Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 16:1-63

16  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Nwa nke mmadụ, mee ka Jeruselem mara+ ihe arụ niile ọ na-eme.+  Sị ya, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gwara Jeruselem: “Ọ bụ n’ala ndị Kenan+ ka i si, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a mụrụ gị. Nna gị bụ onye Amọraịt,+ nne gị abụrụ onye Het.+  A bịa n’ọmụmụ gị, n’ụbọchị a mụrụ gị,+ e bepụghị alọ otubo gị, e jighị mmiri saa gị ahụ́ ka ị dị ọcha, e teghị gị nnu ma ọlị, a fụchighịkwa gị ákwà.  Ọ dịghị anya meere gị ebere wee meere gị otu n’ime ihe ndị a n’ihi ọmịiko o nwere n’ebe ị nọ,+ kama a tụsara gị n’ala nkịtị n’ihi na a kpọrọ mkpụrụ obi gị asị n’ụbọchị a mụrụ gị.  “‘“M wee na-agafe n’ebe ị nọ, hụ gị ka ị na-agba lịkalịka n’ime ọbara gị, m wee sị gị mgbe ahụ ị nọ n’ime ọbara gị, ‘Dịrị ndụ!’+ ee, m sịrị gị mgbe ahụ ị nọ n’ime ọbara gị, ‘Dịrị ndụ!’  M mere gị ka ị dị ọtụtụ nke ukwuu dị ka ihe puru n’ọhịa, nke mere na i tolitere+ wee dị ogologo, yirikwa ihe ịchọ mma kasị mma bata.+ Ị kpụrụ ara abụọ, ntutu isi gị tojukwara etoju, mgbe ị gba ọtọ n’eyighị ihe ọ bụla.”’  “‘M wee na-agafe n’ebe ị nọ wee hụ gị, ma, lee! ị nọ n’oge igosi ịhụnanya.+ M wee jiri uwe mwụda m kpuchie gị,+ kpuchie ọtọ gị, m ṅụkwaara gị iyi,+ mụ na gị wee gbaa ndụ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘i wee bụrụ nke m.+  M jikwa mmiri saa gị ahụ́+ wee sachapụ ọbara dị gị n’ahụ́, teekwa gị mmanụ.+ 10  M wee yiwe gị uwe a kpara ihe,+ yinye gị akpụkpọ ụkwụ e ji akpụkpọ anụ sil mee,+ fụọkwa gị ákwà linin ọma+ n’isi ma jiri ákwà dị oké ọnụ kpuchie gị. 11  M wee jiri ihe ịchọ mma chọọ gị mma, gbanye gị ọla aka+ n’aka, yinyekwa gị ihe olu n’olu.+ 12  M gbanyekwara gị ọla imi+ n’imi, yinyekwa gị ọla ntị ná ntị,+ kpuwe gị okpueze mara mma n’isi.+ 13  I wee jiri ọlaedo na ọlaọcha na-achọ onwe gị mma, ejiji gị bụkwa ákwà linin ọma na ákwà dị oké ọnụ, tinyere uwe a kpara ihe.+ Nri gị bụ ntụ ọka* e gwere nke ọma na mmanụ aṅụ na mmanụ,+ i wee tolite maa mma nke ukwuu, i ji nwayọọ nwayọọ ruo eru ịbụ eze nwaanyị.’”+ 14  “‘Aha gị wee na-ede ude n’etiti mba dị iche iche n’ihi mma ị mara, maka na o zuru okè n’ihi ịma mma m nke m yiwere gị dị ka uwe,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.” 15  “‘Ma ị malitere ịtụkwasị ịma mma gị+ obi ma ghọọ akwụna n’ihi aha gị+ nke na-ede ude. I wee gbara akwụna gakwuru onye ọ bụla nke na-agafe agafe;+ ịma mma gị wee bụrụ nke onye ahụ. 16  I wee chịrị ụfọdụ n’ime uwe gị meere onwe gị ebe dị elu+ ndị tụrụ àgwà, na-agbakwa akwụna n’elu ha,+ ụdị ihe ndị ahụ ekwesịghị ịdị, ha ekwesịghịkwa ime. 17  Ị na-ewerekwa ihe ịchọ mma gị ndị e ji ọlaedo m na ọlaọcha m mee, bụ́ ndị m nyere gị,+ ị na-emekwara onwe gị ihe oyiyi nwoke,+ gị na ha ana-akwa iko.+ 18  Ị na-ewerekwa uwe gị a kpara ihe kpuchie ha; ị na-edebekwa mmanụ m na ihe nsure ọkụ m na-esi ísì ụtọ+ n’ihu ha. 19  Nri m nke m nyere gị, ntụ ọka e gwere nke ọma na mmanụ na mmanụ aṅụ m nyere gị ka i rie,+ ka i debere n’ihu ha dị ka ihe na-esi ísì ụtọ,+ o wee na-adị otú ahụ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.” 20  “‘Ị na-akpọrọ ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom ị mụụrụ m,+ ị na-ejikwa ha achụrụ ha àjà ka e wee repịa ha,+ ịgba akwụna gị ó zubeghị? 21  Ị na-egbu ụmụ m,+ sitekwa n’isure* ha n’ọkụ, ị na-ewere ụmụ m nye ha.+ 22  N’ihe arụ niile ị na-eme nakwa n’akwụna ị na-agba, i chetaghị oge ị bụ nwata, mgbe ị gba ọtọ n’eyighị ihe ọ bụla; ị nọkwa na-agba lịkalịka n’ime ọbara gị.+ 23  O wee ruo na mgbe i mechara ihe ọjọọ gị niile (“ahụhụ, ahụhụ ga-adịrị gị,”+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru) 24  ị rụụrụ onwe gị ebe dị mkputamkpu, rụọkwara onwe gị ebe dị elu n’ámá ọ bụla.+ 25  Ị rụrụ ebe ndị dị elu+ gị n’isi ụzọ ọ bụla, wee malite ime ka ịma mma gị bụrụ ihe arụ,+ jagheekwara onye ọ bụla nke na-agafe agafe ụkwụ gị,+ wee mee ka akwụna ị na-agba dị ukwuu.+ 26  I wee gbara akwụna gakwuru ndị ikom Ijipt,+ bụ́ ndị agbata obi gị ahụ́ nwoke ha gbara agba,+ i wee na-eme ka akwụna ị na-agba dị ukwuu iji kpasuo m iwe. 27  Ma, lee! M ga-esetị aka m mee gị ihe,+ m ga-ebelatakwa ihe a na-enye gị,+ nyefeekwa gị n’aka ihe na-agụ mkpụrụ obi+ nke ndị inyom kpọrọ gị asị,+ bụ́ ndị inyom ndị Filistia,+ ndị inyom e wedara n’ala n’ihi omume gị rụrụ arụ.+ 28  “‘I wee gbara akwụna gakwuru ndị ikom Asiria n’ihi na ọ naghị eju gị eju,+ gị na ha nọ na-akwa iko, ọ naghịkwa eju gị eju. 29  I wee mee ka akwụna ị na-agba jupụta n’ala Kenan,+ bụ́ ala ndị Kaldia;+ ọbụna nke a ejughị gị. 30  Lee nnọọ ka ọnụma si ju m obi+ n’ihi gị,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘n’ihi ihe a niile i mere, ihe nwaanyị na-eme,+ ya bụ, akwụna nke ihere na-adịghị eme!+ 31  Mgbe ị rụụrụ onwe gị ebe dị mkputamkpu n’isi ụzọ ọ bụla, rụọkwa ebe ndị dị elu gị n’ámá ọ bụla, ma i meghị dị ka akwụna n’ihi na ị jụrụ ịnara ego. 32  Nwunye nke na-akwa iko na-anabata ndị ọzọ kama ịnabata di ya.+ 33  A na-enye ndị akwụna niile onyinye,+ ma ọ bụ gị na-enye ndị niile gị na ha na-eme enyi onyinye gị,+ ị na-enyekwa ha ngarị ka ha si n’ebe niile gbara gị gburugburu bịakwute gị ka gị na ha kwaa iko.+ 34  Otú i si agba akwụna dị iche n’otú ndị inyom ọzọ si agba, a gbatụbeghị ụdị akwụna a ị na-agba, n’ihi na ị na-akwụ ụgwọ mgbe ọ na-adịghị ụgwọ a na-akwụ gị, ya mere, nke gị dị iche.’ 35  “N’ihi ya, gị akwụna,+ nụrụ okwu Jehova.+ 36  Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na ị wụpụwo agụụ ihe ọjọọ gị,+ kpugheekwara ndị gị na ha na-eme enyi+ na arụsị gị niile ndị na-asọ oyi ka nsị,+ ndị bụ́ ihe arụ, ihe i ji bụrụ nwaanyị,+ n’iko niile ị na-akwa, i nyekwara arụsị ndị ahụ ọbara ụmụ gị,+ 37  n’ihi ya, lee, m ga-akpọkọta ndị niile gị na ha na-eme enyi, bụ́ ndị ị na-eme obi ụtọ, na ndị niile ị hụrụ n’anya, tinyere ndị niile ị kpọrọ asị, m ga-akpọkọta ha ka ha si n’ebe niile bịa megide gị, kpugheekwara ha ihe i ji bụrụ nwaanyị. Ha ga-ahụkwa ihe niile i ji bụrụ nwaanyị.+ 38  “M ga-ekpekwa gị ikpe a na-ekpe ndị inyom a lụ alụ bụ́ ndị na-akwa iko+ nakwa ndị inyom na-awụfu ọbara,+ m ga-enyekwa gị ọbara ọnụma na nke ekworo.+ 39  M ga-enyefekwa gị n’aka ha, ha ga-akwatu ebe dị mkputamkpu ị rụrụ,+ kwadakwa ebe ndị dị elu gị,+ ha ga-eyipụ gị uwe gị,+ chịrị ihe ịchọ mma gị niile mara mma,+ yipụsịa gị uwe i yi, gbaa gị ọtọ. 40  Ha ga-akpọtakwa ìgwè mmadụ imegide gị+ ma tụọ gị nkume,+ jirikwa mma agha ha gbuo gị.+ 41  Ha ga-agbakwa ụlọ gị niile ọkụ+ ma mee ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ gị n’ihu ọtụtụ ndị inyom;+ m ga-emekwa ka ị kwụsị ịbụ akwụna,+ ị gaghịkwa akwụ ụgwọ ọzọ. 42  M ga-emekwa ka ọnụma m dajụọ n’ebe ị nọ,+ ekworo m ga-esikwa n’ebe ị nọ pụọ;+ m ga-anọ jụụ, m gaghịkwa ewe iwe ọzọ.’ 43  “‘Ebe ọ bụ na i chetaghị oge ị bụ nwa agbọghọ,+ i wee kpasuo m iwe n’ihi ihe a niile,+ lee, mụ onwe m ga-eme ka i jiri isi gị buru ihe i metara,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘ị gaghịkwa na-eme omume ọ bụla rụrụ arụ, tinyere ihe arụ gị niile. 44  “‘Lee! Onye ọ bụla nke ji gị atụ ilu+ ga-atụ ilu a, sị: “Nwata nwaanyị a na-eme ka nne ya!”+ 45  Ọ bụ nne gị,+ bụ́ nwaanyị nke kpọrọ di+ ya na ụmụ ya asị, mụrụ gị. Ị bụkwa nwanne ụmụnne gị ndị nwaanyị, bụ́ ndị kpọrọ di ha na ụmụ ha asị. Unu ndị inyom, nne unu bụ onye Het,+ nna unu bụkwa onye Amọraịt.’”+ 46  “‘Nwanne gị nwaanyị nke tọrọ gị bụ Sameria+ na obodo nta ya niile,+ bụ́ onye bi n’akụkụ aka ekpe gị. Nwanne gị nwaanyị nke ị tọrọ, bụ́ onye bi n’akụkụ aka nri gị, bụ Sọdọm+ na obodo nta ya niile.+ 47  Ọ bụghị naanị na i jere ije n’ụzọ ha, ọ bụghịkwa naanị na i mere ihe arụ ha mere,+ kama nwa mgbe nta, ị malitere ọbụna ime omume na-eweta mbibi n’ụzọ gị niile karịa ka ha mere.+ 48  Dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Sọdọm nwanne gị nwaanyị, ya na obodo nta ya niile, emeghị dị ka ihe niile i mere si dị, gị na obodo nta gị niile.+ 49  Lee! Nke a bụ njehie Sọdọm bụ́ nwanne gị nwaanyị: Ya na obodo nta ya niile+ dị mpako,+ nweekwa nri zuuru ha,+ ha enweghị nchegbu+ n’ihi na ha nọ jụụ, o meghịkwa ka aka onye nọ n’ahụhụ+ na ogbenye dị ike.+ 50  Ha wee na-adị mpako+ ma na-eme ihe arụ n’ihu m.+ M wee kpochapụ ha n’ikpeazụ, dị ka o si zie ezi n’anya m.+ 51  “‘Ma Sameria+ emerughị ọbụna ọkara mmehie i mere, ma ị nọ na-eme ihe arụ dị ukwuu karịa nke ha mere. I wee mee ka ụmụnne gị ndị nwaanyị yie ndị ezi omume n’ihi ihe arụ niile ị nọ na-eme.+ 52  Ọ bụkwa gị ka a ga-emechu ihu mgbe ị ga-agbachitere ụmụnne gị ndị nwaanyị. Ha bụ ndị ezi omume karịa gị n’ihi mmehie gị niile ndị rụrụ arụ karịa nke ha mere.+ Ọ bụkwa gị ka ihere ga-eme, a ga-emechukwa gị ihu n’ihi na i mere ka ụmụnne gị ndị nwaanyị yie ndị ezi omume.’ 53  “‘M ga-akpọkọta ndị ha a dọọrọ n’agha,+ ndị e si na Sọdọm na obodo nta ya niile dọrọ n’agha, na ndị e si na Sameria na obodo nta ya niile dọrọ n’agha; m ga-akpọkọtakwa ndị gị niile a dọọrọ n’agha, ndị nọ n’etiti ha,+ 54  ka i wee bụrụ onye e mechuru ihu;+ ihere ga-emekwa gị n’ihi ihe niile i mere, n’ihi na ị kasiri ha obi.+ 55  Ụmụnne gị ndị nwaanyị, bụ́ Sọdọm na obodo nta ya niile, ga-adịghachi otú ha dị na mbụ. Sameria na obodo nta ya niile ga-adịghachikwa otú ha dị na mbụ. Gị onwe gị na obodo nta gị niile ga-adịghachikwa otú unu dị na mbụ.+ 56  E kwesịghị ịnụ ihe ọ bụla banyere Sọdọm bụ́ nwanne gị nwaanyị n’ọnụ gị n’ụbọchị ị dị mpako,+ 57  tupu e kpughee ihe ọjọọ gị,+ dị ka e mere mgbe obodo ndị dị na Siria+ na obodo niile gbara ya gburugburu, ya bụ, obodo ndị dị na Filistia,+ bụ́ ndị na-akwa gị emo n’akụkụ niile, kọchara gị.+ 58  Gị onwe gị ga-eburu+ omume gị rụrụ arụ+ na ihe arụ gị,’ ka Jehova kwuru.” 59  “N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Mụ onwe m ga-emekwa gị ihe i mere,+ n’ihi na i ledara iyi ị ṅụrụ anya site n’imebi ọgbụgba ndụ m.+ 60  Ma mụ onwe m ga-echeta ndụ mụ na gị gbara n’oge ị bụ nwa agbọghọ.+ M ga-emekwa ka ọgbụgba ndụ nke na-adịru mgbe ebighị ebi+ guzosiere gị ike. 61  Ị ga-echetakwa ụzọ gị niile,+ ihere ga-emekwa gị mgbe ị nabatara ụmụnne gị ndị nwaanyị, ma ndị tọrọ gị ma ndị ị tọrọ. M ga-akpọrọkwa ha kpọnye gị ka ha bụrụ ụmụ gị,+ ma ọ bụghị n’ihi ọgbụgba ndụ gị.’+ 62  “‘Mụ onwe m ga-eme ka ndụ mụ na gị gbara guzosie ike;+ ị ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova, 63  ka i wee cheta, ka ihere wee meekwa gị,+ ka ị ghara inwekwa ihe ọ bụla ga-eme ka i meghee ọnụ gị+ n’ihi ihere i menyere onwe gị, mgbe m ga-ekpuchiri gị mmehie+ n’ihi ihe niile i mere,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.
Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “ime ka ha gabiga n’ọkụ.”