Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ezikiel 14:1-23

14  Ụfọdụ n’ime ndị okenye Izrel wee bịakwute m ma nọrọ ọdụ n’ihu m.+  Okwu Jehova wee ruo m ntị, sị:  “Nwa nke mmadụ, obi ndị ikom ndị a dị n’arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị, ihe ịsụ ngọngọ nke na-eme ka ha jehie ka ha debere n’ihu ha.+ M̀ ga-ekwe ka ha jụta m ihe ọ bụla?+  Ya mere, gwa ha okwu, ị ga-asịkwa ha, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Onye ọ bụla nke si n’ụlọ Izrel nke obi ya dị n’arụsị ya nke na-asọ oyi ka nsị,+ onye debekwara ihe ịsụ ngọngọ nke na-akpatara ya njehie n’ihu ya, onye na-abịakwutekwa onye amụma, mụ onwe m, Jehova, ga-aza ya okwu dị ka arụsị ya ndị na-asọ oyi ka nsị si dị ọtụtụ,+  iji jide ụlọ Izrel site n’ime ka obi ha tụọ egwu,+ n’ihi na arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị emeela ka ha hapụ m, ha niile.”’+  “Ya mere, sị ụlọ Izrel, ‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Lọghachinụ, sinụ n’arụsị unu ndị na-asọ oyi ka nsị chigharịa,+ wepụkwanụ ihu unu n’ihe arụ unu niile;+  n’ihi na onye ọ bụla nke si n’ụlọ Izrel ma ọ bụ onye mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’Izrel, nke hapụrụ iso m,+ onye obi ya dị n’arụsị ya nke na-asọ oyi ka nsị, onye debekwara ihe ịsụ ngọngọ nke na-akpatara ya njehie n’ihu ya, onye na-abịakwutekwa onye amụma ka ọ jụta ihe m ga-ekwu,+ mụ onwe m, Jehova, ga-aza ya okwu.  M ga-eche ihu ime onye ahụ ihe,+ meekwa ka ọ bụrụ ihe ịrịba ama+ na ihe e ji atụ ilu.+ M ga-ebipụkwa ya n’etiti ndị m;+ unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.”’+  “‘Ma ọ bụrụ na a ghọgbuo onye amụma, o wee kwuo ihe ọ bụla, ọ bụ mụ onwe m, Jehova, ghọgburu onye amụma ahụ;+ m ga-esetịkwa aka m mee ya ihe wee laa ya n’iyi n’etiti ndị m Izrel.+ 10  Ha ga-eburukwa njehie ha.+ Njehie nke onye na-ajụ ase na njehie nke onye amụma ga-abụ otu ihe,+ 11  ka ndị ụlọ Izrel wee ghara isi n’iso m kpafuo ọzọ,+ gharakwa iji mmebi iwu ha niile na-emerụ onwe ha. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”+ 12  Okwu Jehova wee ruo m ntị ọzọ, sị: 13  “Nwa nke mmadụ, ọ bụrụ na ala emehie m site n’ime omume ekwesịghị ntụkwasị obi,+ m ga-esetị aka m mee ya ihe, gbajisịa mkpara o ji ekonye achịcha,+ m ga-emekwa ka o nwee ụnwụ,+ bipụkwa mmadụ na anụ ụlọ na ya.”+ 14  “‘Ọ bụrụgodị na ndị ikom atọ a, Noa,+ Daniel+ na Job,+ nọ n’ime ya, ha ga-anapụta mkpụrụ obi nke ha n’ihi ezi omume ha,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”+ 15  “‘Ma ọ bụ, ọ bụrụ na mụ emee ka ajọ anụ ọhịa banye n’ala ahụ+ wee gbawa ya aka ụmụ,+ ala ahụ ewee ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu nke na-enweghị onye na-esi na ya agafe n’ihi anụ ọhịa,+ 16  ọ bụrụgodị na ndị ikom atọ a anọrọ n’ime ya, dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘ha agaghị anapụta ụmụ ndị ikom ma ọ bụ ụmụ ndị inyom; ọ bụ naanị ha ka a ga-anapụta, ala ahụ ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ n’efu.’”+ 17  “‘Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ bụ mma agha ka m mere ka ọ bịakwasị ala ahụ,+ ọ bụrụkwa na mụ asị: “Ka mma agha banye n’ala a,” ọ bụrụkwa na mụ ebipụ mmadụ na anụ ụlọ na ya,+ 18  ọ bụrụgodị na ndị ikom atọ a anọrọ n’ime ya,+ dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘ha agaghị anapụta ma ụmụ ndị ikom ma ụmụ ndị inyom, kama ọ bụ naanị ha ka a ga-anapụta.’”+ 19  “‘Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ bụ ọrịa na-efe efe ka m mere ka ọ bịakwasị ala ahụ,+ ọ bụrụkwa na mụ awụkwasị ya ọnụma m, nke ga-akpata ịwụfu ọbara,+ iji bipụ mmadụ na anụ ụlọ na ya, 20  ọ bụrụgodị na Noa,+ Daniel+ na Job+ anọrọ n’ime ya,+ dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘ha agaghị anapụta nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwaanyị; ha onwe ha ga-anapụta mkpụrụ obi nke ha n’ihi ezi omume ha.’”+ 21  “N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Otú ahụkwa ka ọ ga-adị mgbe m ga-eweta ihe anọ dị oké egwu m ga-eji kpee ikpe,+ mma agha na ụnwụ na ajọ anụ ọhịa na ọrịa na-efe efe,+ bụ́ ndị m ga-eme ka ha bịakwasị Jeruselem iji bipụ mmadụ na anụ ụlọ nọ n’ime ya.+ 22  Ma, lee! ndị lanahụrụ alanahụ, bụ́ ndị a ga-akpọpụta, ga-afọdụ na ya.+ Ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, lee ha! Ha na-apụta ịbịakwute unu, unu ga-ahụkwa ụzọ ha na omume ha.+ A ga-akasikwa unu obi maka ọdachi nke m ga-emeworị ka ọ dakwasị Jeruselem, bụ́ ihe niile m ga-emeworị ka ọ dakwasị ya.’” 23  “‘Ha ga-akasikwa unu obi mgbe unu hụrụ ụzọ ha na omume ha; unu ga-amarakwa na o nwere ihe mere m ji mee ya ihe niile m mere ya,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji