Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 31:1-18

31  O wee ruo n’afọ nke iri na otu, n’ọnwa nke atọ, n’abalị mbụ n’ọnwa ahụ, na okwu Jehova ruru m ntị, sị:  “Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị ya,+ sị, “‘Ị̀ dị ka ònye n’ịdị ukwuu gị?  Lee! Onye Asiria, bụ́ osisi sida nke dị na Lebanọn,+ nke alaka ya mara mma,+ nke akwụkwọ ya rujuru eruju ma na-enye ndò, o tokwara ogologo,+ elu ya wee ruo n’eluigwe.+  Ọ bụ mmiri mere ka ọ gbaa agba;+ ogbu mmiri mere ka o too ogologo. Mmiri na-asọ gburugburu ebe a kụrụ osisi ahụ; ọ na-emekwa ka ọwa mmiri ya ruo n’ebe osisi niile dị n’ọhịa dị.  Ọ bụ ya mere o ji too ogologo karịa osisi ndị ọzọ niile dị n’ọhịa.+ “‘O wee na-awa ọtụtụ alaka, ngalaba ya wee na-etowanye ogologo n’ihi mmiri dị ukwuu dị n’ọwa mmiri ya niile.+  Anụ ufe niile nke eluigwe kpara akwụ́ ha n’alaka ya,+ ọ bụkwa n’okpuru alaka ya ka anụ ọhịa niile na-amụ ụmụ.+ N’okpuru ndò ya ka mba niile ndị nwere ụba mmadụ na-ebi.  O wee maa mma n’ihi ịdị ukwuu ya,+ n’ihi otú alaka ya si dị ogologo, n’ihi na mgbọrọgwụ ya gafere ọtụtụ mmiri.  Sida ndị ọzọ ahaghị ka ya n’ubi Chineke.+ Osisi junipa enweghị alaka yiri nke ya. Alaka osisi plen adịghịkwa ka alaka ya. Ọ dịghị osisi ọzọ dị n’ubi Chineke nke yiri ya n’ịma mma.+  M mere ka ọ maa mma site n’ime ka o nwee ọtụtụ alaka,+ osisi ndị ọzọ niile dị n’Iden, bụ́ ubi nke ezi Chineke, nọ na-emere ya anyaụfụ.’+ 10  “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na o toro ogologo, elu ya wee ruo n’eluigwe,+ obi ya afụliekwa ya elu n’ihi ịdị elu ya,+ 11  m ga-enyefe ya n’aka onye ọchịchị dị ike nke na-achị mba dị iche iche.+ Ọ ghaghị ime ya ihe. M ga-achụpụ ya dị ka ajọ omume ya si dị.+ 12  Ndị mba ọzọ, bụ́ ndị ọchịchị aka ike nke mba dị iche iche, ga-egbutu ya. Ndị mmadụ ga-agbahapụkwa ya n’elu ugwu; alaka ya ga-adakwa na ndagwurugwu niile, a ga-agbajikwa alaka ya n’ọwa mmiri niile dị n’ụwa.+ Ndị niile nọ n’ụwa ga-esikwa na ndò ya gbadata wee gbahapụ ya.+ 13  N’elu ogwe ya dara ada ka anụ ufe niile nke eluigwe ga-ebi, anụ ọhịa niile ga-anọkwa n’elu alaka ya;+ 14  ka e wee ghara inwe nke ọ bụla n’ime osisi niile a na-agba mmiri nke ga-eto ogologo, ọ dịghịkwa nke elu ya ga-eru ọbụna n’eluigwe, ka e wee gharakwa inwe nke ọ bụla n’ime osisi na-aṅụ mmiri ga-ama ha aka n’ogologo, n’ihi na a ga-ewere ha niile nyefee ọnwụ,+ ha ewee banye n’ime ala,+ n’etiti ụmụ mmadụ, gakwuru ndị na-agbada n’olulu.’ 15  “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘N’ụbọchị ọ ga-agbada na Shiol, m ga-eme ka e ruo uju.+ M ga-ekpuchi ogbu mmiri n’ihi ya, ka m wee mee ka iyi ya kwụsị ịsọ asọ nakwa ka e gbochie ọtụtụ mmiri ya. M ga-emekwa ka Lebanọn gbaa ọchịchịrị n’ihi ya. Osisi niile dị n’ọhịa ga-akpọnwụkwa n’ihi ya. 16  Mgbe a nụrụ ụda ọdịda ya, m ga-eme ka mba niile maa jijiji mgbe m ga-eme ka ọ gbadaa Shiol, ya na ndị na-agbada n’olulu.+ N’ime ala ka a ga-akasi ha obi,+ ya bụ, osisi niile nke Iden,+ ezigbo osisi Lebanọn ndị a na-achọsi ike, osisi niile na-amịta mmiri nke ọma. 17  Ha esorowo ya gbadaa Shiol,+ gakwuru ndị e ji mma agha gbuo, na ndị biworo na ndò ya dị ka mkpụrụ ya n’etiti mba dị iche iche.’+ 18  “‘Ònye ka i yiri n’ebube+ nakwa n’ịdị ukwuu n’etiti osisi ndị dị n’Iden?+ Ma a ga-egbutu gị na osisi ndị dị n’Iden, unu ewee banye n’ime ala.+ N’etiti ndị a na-ebighị úgwù ka gị na ndị e ji mma agha gbuo ga-atọgbọ. Nke a bụ Fero na ndị ya niile,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji