Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 44:1-31

44  O wee si n’ọnụ ụzọ ámá nke ebe nsọ ahụ kpọghachi m, bụ́ ọnụ ụzọ ámá nke dị ná mpụta, nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ,+ e mechikwara ya emechi.+  Jehova wee sị m: “Ọnụ ụzọ ámá a ga-emechi emechi mgbe niile. A gaghị emeghe ya emeghe, ọ dịghịkwa mmadụ ọ bụla ga-esi na ya bata; n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke Izrel,+ esiwo na ya bata, ọ ga-emechi emechi mgbe niile.  Otú ọ dị, onyeisi+ ga-anọdụ ọdụ n’ime ya dị ka onyeisi, ka o wee rie achịcha n’ihu Jehova.+ Ọ ga-esi n’ụzọ e si aga n’ihe owuwu ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ámá bata, ọ bụkwa n’ụzọ ahụ ka ọ ga-esi pụọ.”+  O wee si n’ọnụ ụzọ ámá dị n’ebe ugwu kpọta m n’ihu Ụlọ ahụ, ka m wee hụ, ma, lee! ebube Jehova jupụtara n’ụlọ Jehova.+ M wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala.+  Jehova wee sị m: “Nwa nke mmadụ, chebara ihe a echiche,+ jiri anya gị hụrụ, jirikwa ntị gị nụrụ ihe niile m na-agwa gị banyere ụkpụrụ niile nke ụlọ Jehova na iwu niile na-achị ya, chebarakwa ọnụ ụzọ e si abanye n’Ụlọ a echiche, tinyere ọnụ ụzọ niile e si apụ n’ebe nsọ.  Gwakwa Nnupụisi,+ ya bụ, ụlọ Izrel, sị, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “O zuworo unu, unu ụlọ Izrel. Ihe arụ niile unu na-eme akarịwo,+  mgbe unu kpọbatara ndị mba ọzọ a na-ebighị úgwù n’obi, ndị a na-ebighịkwa úgwù n’anụ ahụ́,+ ka ha nọrọ n’ebe nsọ m, bụ́ ụlọ m, iji merụọ ya; mgbe unu chụrụ nri m n’àjà,+ ya bụ, abụba+ na ọbara,+ ma ha nọ na-emebi ọgbụgba ndụ m n’ihi ihe arụ niile unu na-eme.+  Unu arụghịkwa ọrụ unu kwesịrị ịrụ n’ihe nsọ m,+ unu ahọpụtaghịkwa ndị ọzọ ka ha bụụrụ unu ndị na-elekọta ọrụ e kwesịrị ịrụrụ m n’ebe nsọ m.”’+  “‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ọ dịghị onye mba ọzọ a na-ebighị úgwù n’obi, onye a na-ebighịkwa úgwù n’anụ ahụ́, nke ga-abata n’ebe nsọ m, ya bụ, onye mba ọzọ ọ bụla nọ n’etiti ụmụ Izrel.”’+ 10  “‘Ma ndị Livaị ga-eji isi ha buru njehie ha.+ Ọ bụ ha hapụrụ m+ gaa n’ebe dị anya mgbe Izrel, ndị si n’ebe m nọ kpafuo, nọ na-eso arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị. 11  Ha ga-abụ ndị na-eje ozi n’ebe nsọ m dị ka ndị na-elekọta ọnụ ụzọ ámá nke Ụlọ ahụ, bụrụkwa ndị na-eje ozi n’Ụlọ ahụ.+ Ọ bụ ha ga-egbu anụ a ga-eji chụọ àjà a na-esurecha n’ọkụ nakwa àjà a ga-achụ maka ndị ọzọ,+ ha ga-eguzo n’ihu ha na-ejere ha ozi.+ 12  Ha nọ na-ejere ha ozi n’ihu arụsị ha ndị na-asọ ka nsị+ wee ghọọrọ ụlọ Izrel ihe ịsụ ngọngọ nke na-eme ka ha jehie,+ ọ bụ ya mere m ji welie aka ime ha ihe,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. ‘Ha ga-eji isi ha buru njehie ha. 13  Ha agaghịkwa abịa n’ihu m ịbụrụ m ndị nchụàjà ma ọ bụ bịa nso n’ihe m ọ bụla dị nsọ, bụ́ ihe ndị kasị nsọ.+ Ihere ga-eme ha, ha ga-ejikwa isi ha buru ihe si n’ihe arụ ha niile pụta.+ 14  M ga-emekwa ka ha bụrụ ndị na-elekọta ọrụ e kwesịrị ịrụ n’Ụlọ m, n’ihe metụtara ozi niile a na-eje na ya nakwa ihe niile a ga-eme na ya.’+ 15  “‘Ndị nchụàjà bụ́ ụmụ Livaị,+ ụmụ Zedọk,+ ndị rụrụ ọrụ e kwesịrị ịrụ n’ebe nsọ m mgbe ụmụ Izrel si n’ebe m nọ kpafuo,+ ga-abịa n’ihu m jeere m ozi. Ha ga-eguzokwa n’ihu m+ na-eche abụba+ na ọbara+ n’ihu m,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. 16  ‘Ọ bụ ha ga na-abata n’ebe nsọ m,+ ọ bụkwa ha ga-abịa n’ebe tebụl mụ dị na-ejere m ozi.+ Ha ga na-arụkwa ọrụ e kwesịrị ịrụrụ m.+ 17  “‘Ọ ga-erukwa na mgbe ha na-abanye n’ọnụ ụzọ ámá nke ogige dị n’ime, ha ga-eyi ákwà linin. Ha agaghịkwa eyi ákwà ajị anụ mgbe ha na-eje ozi n’ọnụ ụzọ ámá nke ogige dị n’ime nakwa n’ime ime.+ 18  Ọ bụ ákwà isi e ji linin mee ka ha ga-eke n’isi,+ ha ga-eyi uwe úkwù e ji linin mee.+ Ha agaghị eyi ihe ọ bụla ga-eme ka ọsụsọ gbaa ha. 19  Mgbe ha chọrọ ịga n’ogige dị ná mpụta, bụ́ ogige dị ná mpụta ebe ndị ọzọ nọ, ha ga-eyipụ uwe ha na-eyi eje ozi,+ ha ga-edebekwa ha n’ụlọ dị nsọ ndị a na-anọ eri ihe+ ma yiri uwe ọzọ, ka ha ghara iji uwe ha doo ndị mmadụ nsọ.+ 20  Ha agaghị akpụ isi ha,+ ha agaghịkwa ahapụ ntutu isi ha ka ọ wụsara awụsa. Ha aghaghị iji ihe chịkọta ntutu isi ha.+ 21  Ndị nchụàjà agaghị aṅụ mmanya ọ bụla mgbe ha batara n’ogige dị n’ime.+ 22  Ha agaghị alụ nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwaanyị a gbara alụkwaghịm,+ kama ọ bụ ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke a mụrụ n’ụlọ Izrel+ ma ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ nke bụbu nwunye onye nchụàjà ka ha ga-alụ.’ 23  “‘Ha ga-akụzikwara ndị m ihe dị iche n’ihe dị nsọ na ihe rụrụ arụ. Ha ga-emekwa ka ha mara ihe dị iche n’ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha.+ 24  Mgbe ọ bụla e nwere okwu ikpe, ha onwe ha ga-ekpe ya.+ Ha ga-ejikwa mkpebi ikpe m kpee ya.+ Ha ga-edebekwa iwu m na ụkpụrụ m niile banyere oge ememme m niile,+ ha ga-edokwa ụbọchị izu ike m nsọ.+ 25  Ọ gaghị abịa ozu mmadụ nso bụ́ nke ga-eme ka ọ ghara ịdị ọcha, kama ha nwere ike ime onwe ha ka ha ghara ịdị ọcha ma ọ bụrụ ozu nna ha ma ọ bụ nne ha ma ọ bụ nwa ha nwoke ma ọ bụ nwa ha nwaanyị ma ọ bụ nwanne ha nwoke ma ọ bụ nwanne ha nwaanyị nke na-alụbeghị di.+ 26  Mgbe e mesịrị ka ọ dị ọcha, a ga-agụpụrụ ya ụbọchị asaa.+ 27  Ụbọchị ọ ga-abata n’ebe nsọ ahụ, n’ogige dị n’ime, iji jee ozi n’ebe nsọ ahụ, ọ ga-achụ àjà mmehie ya,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. 28  “‘Ọ ga-aghọkwa ihe nketa ha: Abụ m ihe nketa ha.+ Unu enyekwala ha ihe onwunwe ọ bụla n’Izrel: Abụ m ihe onwunwe ha. 29  Àjà ọka* na àjà mmehie na àjà ikpe ọmụma, ọ bụ ha ga na-eri ha.+ Ihe ọ bụla a raara nye n’Izrel ga-aghọ nke ha.+ 30  Nke kasị mma n’ime mkpụrụ mbụ niile kara aka n’ime ihe niile na onyinye ọ bụla n’ime onyinye niile unu na-enye ga-abụ nke ndị nchụàjà;+ unu ga-enyekwa onye nchụàjà ntụ ọka nke si ná mkpụrụ mbụ unu,+ iji mee ka ngọzi dịkwasị ụlọ gị.+ 31  Ndị nchụàjà agaghị eri anụ nwụrụ anwụ ma ọ bụ anụ ufe ọ bụla ma ọ bụ anụ ọhịa a dọgburu adọgbu.’+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.