Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 18:1-32

18  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Gịnị bụ isi ilu a unu na-atụ n’ala Izrel, sị, ‘Ọ bụ ndị nna rachara mkpụrụ vaịn na-achaghị acha, ma, ọ bụ ụmụ ha ka ezé na-eri izizi’?+  “‘Dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘unu agakwaghị na-atụ ilu a n’Izrel.  Lee! Mkpụrụ obi niile, ọ bụ m nwe ha.+ Ma mkpụrụ obi+ nke nna ma mkpụrụ obi nke nwa, ọ bụ m nwe ha.+ Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie,+ ọ bụ ya ga-anwụ.+  “‘Ọ bụrụ na mmadụ bụ onye ezi omume, na-emekwa ihe ziri ezi na ezi omume;+  o righị ihe+ n’elu ugwu,+ o welighịkwa anya ya lee arụsị ụlọ Izrel ndị na-asọ oyi ka nsị,+ o merụghịkwa nwunye nwoke ibe ya,+ ọ gaghịkwa nwaanyị nọ ná nsọ ya nso;+  ọ dịghịkwa onye ọ bụla o megburu;+ ọ na-eweghachikwa ihe ibé ọ naara maka ụgwọ e ji ya;+ ọ dịghị ihe ọ na-apụnara mmadụ;+ ọ na-ewere nri ya nye onye agụụ na-agụ,+ yiwekwa onye gba ọtọ uwe;+  ọ naghị agbazinye mmadụ ego ma nara ọmụrụ nwa,+ ọ naghịkwa anara ụma;+ ọ na-esepụ aka ya n’ikpe na-ezighị ezi;+ ọ na-ekpe ikpe ziri ezi n’etiti mmadụ na ibe ya;+  n’ụkpụrụ m ka ọ na-eje ije,+ ọ na-edebekwa mkpebi ikpe m iji mee ihe n’eziokwu,+ ọ bụ onye ezi omume.+ Ọ ga-anọgide na-adị ndụ,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. 10  “‘Ọ bụrụkwa na mmadụ amụọ nwa nke na-apụnara mmadụ ihe,+ nke na-awụfu ọbara,+ nke meworo ihe yiri otu n’ime ihe ndị a 11  (ma ya onwe ya emeghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a); ọ bụrụkwa na o riwo nri n’elu ugwu,+ merụọkwa nwunye nwoke ibe ya;+ 12  megbuo onye nọ n’ahụhụ na ogbenye;+ pụnara mmadụ ihe,+ jụkwa iweghachi ihe e ji gbaa ibé;+ o weliri anya ya lee arụsị ndị na-asọ oyi ka nsị,+ ọ bụ ihe arụ ka o mere.+ 13  Ọ gbazinyewo mmadụ ego ma nara ọmụrụ nwa,+ ọ narawokwa ụma,+ ọ gaghị adị ndụ. O mewo ihe arụ a niile.+ A ga-egburịrị ya. Ọbara ya ga-adị ya n’isi.+ 14  “Ma, lee! mmadụ amụwo nwa, bụ́ onye na-ahụ mmehie niile nna ya na-eme, ọ hụwo mmehie ndị a ma o meghị ihe yiri ha.+ 15  O righị ihe n’elu ugwu, o welighịkwa anya ya lee arụsị ụlọ Izrel ndị na-asọ oyi ka nsị;+ ọ merụghịkwa nwunye nwoke ibe ya;+ 16  o megbughịkwa onye ọ bụla,+ o jichighị ihe ibé ọ bụla,+ ọ dịghịkwa ihe ọ pụnaara mmadụ;+ o nyekwara onye agụụ na-agụ nri nke ya,+ yiwekwa onye gba ọtọ uwe;+ 17  ọ dịghị emegbu onye nọ n’ahụhụ; ọ dịghị anara ọmụrụ nwa+ na ụma;+ ọ na-eme ihe m kpere n’ikpe;+ ọ na-ejekwa ije n’ụkpụrụ m;+ ya onwe ya agaghị anwụ n’ihi njehie nna ya.+ Ọ ga-anọgide na-adị ndụ.