị na mberede. Lee! Ọ na-abịa.+  Ọdachi ga-adakwasị gị, gị onye bi n’ala a, oge ya na-abịa, ụbọchị ya dị nso.+ E nwere ọgba aghara, ọ bụghị mkpu a na-eti n’ugwu.  “‘N’oge na-adịghị anya, m ga-awụkwasị gị ọnụma m,+ m ga-ewesa gị iwe m dum,+ m ga-ekpekwa gị ikpe dị ka ụzọ gị niile si dị+ ma mee ka ihe arụ gị niile bịakwasị gị.  Anya m agaghị eme ebere,+ agaghịkwa m enwe ọmịiko.+ Ọ bụ dị ka ụzọ gị niile si dị ka m ga-emeso gị, ihe arụ gị ga-adịkwa kpọmkwem n’etiti gị;+ unu ga-amarakwa na ọ bụ mụ onwe m, Jehova, na-eti unu ihe otiti.+ 10  “‘Lee! Ụbọchị ahụ! Lee! Ọ na-abịa.+ Ọdachi apụwo.+ Mkpanaka awawo okooko.+ Mpako epuwo ome.+ 11  Ime ihe ike ebiliwo ghọọ mkpanaka ajọ omume.+ Ha, ma ọ bụ akụ̀ ha, ma ọ bụ ha onwe ha n’otu n’otu, agaghị azọpụta ha, ha abaghị uru ọ bụla. 12  Oge ga-eru, ụbọchị ga-abịa. Ka onye na-azụ ihe ghara ịṅụrị ọṅụ;+ ka onye na-ere ihe ghara iruwe uju, n’ihi na m na-eweso ìgwè ndị ya niile iwe ọkụ. 13  N’ihi na onye rere ihe agaghị enwetaghachi ihe o rere, mgbe ha ka nọ ndụ; n’ihi na ọhụụ ahụ bụ maka ìgwè ndị ya niile. Ọ dịghị onye ga-alọghachi, ọ dịghịkwa onye ọ bụla nke ga-eji ndụ ya n’aka n’ihi mmehie nke ya onwe ya mere. 14  “‘Ha afụwo opi,+ mmadụ niile ejikerewokwa, ma ọ dịghị onye na-aga agha, n’ihi na m na-eweso ìgwè ndị ya niile iwe m dị ọkụ.+ 15  Mma agha dị n’èzí,+ e nwere ọrịa na-efe efe na ụnwụ n’ime ụlọ.+ A ga-eji mma agha gbuo onye ọ bụla nọ n’ubi, ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịakwa ndị nọ n’ime obodo.+ 16  Ndị ha gbapụrụ agbapụ ga-alanahụ+ wee dịrị ka nduru nke ndagwurugwu n’elu ugwu.+ Ha niile na-akwakwa ákwá, onye nke ọ bụla n’ihi njehie nke ya. 17  Aka niile ga na-akụda;+ ikpere niile ga na-agụsịkwa mmiri.+ 18  Ha ekewokwa ákwà iru uju+ n’úkwù, ịma jijiji ekpuchiwokwa ha;+ ihere dịkwa n’ihu niile,+ isi akwọchaala ha niile.+ 19  “‘N’okporo ámá ka ha ga-atụfu ọlaọcha ha, ihe na-asọ oyi ka ọlaedo ha ga-aghọkwa. Ma ọlaọcha ha ma ọlaedo ha agaghị anapụtali ha n’ụbọchị oké iwe Jehova.+ Ha agaghị eme ka afọ ju mkpụrụ obi ha, ha agaghịkwa enyeju onwe ha afọ, n’ihi na ọ ghọwo ihe ịsụ ngọngọ nke na-eme ka ha jehie.+ 20  Mmadụ emewo ka ịma mma nke ihe ịchọ mma bụrụ ihe o ji anya isi; ha ejiriwokwa ya mee ihe oyiyi ha ndị jọgburu onwe ha,+ ihe arụ ha.+ Ọ bụ ya mere m ga-eji mee ka ọ ghọọrọ ha ihe na-asọ oyi.+ 21  M ga-enyefe ya n’aka ndị ala ọzọ ka ha bukọrọ ya, nyefeekwa ya n’aka ndị ajọ omume nke ụwa ka ha buru ya,+ ha ga-emetọkwa ya. 22  “‘M ga-ewepụ ihu m n’ebe ha nọ,+ ha ga-emerụkwa ebe m nke zoro ezo. Ndị na-apụnara mmadụ ihe ga-abatakwa n’ime ya metọọ ya.+ 23  “‘Mee agbụ ígwè,+ n’ihi na ala a ejupụtawo n’ikpe mwụfu ọbara,+ obodo a ejupụtawokwa n’ime ihe ike.+ 24  M ga-akpọbata ndị kasị njọ n’etiti mba niile,+ ha ga-ebichi n’ụlọ ha,+ m ga-emekwa ka nganga ndị dị ike kwụsị,+ a ga-emerụkwa ebe nsọ ha.+ 25  Nhụjuanya ga-abịa, ha ga-achọkwa udo ma ọ gaghị adị.+ 26  Ahụhụ ga-esochi ahụhụ,+ akụkọ ga-esochikwa akụkọ, ndị mmadụ ga-achọ ọhụụ n’ọnụ onye amụma,+ iwu ga-akọ ụkọ n’ọnụ onye nchụàjà, ndụmọdụ ga-akọkwa ụkọ n’ọnụ ndị okenye.+ 27  Eze ga na-erukwa uju;+ ọbụna onyeisi ga-eyiri ntọgbọrọ n’efu dị ka uwe,+ aka ndị ala a ga-ama jijiji. Ọ bụ dị ka ụzọ ha niile si dị ka m ga-emeso ha,+ m ga-ejikwa ikpe ha kpere kpee ha ikpe;+ ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji