Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 2:1-10

2  O wee sị m: “Nwa nke mmadụ,+ bilie ọtọ ka m gwa gị okwu.”+  Mmụọ nsọ wee bata n’ime m ozugbo ọ gwara m okwu.+ O wee mee ka m guzoro ọtọ ka m wee nụ ihe Onye ahụ na-agwa m okwu na-ekwu.+  O wee sị m: “Nwa nke mmadụ, m na-edunye gị ka ị gakwuru ụmụ Izrel,+ bụ́ mba na-enupụ isi, ndị nupụụrụ m isi.+ Ha onwe ha na ndị nna nna ha emehiewo m ruo taa.+  Ụmụ na-aka anya+ na ndị isi ike,+ m na-edunye gị ka ị gakwuru ha, sịkwa ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’  Ma ha onwe ha, ma hà ga-anụ+ ma ha agaghị anụ+, n’ihi na ha bụ ụlọ na-enupụ isi,+ ha ga-amarakwa na onye amụma nọrọ n’etiti ha.+  “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, atụla ha egwu;+ atụkwala okwu ha egwu, n’ihi na e nwere ndị na-ekwesi olu ike+ na ihe na-adụ gị ogwu,+ ọ bụkwa n’etiti akpị+ ka ị nọ. Atụkwala okwu ha egwu,+ ụjọ atụkwala gị ma ị hụ ihu ha,+ n’ihi na ha bụ ụlọ na-enupụ isi.+  Gwa ha okwu m, ma hà ga-anụ ma ha agaghị anụ, n’ihi na ha bụ ndị nnupụisi.+  “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, nụrụ ihe m na-agwa gị. Enupụkwala isi dị ka ụlọ a nke na-enupụ isi.+ Meghee ọnụ gị rie ihe m na-enye gị.”+  M wee hụ, ma, lee! e nwere aka a gbatịịrị m,+ lee! aka ahụ ji akwụkwọ a pịakọtara apịakọta.+ 10  O wee gbasaa ya n’ihu m, e dekwara ya ihe ihu na azụ;+ e dere ya abụ iru uju na ịkwa ákwá na ákwá arịrị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji