Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 6:1-14

6  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, chee ihu n’ugwu niile dị n’Izrel+ ma buoro ha amụma.+  Sị ha, ‘Ugwu niile dị n’Izrel, nụrụnụ okwu Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova:+ Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara ugwu ukwu na ugwu nta+ na ọwa mmiri niile na ndagwurugwu niile, sị: “Lee! M ga-eme ka mma agha bịakwasị unu, m ga-ebibikwa ebe ndị dị elu unu.+  A ga-emekwa ka ebe ịchụàjà unu tọgbọrọ n’efu,+ gbajisịakwa ihe unu ji adọba ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. M ga-emekwa ka ndị unu e gburu egbu daa n’ihu arụsị unu ndị na-asọ oyi ka nsị.+  M ga-atọgbọ ozu ụmụ Izrel n’ihu arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị, m ga-atụsasịkwa ọkpụkpụ unu gburugburu ebe ịchụàjà unu.+  Obodo niile, ndị bụ́ ebe unu bi,+ ga-abụ ndị a lara n’iyi,+ ebe ndị dị elu ga-atọgbọrọkwa n’efu, ka ha wee bụrụ ebe a lara n’iyi,+ ebe ịchụàjà unu abụrụkwa ebe tọgbọrọ n’efu na ebe a kụrisịrị akụrisị.+ A ga-ebibi arụsị unu ndị na-asọ oyi ka nsị,+ gbajisịakwa ihe unu ji adọba ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ,+ kpochapụkwa ọrụ unu.  Ndị e gburu egbu ga-adakwa n’etiti unu,+ unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.+  “‘“Mgbe o mere, m ga-eme ka unu nwee ndị ga-afọdụ, bụ́ ndị gbanahụrụ mma agha, n’etiti mba niile, mgbe a ga-achụsasị unu n’ala dị iche iche.+  Ndị unu lanahụrụ alanahụ ga-echeta m n’etiti mba niile a dọọrọ ha n’agha laa,+ n’ihi na obi ha nke na-akwa iko, nke gbakụtara m azụ,+ nakwa anya ha nke na-eso arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị ka ha na ha wee kwaa iko,+ emewo ka m nwee oké mwute; ihu ha ga-egosi na ihere onwe ha na-eme ha n’ihi ihe ọjọọ ha meworo n’ihe arụ ha niile.+ 10  Ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova; ọ bụghị n’efu ka m kwuru+ na m ga-eme ka ọdachi a dakwasị ha.”’+ 11  “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Kụọ aka+ ma zọsie ụkwụ ike n’ala, sịkwa: “Ewoo!” n’ihi ajọ ihe arụ niile nke ụlọ Izrel,+ n’ihi na ọ bụ mma agha,+ ụnwụ+ na ọrịa na-efe efe ka a ga-eji gbuo ha.+ 12  Ọrịa na-efe efe ga-egbu onye nọ n’ebe dị anya;+ a ga-eji mma agha gbuo onye nọ nso; ụnwụ ga-egbu onye fọdụrụnụ nke e chebere, m ga-awụkwasịkwa ha ọnụma m dum.+ 13  Unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova,+ mgbe ndị ha e gburu egbu ga-atọgbọrọ n’etiti arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị,+ gburugburu ebe ịchụàjà ha,+ n’elu ugwu ọ bụla dị elu,+ n’elu ugwu ukwu niile+ nakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ+ nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla nwere alaka,+ ebe ha nọ sureere arụsị ha niile ndị na-asọ oyi ka nsị ihe na-esi ísì ụtọ.+ 14  M ga-esetịkwa aka m mee ha ihe,+ meekwa ka ala ha, bụ́ ebe niile ha bi, bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu, bụ́ ntọgbọrọ n’efu ga-adị njọ karịa ala ịkpa nke dị n’ụzọ Dibla. Ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji