Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 19:1-14

19  “Ma gị onwe gị, bụọ abụ iru uju+ banyere ndị isi Izrel,+  sị, ‘Gịnị ka nne gị bụ? Nne ọdụm n’etiti ọdụm.+ Ọ makpu n’etiti ụmụ ọdụm tojuru etoju. Ọ zụlitere ụmụ ya.  “‘O ji nwayọọ nwayọọ zụlite otu n’ime ụmụ ya.+ O wee ghọọ nwa ọdụm tojuru etoju, malitekwa ịmụ otú e si adọgbu anụ.+ O riri ọbụna mmadụ.  Mba dị iche iche wee na-anụ banyere ya. E jidere ya n’olulu ha, ha wee jiri nko dọkpụrụ ya gaa n’ala Ijipt.+  “‘Mgbe o chegidere wee hụ na ya enwekwaghị olileanya ya, o weere nwa ya ọzọ.+ Ọ zụlitekwara ya, o wee ghọọ nwa ọdụm tojuru etoju.  O wee na-ejegharị n’etiti ọdụm. Ọ ghọrọ nwa ọdụm tojuru etoju. O wee jiri nwayọọ nwayọọ mụta ka e si adọgbu anụ.+ O riri ọbụna mmadụ.+  O wee mata ụlọ elu o bi, ọ lakwara ọbụna obodo ha n’iyi,+ ala ahụ wee tọgbọrọ n’efu, o mekwara ka a nụ mbigbọ+ ya n’ala ahụ dum.  Mba niile ndị gbara ya gburugburu, bụ́ ndị si n’ógbè dị iche iche, malitere ịbịa ka ha megide ya,+ gbasaakwa ụgbụ ha n’elu ya.+ Ha jidere ya n’olulu ha.+  N’ikpeazụ, ha ji nko dọrọ ya dọba n’ime ngịga wee buru ya butere eze Babịlọn.+ Ha wee jiri ụgbụ e ji achụ nta bute ya, ka a ghara ịnụ olu ya ọzọ n’ugwu niile dị n’Izrel.+ 10  “‘N’ime ọbara gị,+ nne gị+ dị ka osisi vaịn nke a kụrụ n’akụkụ mmiri. Ọ ghọrọ osisi na-amị mkpụrụ, nke nwekwara ọtụtụ alaka n’ihi na ọ na-enweta mmiri dị ukwuu.+ 11  Ha wee ghọọrọ ya mkpanaka siri ike, bụ́ mkpanaka nke ndị na-achị achị.+ O wee jiri nwayọọ nwayọọ tokarịa alaka osisi ndị ọzọ, e wee na-ahụ ya anya n’ihi ogologo o toro, n’ihi na alaka ya dị ọtụtụ.+ 12  Ma e mesịrị jiri iwe fopu ya.+ A tụsara ya n’ala, ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ mekwara ka mkpụrụ ya kpọọ nkụ.+ A gbajipụrụ mkpanaka ya siri ike, o wee kpọnwụọ.+ Ọkụ repịakwara ya.+ 13  A kụkwara ya n’ala ịkpa,+ n’ala mmiri na-adịghị, nke kpọkwara nkụ.+ 14  Ọkụ wee si na mkpanaka ya pụta.+ O repịara alaka ya na mkpụrụ ya. O nweghịkwa mkpanaka siri ike, mkpanaka e ji achị achị adịghịkwa.+ “‘Nke ahụ bụ abụ iru uju, ọ ga-aghọkwa abụ iru uju.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji