Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ekliziastis 7:1-29

7  Ezi aha dị mma karịa ezigbo mmanụ,+ ụbọchị ọnwụ mmadụ dịkwa mma karịa ụbọchị a mụrụ ya.+  Ọ dị mma ịga n’ụlọ iru uju karịa ịga n’ụlọ oriri,+ n’ihi na nke ahụ bụ njedebe mmadụ niile; onye dị ndụ kwesịkwara iburu ya n’obi.  Inwe mwute dị mma karịa ịchị ọchị,+ n’ihi na site n’inwe mgbarụ ihu, obi na-adị mmadụ mma karị.+  Obi ndị maara ihe na-adị n’ụlọ iru uju,+ ma obi ndị nzuzu na-adị n’ụlọ ịṅụrị ọṅụ.+  Ọ dị mma ige ntị n’ịba mba nke onye maara ihe+ karịa mmadụ ige ntị n’abụ ndị nzuzu.+  N’ihi na dị ka ogwu si ada mgbe ọ na-ere ọkụ n’okpuru ite, otú ahụ ka ọchị onye nzuzu si ada;+ nke a kwa bụ ihe efu.  N’ihi na mmegbu pụrụ ime ka onye maara ihe na-eme ara ara,+ onyinye+ pụkwara imebi obi.+  Njedebe okwu dị mma karịa mmalite ya.+ Onye nwere ndidi ka onye mmụọ ya dị mpako mma.+  Adịla ngwa ná mmụọ gị ịbụ onye a kpasuru iwe,+ n’ihi na iwe iwe bụ ihe na-adịgide n’obi ndị nzuzu.+ 10  Asịla: “Gịnị mere oge gara aga ji dị mma karịa oge a?”+ n’ihi na ọ bụghị amamihe+ ka i ji jụọ ihe a. 11  Amamihe dị mma, ya na ihe nketa, ọ bakwaara ndị na-ahụ anyanwụ uru.+ 12  N’ihi na amamihe bụ ihe nchebe,+ dịkwa ka ego bụ ihe nchebe;+ ma ihe ihe ọmụma ji ka mma bụ na amamihe na-echebe ndị nwe ya ndụ.+ 13  Lee ọrụ+ ezi Chineke, n’ihi na ònye nwere ike ịgbatị ihe o meworo ka ọ gbagọọ agbagọ?+ 14  N’ụbọchị ihe dị mma, ṅụrịa ọṅụ,+ n’ụbọchị ọdachi, mara na ezi Chineke mere nke a kpọmkwem dị ka o mere nke ọzọ,+ ka ụmụ mmadụ wee ghara ịchọpụta ma ọlị ihe ọ bụla ga-eme mgbe ha na-anọkwaghị.+ 15  Ahụwo m ihe niile n’ụbọchị ndụ m nke bụ́ ihe efu.+ E nwere onye ezi omume nke na-ala n’iyi n’ezi omume ya.+ E nwekwara onye ajọ omume nke na-adị ogologo ndụ n’ajọ omume ya.+ 16  Abụla onye ezi omume gabiga ókè,+ egosikwala na ị bụ onye maara ihe gabiga ókè.+ Gịnị mere ị ga-eji kpatara onwe gị mbibi?+ 17  Abụla onye ajọ omume gabiga ókè,+ abụkwala onye nzuzu.+ Gịnị mere ị ga-eji nwụọ mgbe oge gị na-erubeghị?+ 18  Ọ ka mma ka i jidesie nke a ike, ma ewepụkwala aka na nke ọzọ;+ n’ihi na onye na-atụ egwu Chineke ga-alafere site n’ịgbaso ha niile.+ 19  Amamihe dị ike nye onye maara ihe karịa ndị ikom iri na-achị achị bụ́ ndị nọ n’otu obodo.+ 20  N’ihi na e nweghị onye ezi omume n’ụwa nke na-eme naanị ezi ihe, nke na-adịghịkwa emehie.+ 21  Etinyekwala obi gị n’okwu niile ndị mmadụ pụrụ ikwu,+ ka ị ghara ịnụ ka onye na-ejere gị ozi na-akọcha gị.+ 22  N’ihi na obi gị maara nke ọma na ọbụna gị onwe gị akọchawo ndị ọzọ ọtụtụ ugboro.+ 23  Ihe a dum ka m jiworo amamihe nwalee. Asịrị m: “M ga-enwe amamihe.” Ma ọ dị anya n’ebe m nọ.+ 24  Ihe dị adị dị anya, dịkwa oké omimi. Ònye pụrụ ịchọpụta ya?+ 25  Mụ onwe m wee tụgharịa, ọbụna obi m tụgharịrị,+ ịmata na inyocha na ịchọ amamihe+ na ihe mere ihe dị iche iche ji na-eme,+ na ịmata ịdị njọ nke nzuzu, matakwa nzuzu dị n’ịda iberiibe;+ 26  ihe m chọpụtara bụ: Nwaanyị nke bụ́ ụgbụ e ji achụ nta, onye obi ya bụ ụgbụ azụ̀, onye aka ya bụkwa ịgà,+ dị ilu karịa ọnwụ.+ Ọ bụrụ na mmadụ agbanahụ ya, onye ahụ bụ ezi mmadụ n’ihu ezi Chineke, ma ọ bụrụ na ọ nwụde mmadụ,+ onye ahụ bụ onye mmehie. 27  “Lee! Nke a ka m chọpụtara,” ka onye mkpọkọta kwuru,+ “mgbe m tụlesịrị ihe niile iji mata isi ha,+ 28  bụ́ nke mkpụrụ obi m nọ na-achọ, ma achọtabeghị m ya. Achọtawo m otu nwoke ziri ezi n’ime otu puku mmadụ,+ ma ọ dịghị otu nwaanyị m chọtara n’ime ha niile.+ 29  Lee! Naanị nke a ka m chọpụtara, na ụmụ mmadụ ziri ezi+ mgbe ezi Chineke kere ha, ma ha onwe ha echepụtawo ọtụtụ atụmatụ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji