Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 38:1-23

38  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ,+ chee ihu n’ebe Gọg nke ala Megọg,+ bụ́ onyeisi Mishek+ na Tubal,+ nọ, buokwa amụma ihe a ga-eme ya.  Sị ya, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lee, m na-emegide gị, gị Gọg, bụ́ onyeisi nke Mishek na Tubal.  M ga-eme ka ị tụgharịa, tinyekwa nko n’agba gị+ wee dọrọ gị na ndị agha gị niile,+ ya bụ, ịnyịnya na ndị na-agba ịnyịnya, ha niile yi uwe mara mma,+ ìgwè mmadụ dị ukwuu, ndị ji ọta ukwu na ọta nta, ha niile bu mma agha;+  Peshia,+ Itiopia+ na Pọt+ sokwa ha, ha niile jicha ọta na okpu agha;  Goma+ na ìgwè ndị agha ya niile, ụlọ Togama,+ nke si n’ime ime ebe ugwu, na ìgwè ndị agha ya niile, ya bụ, ọtụtụ ndị gị na ha so.+  “‘“Jikere, kwadebekwa, gị na ndị niile so gị,+ ndị gbakọrọ n’akụkụ gị, ị ga-abụkwa onye nche ha.  “‘“Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, a ga-elebara gị anya. Mgbe afọ ndị ahụ gwụchara, ị ga-abịa n’ala+ nke ndị a napụtara n’aka mma agha, ndị e si n’etiti ọtụtụ ndị kpọkọta+ n’ugwu ndị dị n’Izrel, nke bụ́ ebe a lara n’iyi mgbe niile; ya bụ, ala nke ndị bi ya bụ ndị e si n’etiti ndị dị iche iche kpọlata, ha wee biri n’obi iru ala, ha niile.+  Ị ga-agbagotekwa. Ị ga-abata dị ka oké ifufe mmiri.+ Ị ga-adị ka ígwé ojii nke ga-ekpuchi ala a,+ gị na ìgwè ndị agha gị niile na ọtụtụ ndị so gị.”’ 10  “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na ọtụtụ ihe ga-abata gị n’obi.+ Ị ga-eme atụmatụ ọjọọ.+ 11  Ị ga-asịkwa: “M ga-agbago buso obodo na-enweghị mgbidi agha.+ M ga-abịakwasị ndị na-enweghị nsogbu, bụ́ ndị bi n’obi iru ala, ha niile bi n’ebe na-enweghị mgbidi,+ ha enweghịdị ihe ntụchi ụzọ na ibo ụzọ.” 12  Ọ bụ ka ị kwakọrọ ihe buru ibu,+ bukọrọkwa ihe dị ukwuu, ka i welie aka gị megide ebe a lara n’iyi bụ́ ebe ndị mmadụ birighachiiri na ha,+ ka ị bịakwasịkwa ndị e si ná mba dị iche iche kpọkọta,+ bụ́ ndị na-akpakọba akụ̀ na ihe onwunwe,+ ndị bikwa n’etiti+ ụwa. 13  “‘Shiba+ na Didan+ na ndị ahịa Tashish+ na ụmụ ọdụm ya niile tojuru etoju+ ga-asị gị: “Ị̀ bịara ịkwakọrọ ihe dị ukwuu? Ị̀ kpọkọtara ndị gị ka unu bịa bukọrọ ihe dị ukwuu, ka unu buru ọlaọcha na ọlaedo, burukwa akụ̀ na ihe onwunwe, kwatakwa ihe dị ukwuu?”’ 14  “Ya mere, buo amụma, nwa nke mmadụ, sị Gọg, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ọ́ bụghị n’ụbọchị ndị m Izrel bi n’obi iru ala ka ị ga-amara ya?+ 15  Ị ga-esi n’ala gị bịa, site n’ime ime ebe ugwu,+ gị na ọtụtụ ndị so gị. Ha niile na-agba ịnyịnya. Ha bụ ìgwè mmadụ, ee, ọtụtụ ndị agha.+ 16  Ị ga-abịakwa ibuso ndị m Izrel agha, ka i kpuchie ala ha dị ka ígwé ojii.+ N’oge ikpeazụ ka ọ ga-eme. M ga-eme ka ị bịakwasị ala m,+ ka mba niile wee mara m mgbe m doro onwe m nsọ n’ebe ị nọ, n’ihu ha, gị Gọg.”’+ 17  “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ọ̀ bụ gị+ bụ onye ahụ m kwuru n’oge gara aga banyere ya site n’ọnụ ndị ohu m bụ́ ndị amụma Izrel, ndị buru amụma n’oge ahụ—ruo ọtụtụ afọ—na m ga-eme ka ị bịakwasị ha?’+ 18  “‘Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ, n’ụbọchị Gọg ga-abata n’ala Izrel,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘na ọnụma m ga-adị ọkụ nke ukwuu.*+ 19  M ga-eji ekworo m+ na iwe m dị ọkụ kwuo okwu.+ N’ezie, n’ụbọchị ahụ, oké ala ọma jijiji ga-eme n’ala Izrel.+ 20  Azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa na ihe niile na-akpụ akpụ n’ala na ihe niile a kpọrọ mmadụ, bụ́ ndị nọ n’elu ala, ga-ama jijiji n’ihi m.+ A ga-akwadakwa ugwu niile,+ ụzọ niile dị elu ga-ada, mgbidi niile ga-adarukwa ala.’ 21  “‘M ga-emekwa ka mma agha bịakwasị ya n’ógbè m niile bụ́ ugwu ugwu,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.+ ‘Mma agha onye nke ọ bụla ga-abịakwasị nwanne ya.+ 22  M ga-eji ọrịa na-efe efe+ na ọbara+ kpee ya ikpe.+ M ga-emekwa ka nnukwu mmiri na akụ́ mmiri ígwé,+ ọkụ na sọlfọ+ zokwasị ya na ìgwè ndị agha ya na ọtụtụ ndị ga-eso ya.+ 23  M ga-eme onwe m ka m dị ukwuu, dookwa onwe m nsọ,+ meekwa ka a mara m n’anya ọtụtụ mba; ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ezi 38:18*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “ọnụma m ga-eru m n’imi”