Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 27:1-36

27  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, bụọ abụ iru uju+ banyere Taya,  sị Taya, “‘Gị onye bi n’ọnụ ọnụ oké osimiri,+ nwaanyị nke ya na ndị dị iche iche ndị si n’ọtụtụ agwaetiti na-azụkọ ahịa,+ nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Taya, gị onwe gị sịrị, ‘Ezuru m okè n’ịma mma.’+  Ókèala gị dị n’etiti oké osimiri.+ Ndị na-ewu gị emewo ka mma ị mara zuo okè.+  Ha si n’osisi junipa nke si Sina+ nweta osisi niile e ji rụọ gị. Ha ji osisi sida nke si Lebanọn+ rụọ osisi ákwà ụgbọ mmiri nke dị n’elu gị.  Ọ bụkwa oké osisi ndị si na Beshan ka ha ji rụọ ụmara e ji akwọ gị. Ha ji ọdụ́ a kwụnyere n’osisi saịpres nke si n’agwaetiti Kitim+ rụọ ihu gị.  Ákwà gị a gbasara agbasa bụ linin tụrụ àgwà nke si n’Ijipt,+ ka o wee bụrụ ákwà ụgbọ mmiri nke dị n’elu gị. Ákwà na-acha anụnụ anụnụ+ na ákwà e sijiri odo odo+ nke si n’agwaetiti Elaịsha+ ka e ji kpuchie elu gị.  “‘“Ndị na-akwọ gị bụ ndị bi na Saịdọn+ na Avad.+ Gị Taya, ndị gị, bụ́ ndị nwere nkà,+ nọ n’ime gị; ọ bụ ha bụ ndị na-akwọ gị dị ka ụgbọ.+  Ọbụna ndị okenye Gibal+ na ndị ya, bụ́ ndị nwere nkà, nọ n’ime gị dị ka ndị na-arachi oghere ndị dị na gị.+ Ụgbọ mmiri niile nke oké osimiri na ndị ọrụ ha nọ n’ime gị, ka ha ree ngwá ahịa ha. 10  Ndị Peshia+ na ndị Ludim+ na ndị Pọt+—ha so n’ìgwè ndị agha gị, ndị na-alụrụ gị agha. Ha kokwasịrị ọta na okpu agha ha ná mgbidi gị.+ Ọ bụ ha mere ka ị maa mma. 11  Ụmụ Avad,+ tinyere ndị agha gị, nọ gburugburu n’elu mgbidi gị, ọ bụkwa ndị ikom obi siri ike nọ n’ụlọ elu gị. Ọta ha nke dị okirikiri ka ha kokwasịrị ná mgbidi gị gbaa gburugburu.+ Ọ bụ ha mere ka mma ị mara zuo okè. 12  “‘“Tashish+ bụ onye ahịa gị n’ihi ụdị ihe niile dị oké ọnụ ahịa ndị dị ọtụtụ.+ E ji ngwá ahịa gị niile gbanwere ọlaọcha, ígwè, gbamgbam na opu ya.+ 13  Jevan,+ Tubal+ na Mishek+ bụ ndị ahịa gị. E ji ngwá ahịa gị gbanwere mkpụrụ obi ụmụ mmadụ+ na ihe e ji ọla kọpa mee. 14  E ji ịnyịnya nkịtị na ịnyịnya agha na ịnyịnya ibu ndị si n’ụlọ Togama+ gbanwere ngwá ahịa gị. 15  Ụmụ Didan+ bụ ndị ahịa gị; ọtụtụ agwaetiti bụ ndị na-erere gị ahịa; ọdụ́+ na osisi eboni bụ onyinye ha ji kwụọ gị ụgwọ. 16  Idọm bụ onye ahịa gị n’ihi ọtụtụ ihe ị na-emepụta. E ji ngwá ahịa gị gbanwere nkume tọkwọiz,+ ákwà e sijiri odo odo na ákwà tụrụ àgwà na ezigbo ákwà na nkume kọral na rubi. 17  “‘“Juda na ala Izrel bụkwa ndị ahịa gị. E jikwa ọka wit+ nke Minit+ na nri pụrụ iche na mmanụ aṅụ+ na mmanụ na bọlsọm+ gbanwere ngwá ahịa gị.+ 18  “‘“Damaskọs+ bụ onye ahịa gị n’ihi ọtụtụ ihe ị na-emepụta, n’ihi ihe gị niile dị oké ọnụ ahịa ndị dị ọtụtụ, tinyere mmanya+ Helbọn na ajị anụ na-acha nchara nchara. 19  Vidan na Jevan nke si Yuzal ji ihe ha dị iche iche gbanwere ngwá ahịa gị. Ngwá ahịa gị bụ ihe ndị e ji ígwè kpụọ, osisi kashịa na ahịhịa na-esi ísì ụtọ.+ 20  Didan+ bụ onye na-azụ gị ákwà e kwere ekwe e ji anọkwasị n’elu ịnyịnya. 21  Ndị Arab+ na ndị isi Kida+ niile bụ ndị na-erere gị ahịa. Ha na-erere gị ụmụ ebule na ebule na mkpi.+ 22  Ndị ahịa Shiba+ na Rema+ bụ ndị ahịa gị; e ji ngwá ahịa gị gbanwere ụdị ihe otite ọma niile na-esi ísì ụtọ nakwa ụdị nkume niile dị oké ọnụ ahịa na ọlaedo.+ 23  Heran+ na Kane na Iden,+ ndị ahịa Shiba,+ Ashọ+ na Kilmad, bụ ndị ahịa gị. 24  Ha bụ ndị na-erere gị uwe mara mma n’ebe ị na-ere ahịa. Ha na-erekwara gị uwe e ji ákwà na-acha anụnụ anụnụ na ákwà tụrụ àgwà mee nakwa kapet tụrụ àgwà abụọ, na ụdọ a tụrụ atụ, nke e mekwara ka o sie ike. 25  “‘“Ọ bụ ụgbọ mmiri Tashish+ na-eburu gị ngwá ahịa gị, i wee jupụta ná ngwá ahịa, dịkwa ebube n’etiti oké osimiri.+ 26  “‘“Ọ bụ ná nnukwu mmiri ka ndị na-akwọ gị kwọrutere gị.+ Ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ etikawo gị n’etiti oké osimiri.+ 27  Ihe gị ndị dị oké ọnụ ahịa na ihe ị kwakọbara,+ bụ́ ngwá ahịa gị,+ ndị na-arụ ọrụ n’ime gị na ndị na-akwọ gị,+ ndị na-arachi oghere ndị dị na gị+ na ndị na-erere gị ngwá ahịa gị nakwa ndị niile na-alụrụ gị agha,+ bụ́ ndị nọ n’ime gị nakwa ndị niile so gị, ndị nọ n’ime gị,—ha ga-adaba n’etiti oké osimiri n’ụbọchị ị ga-ada.+ 28  “‘“Mgbe a nụrụ mkpu ákwá nke ndị na-akwọ gị, obodo dị n’ụsọ osimiri ga-ama jijiji.+ 29  Ndị niile bu ụmara ụgbọ, bụ́ ndị ọrụ ụgbọ mmiri, ndị niile na-akwọ ụgbọ mmiri n’elu oké osimiri, ga-esi n’ụgbọ ha rịtuo; n’elu ala ka ha ga-eguzo.+ 30  Ha ga-eti mkpu n’ihi gị, kwaakwa ákwá nke ukwuu.+ Ha ga-ekpokwasịkwa ájá n’isi ha.+ Ha ga-atụrụ onwe ha ná ntụ.+ 31  Ha ga-eme onwe ha ndị isi nkwọcha n’ihi gị,+ keekwa ákwà iru uju n’úkwù+ ma kwaara gị ákwá n’ihi ihe na-ewute ha ná mkpụrụ obi,+ na-akwa ákwá arịrị. 32  Mgbe ha na-akwara gị ákwá arịrị, ha ga-abụrụ gị abụ iru uju,+ sị, “‘“‘Ònye dị ka Taya,+ bụ́ onye a laworo n’iyi n’etiti oké osimiri?+ 33  Mgbe ngwá ahịa gị+ si n’oké osimiri pụta,+ i mere ka afọ ju ọtụtụ ndị.+ I ji ihe gị ndị dị oké ọnụ ahịa na ngwá ahịa gị mee ka ndị eze ụwa baa ọgaranya.+ 34  Ugbu a, oké osimiri etikasiwo gị, n’ogbu mmiri.+ Ngwá ahịa gị na ndị niile so gị+ alawo n’iyi n’ime gị. 35  Ndị niile bi n’agwaetiti+—ha ga-ekporopụ anya na-ele gị, ndị eze ha ga-amakwa jijiji n’ụjọ.+ Ihu ndị mmadụ ga-agbarụ.+ 36  Ndị ahịa n’etiti ndị dị iche iche ga-afụ mkpọrọhịhị n’ihi gị.+ Ihe ụjọ mberede ga-abịakwasị gị, ị gaghị adịkwa ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.’”’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji