Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 23:1-49

23  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ,+ sị:  “Nwa nke mmadụ, e nwere ndị inyom abụọ otu nne ji.+  Ha wee malite ịgba akwụna n’Ijipt.+ Ha gbara akwụna mgbe ha bụ ụmụ agbọghọ.+ N’ebe ahụ ka a nọ pịa ha aka n’ara,+ n’ebe ahụkwa ka a nọ pịa ha aka n’ara n’oge ha na-amabeghị nwoke.  Aha ha bụ Ohola, bụ́ nke okenye, na Oholiba nwanne ya nwaanyị, ha wee bụrụ nke m+ ma malite ịmụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.+ A bịa n’aha ha, Ohola bụ Sameria,+ Oholiba bụ Jeruselem.+  “Ohola wee malite ịgba akwụna,+ mgbe ọ nọ n’okpuru m, na-enwekwa agụụ ka ya na ndị ya na ha na-eme enyi nwee mmekọahụ,+ ya bụ, ndị Asiria,+ bụ́ ndị nọ ya nso,  ndị gọvanọ ndị yi uwe na-acha anụnụ anụnụ, na ndị osote onye na-achị achị—ha niile bụcha ụmụ okorobịa ọma, ndị agha ịnyịnya bụ́ ndị na-agba ịnyịnya.  O wee na-akwa iko, ya na ha, bụ́ ndị niile kasị mma n’etiti ndị Asiria; ọ bụkwa n’ahụ́ ndị niile ọ na-enwere agụụ mmekọahụ—ha na arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị—ka o merụrụ onwe ya.+  Ọ hapụghịkwa akwụna ọ malitere ịgba n’Ijipt, n’ihi na ha na ya dinara mgbe ọ bụ nwa agbọghọ, ọ bụkwa ha pịrị ya aka n’ara mgbe ọ na-amabeghị nwoke. Ha nọkwa na-awụkwasị ya mmekọahụ rụrụ arụ dị ka mmiri.+  Ya mere, m nyefere ya n’aka ndị ya na ha na-eme enyi,+ n’aka ndị Asiria, bụ́ ndị ọ gụrụ ya agụụ ka ha na ya nwee mmekọahụ.+ 10  Ọ bụ ha gbara ya ọtọ.+ Ha kpọọrọ ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom,+ jirikwa mma agha gbuo ya. O wee nwee aha ọjọọ n’etiti ndị inyom, ha mekwara ya ihe e kpere n’ikpe. 11  “Mgbe nwanne ya nwaanyị bụ́ Oholiba hụrụ ihe ọ na-eme,+ ya onwe ya ji ọchịchọ anụ ahụ́ ya mee omume na-eweta mbibi karịa nwanne ya nwaanyị. Ọ gbara akwụna karịa ịkwa iko nke nwanne ya nwaanyị.+ 12  N’ihi na o nwere agụụ ka ya na ndị Asiria nwee mmekọahụ,+ bụ́ ndị gọvanọ na ndị osote onye na-achị achị bụ́ ndị nọ ya nso, ndị na-eji ejiji nke ọma, ndị agha ịnyịnya bụ́ ndị na-agba ịnyịnya—ha niile bụcha ụmụ okorobịa ọma.+ 13  M wee hụ na, ebe ọ bụ na o merụwo onwe ya, ha abụọ na-akpa otu àgwà.+ 14  O wee na-agbakwu akwụna mgbe ọ hụrụ ndị ikom a tụrụ n’ahụ́ ụlọ,+ bụ́ ihe oyiyi+ nke ndị Kaldia, nke e ji ihe na-acha uhie uhie tụọ,+ 15  ndị e kere ájị̀+ n’úkwù, keekwa ha ogologo ákwà n’isi. Ha niile yiri ndị dike, yie ụmụ Babịlọn, ndị Kaldia, bụ́ ala a mụrụ ha. 16  O wee malite inwe agụụ ka ya na ha nwee mmekọahụ mgbe ọ hụrụ ha,+ o zigakwaara ha ndị ozi na Kaldia.+ 17  Ụmụ Babịlọn wee na-abịakwute ya n’ihe ndina ọ na-anọ egosi ịhụnanya, jiri mmekọahụ ha rụrụ arụ na-emerụ ya;+ ha wee na-emerụ ya, mkpụrụ obi ya wee hapụ ha n’iwe. 18  “O wee na-agba akwụna n’ezoghị ya ezo, na-agbakwa onwe ya ọtọ.+ Mkpụrụ obi m wee jiri iwe hapụ ya, dị nnọọ ka mkpụrụ obi m ji iwe hapụ nwanne ya nwaanyị.+ 19  O wee na-eme ka akwụna ọ na-agba dị ukwuu+ nke na o mere ka e cheta mgbe ọ bụ nwa agbọghọ,+ mgbe ọ gbara akwụna n’ala Ijipt.+ 20  O wee na-enwe agụụ mmekọahụ dị ka ndị iko nke ndị ikom ahụ́ nwoke ha yiri nke oké ịnyịnya ibu, ndị ihe ha ji bụrụ nwoke yiri nke oké ịnyịnya.+ 21  I wee na-eme ka e cheta omume rụrụ arụ i mere mgbe ị bụ nwa agbọghọ, mgbe a pịrị gị aka n’ara malite n’oge ị nọ n’Ijipt+ gaa n’ihu, n’ihi ara agbọghọbịa gị.+ 22  “Ya mere, gị Oholiba, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee, m na-akpali ndị gị na ha na-eme enyi ka ha bịa wakpo gị,+ ndị ahụ mkpụrụ obi gị ji iwe hapụ. M ga-akpọbata ha ka ha si n’akụkụ gị niile wakpo gị,+ 23  ụmụ Babịlọn+ na ndị Kaldia+ niile, Pikọd+ na Shoa na Koa, ha na ndị Asiria niile, ụmụ okorobịa ọma, ha niile bụcha ndị gọvanọ na ndị osote onye na-achị achị, ndị dike na ndị a na-akpọ òkù, ndị na-agba ịnyịnya, ha niile. 24  Ha ga-eji ụgbọ ịnyịnya agha na ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ha ndị na-eme mkpọtụ bata buso gị agha,+ ha na ìgwè ndị dị iche iche. Ha ga-ejikwa ọta ukwu na ọta nta na okpu agha. Ha ga-agba gị gburugburu imegide gị, m ga-enyefekwa ikpe n’aka ha, ha ga-ekpekwa gị ikpe dị ka mkpebi ha si dị.+ 25  M ga-awụsa gị iwe m,+ ha ga-ejikwa ọnụma mee gị ihe.+ Ha ga-ebepụ gị imi na ntị. A ga-ejikwa mma agha gbuo ndị gị fọrọ afọ. Ha ga-akpọrọ+ ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom.+ Ọkụ ga-erepịakwa ndị gị fọrọ afọ.+ 26  Ha ga-eyipụkwa gị uwe gị,+ werekwa ihe ịchọ mma gị niile mara mma.+ 27  M ga-eme ka ị kwụsị omume gị rụrụ arụ,+ tinyere akwụna ị malitere ịgba n’ala Ijipt;+ ị gaghị ewelikwa anya gị lee ha, ị gaghịkwa echeta Ijipt ọzọ.’ 28  “N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Lee, m na-enyefe gị n’aka ndị ị kpọrọ asị, n’aka ndị mkpụrụ obi gị hapụrụ n’iwe.+ 29  Ha ga-eji ịkpọasị napụ gị ihe niile ị dọgburu onwe gị n’ọrụ nweta, gbaakwa gị ọtọ, ị gaghị eyi ihe ọ bụla;+ a ga-ekpughekwa ọtọ nke ịkwa iko gị na nke omume gị rụrụ arụ na nke ịgba akwụna gị.+ 30  A ga-eme gị ihe ndị a n’ihi na ị na-esogharị mba dị iche iche dị ka nwaanyị akwụna,+ maka na i jiriwo arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị merụọ onwe gị.+ 31  I jewo ije n’ụzọ nwanne gị nwaanyị jere;+ m ga-ewerekwa iko ya nye gị.’+ 32  “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ị ga-aṅụ iko nwanne gị nwaanyị ṅụrụ, nke miri emi ma saa mbara.+ Ị ga-abụ onye a na-achị ọchị na onye a na-akwa emo, iko nke nwere ihe dị ukwuu n’ime ya.+ 33  A ga-eme ka ị ṅụbiga mmanya ókè, meekwa ka iru uju ju gị afọ, nke bụ́ iko ijuanya na nke ịtọgbọrọ n’efu, iko nke nwanne gị nwaanyị bụ́ Sameria ṅụrụ. 34  Ị ga-aṅụ ya, ṅụkpọọ ya,+ ị ga-atapịa mpekere ya, ị ga-adọpụkwa ara gị abụọ.+ “N’ihi na mụ onwe m ekwuwo ya,” ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’ 35  “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na i chefuwo m,+ i wee gbakụta m azụ,+ gị onwe gị ga-eburukwa omume gị rụrụ arụ na ịgba akwụna gị.’” 36  Jehova wee sị m: “Nwa nke mmadụ, ị̀ ga-ekpe+ Ohola na Oholiba+ ikpe ma gwa ha ihe arụ niile ha mere?+ 37  N’ihi na ha akwawo iko,+ ọbara dịkwa n’aka ha,+ ha na arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị akwawo iko.+ E wezụga nke ahụ, ha ewerewo ụmụ ha mụụrụ m sureere* arụsị ndị a n’ọkụ ka ha bụrụ nri ha.+ 38  Nke a bụkwa ihe ọzọ ha mere m: Ha merụrụ+ ebe nsọ+ m n’ụbọchị ahụ, ha merụkwara ụbọchị izu ike m.+ 39  Mgbe ha weresịịrị ụmụ ha gbuoro arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị,+ ha batara n’ebe nsọ m n’ụbọchị ahụ ka ha merụọ ya,+ ma, lee! nke ahụ bụ ihe ha mere n’ime ụlọ m.+ 40  Tụkwasị na nke ahụ, mgbe ha malitere izigara ndị ikom si n’ebe dị anya ozi, bụ́ ndị e zigaara onye ozi,+ lee! ha bịara,+ bụ́ ndị unu sara ahụ́ maka ha,+ tee uri anya,+ jirikwa ihe ịchọ mma chọọ onwe unu mma.+ 41  Unu wee nọdụ ọdụ n’elu ihe ndina dị ebube,+ nke e debere tebụl e doziri nke ọma n’ihu ya,+ unu debekwara ihe nsure ọkụ m na-esi ísì ụtọ+ na mmanụ m n’elu ya.+ 42  A nụkwara mkpọtụ nke ìgwè mmadụ tụsaara ahụ́ n’ime ya.+ E sikwa n’ala ịkpa kpọrọ ndị ikom n’etiti ìgwè mmadụ na-abịa, ha na ndị aṅụrụma,+ ha wee gbanye ndị inyom ahụ ọla n’aka, kpuwekwa ha okpueze mara mma n’isi.+ 43  “M wee kwuo banyere nwaanyị ahụ ahụ́ gwụrụla n’ihi ịkwa iko,+ sị, ‘Ugbu a, ya onwe ya ga-anọ na-agba akwụna.’+ 44  Ha wee na-abịakwute ya, dị nnọọ ka mmadụ na-abịakwute nwaanyị na-agba akwụna; ọ bụ otú ahụ ka ha si na-abịakwute Ohola na Oholiba dị ka ndị inyom na-eme omume rụrụ arụ.+ 45  Ma, ọ bụ ndị ezi omume+ ga-ekpe ya ikpe a na-ekpe ndị inyom na-akwa iko+ nakwa ikpe a na-ekpe ndị inyom na-awụfu ọbara;+ n’ihi na ha bụ ndị inyom na-akwa iko, ọbara dịkwa n’aka ha.+ 46  “N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘A ga-akpọkọta ìgwè mmadụ ka ha bịa buso ha agha,+ a ga-emekwa ka ha ghọọ ihe ga-eme ka a tụọ ụjọ na ihe a ga-ebukọrọ ebukọrọ.+ 47  Ìgwè mmadụ ahụ ga-atụkwa ha nkume,+ ha ga-ejikwa mma agha ha gbuo ha. Ha ga-egbu ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom,+ ha ga-agbakwa ụlọ ha ọkụ.+ 48  M ga-emekwa ka omume rụrụ arụ+ kwụsị n’ala ahụ.+ Ndị inyom niile ga-ekwere ka a gbazie ha, ka ha wee ghara ime omume rụrụ arụ+ unu mere. 49  Ha ga-enye unu ntaramahụhụ maka omume rụrụ arụ unu+ na-eme, unu ga-ejikwa isi unu buru mmehie nke arụsị unu ndị na-asọ oyi ka nsị. Unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Ọkaakaa Onyenwe unu bụ́ Jehova.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “ime ka ha gabiga n’ọkụ.”