+ 18  Ma ebe ọ bụ na o doro anya na nna ya rigburu mmadụ,+ pụnarakwa nwanne ya ihe,+ meekwa ihe ọ bụla na-adịghị mma n’etiti ndị ya,+ lee! ọ ga-anwụ n’ihi njehie ya.+ 19  “‘Unu onwe unu ga-asị: “Gịnị mere na nwata agaghị aza ajụjụ ọ bụla maka njehie nna ya?”+ Nwata ahụ na-eme ihe n’ikpe ziri ezi,+ na-emekwa ezi omume, o debekwara ụkpụrụ m niile ma ka na-edebe ha.+ Ọ ga na-adị ndụ.+ 20  Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie, ọ bụ ya ga-anwụ.+ Nwata agaghị aza ajụjụ ọ bụla maka njehie nna ya, nna agaghịkwa aza ajụjụ ọ bụla maka njehie nwa ya.+ Ezi omume nke onye ezi omume ga-adị n’isi ya,+ ajọ omume nke onye ajọ omume ga-adịkwa n’isi ya.+ 21  “‘Ọ bụrụ na onye ajọ omume ahapụ mmehie niile o mere,+ debe ụkpụrụ m niile, meekwa ihe ziri ezi na ezi omume,+ ọ ga-anọgide na-adị ndụ. Ọ gaghị anwụ.+ 22  A gaghị echeta iwu niile o mebiri iji mee ya ihe.+ Ọ ga-anọgide na-adị ndụ n’ihi ezi omume o mere.’+ 23  “‘Ọnwụ onye ajọ omume ọ̀ na-atọ m ụtọ n’ụzọ ọ bụla,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘ihe na-atọ m ụtọ ọ́ bụghị ka ọ hapụ ụzọ ya wee dịrị ndụ?’+ 24  “‘Ma mgbe onye ezi omume hapụrụ ezi omume ya, mewe ihe na-ezighị ezi;+ o wee na-eme ihe arụ niile onye ajọ omume mere,+ o wee na-adị ndụ, ọ dịghị otu n’ime ezi omume niile o mere a ga-echeta.+ Ọ ga-anwụ n’ihi omume ekwesịghị ntụkwasị obi o mere nakwa n’ihi mmehie o mere.+ 25  “‘Unu ga-asịkwa: “Ụzọ Jehova ezighị ezi.”+ Biko, nụrụ, gị ụlọ Izrel. Ọ̀ bụ na ụzọ m ezighị ezi?+ Ọ́ bụghị ụzọ unu bụ nke na-ezighị ezi?+ 26  “‘Mgbe onye ezi omume hapụrụ ezi omume ya, mewe ihe na-ezighị ezi+ wee nwụọ n’ihi ya, ọ ga-anwụ n’ihi omume na-ezighị ezi o mere.+ 27  “‘Mgbe onye ajọ omume hapụrụ ajọ omume o mere, mewe ihe ziri ezi na ezi omume,+ ọ bụ ya ga-echebe mkpụrụ obi ya ndụ.+ 28  Mgbe ọ chọpụtara ya+ ma hapụ mmebi iwu ndị o mere,+ ọ ga-adịrị ndụ. Ọ gaghị anwụ.+ 29  “‘Ụlọ Izrel ga-asịkwa: “Ụzọ Jehova ezighị ezi.”+ Ọ̀ bụ na ụzọ m ezighị ezi, ụlọ Izrel?+ Ọ́ bụghị ụzọ unu bụ nke na-ezighị ezi?’+ 30  “‘Ya mere, ọ bụ dị ka ụzọ onye ọ bụla si dị ka m ga-ekpe unu ikpe,+ ụlọ Izrel,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.+ ‘Chigharịanụ, ee, hapụnụ mmebi iwu unu niile,+ ka ihe ọ bụla gharakwa ịbụrụ unu ihe ịsụ ngọngọ nke na-akpata njehie.+ 31  Wepụnụ mmebi iwu unu niile n’ebe unu nọ,+ meerenụ onwe unu obi ọhụrụ+ na mmụọ ọhụrụ,+ n’ihi na, gịnị mere unu ga-eji nwụọ,+ unu ụlọ Izrel?’ 32  “‘N’ihi na ọnwụ onye na-anwụ anwụ adịghị atọ m ụtọ,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru. ‘N’ihi ya, chigharịanụ ka unu wee dịrị ndụ.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji