Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ekliziastis 5:1-20

5  Chee ụkwụ+ gị nche mgbe ọ bụla ị gara n’ụlọ ezi Chineke; garuo nso ka i gee ntị,+ kama ịchụ àjà dị ka ndị nzuzu,+ n’ihi na ha adịghị ama na ha na-eme ihe ọjọọ.+  Adịla ngwa ikwu okwu; ekwekwala ka obi gị+ dị ngwa ikwu okwu n’ihu ezi Chineke.+ N’ihi na ezi Chineke nọ n’eluigwe+ ma gị onwe gị nọ n’ụwa. Ọ bụ ya mere okwu gị kwesịrị iji dị ole na ole.+  N’ihi na ọ bụ uche ịdị n’ọtụtụ ihe na-akpata ịrọ nrọ,+ ọ bụkwa ọtụtụ okwu+ na-eme ka a nụ olu onye nzuzu.  Mgbe ọ bụla i kwere Chineke nkwa, egbula oge imezu ya,+ n’ihi na ihe ndị nzuzu+ adịghị atọ ya ụtọ. Ihe i kwere ná nkwa, mezuo ya.+  Ọ dị mma na i kweghị nkwa+ karịa na i kwere nkwa ma ghara imezu ya.+  Ekwela ka ọnụ gị mee ka anụ ahụ́ gị mehie,+ ekwukwala n’ihu mmụọ ozi+ na i mere ya n’amaghị ama.+ Gịnị mere okwu ọnụ gị ga-eji kpasuo ezi Chineke iwe, o wee laa ihe aka gị rụrụ n’iyi?+  N’ihi na ọ bụ uche ịdị n’ọtụtụ ihe na-akpata ịrọ nrọ,+ na-akpatakwa ọtụtụ ihe efu na ọtụtụ okwu. Ma, tụọ egwu ezi Chineke.+  Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-emegbu onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya, na ebe e ji aka ike na-ewepụ ikpe ziri ezi+ na ezi omume n’ógbè a na-achị achị, ya ejula gị anya,+ n’ihi na onye dị elu karịa onye ahụ dị elu+ na-ahụ ihe na-emenụ,+ e nwekwara ndị dị elu karịa ndị ahụ dị elu.  Ihe ala na-emepụtakwa bụ nke mmadụ niile a;+ a na-ejekwara eze ozi site n’ịkọ ugbo.+ 10  Ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ.+ Nke a kwa bụ ihe efu.+ 11  Mgbe ihe ọma dị ọtụtụ, ndị na-eri ya na-adịkwa ọtụtụ.+ Olee uru ọ baara onye nwe ya, ma ọ́ bụghị naanị ịnọ na-ele ya anya?+ 12  Ụra+ onye na-eje ozi na-atọ ya ụtọ, n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ ihe nta ma ọ bụ ihe ukwu ka o riri; ma ọtụtụ ihe onye ọgaranya nwere adịghị ekwe ya ka ọ rahụ ụra. 13  E nwere oké ọdachi m hụworo n’okpuru anyanwụ: akụ̀ onye nwere akụ̀ na-akpakọba na-ewetara ya ọdachi.+ 14  Akụ̀ ahụ alawokwa n’iyi+ n’ihi ọrụ ahụhụ, ọ mụwokwa nwa, mgbe ọ na-enweghị ihe dị ya n’aka ma ọlị.+ 15  Dị nnọọ ka mmadụ gba ọtọ si n’afọ nne ya pụta, ọtọ ka ọ ga-agbakwa laa,+ dị nnọọ ka ọ gba pụta; ọ dịghịkwa ihe ọ bụla mmadụ pụrụ iwere laa,+ ọ dịghị ihe ọ pụrụ iji laa n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya. 16  Nke a kwa bụ oké ọdachi: kpọmkwem otú mmadụ dị pụta, otú ahụ ka ọ ga-adị laa; oleekwa uru ọ baara onye nọ na-arụsi ọrụ ike n’ịchụso ifufe?+ 17  Ọ nọkwa n’ọchịchịrị na-eri ihe n’ụbọchị ya niile n’oké mwute,+ na-arịa ọrịa, nọrọkwa n’oké iwe. 18  Lee! Ihe kasị mma mụ onwe m hụworo, nke bụ́ ihe mara mma, bụ ka mmadụ rie ihe, ṅụọ ihe ọṅụṅụ ma hụ ihe ọma n’ihi ọrụ niile ọ gbalịsiri ike+ na-arụ n’okpuru anyanwụ n’ụbọchị niile nke ndụ ya nke ezi Chineke nyere ya, n’ihi na nke ahụ bụ òkè ya. 19  Onye ọ bụla ezi Chineke nyewokwara akụ̀ na ihe onwunwe,+ o mewokwa ka o nwee ike iri ya+ na iwere ihe bụ́ òkè ya, na ịṅụrị ọṅụ n’ịrụsi ọrụ ike ya.+ Nke a bụ onyinye Chineke.+ 20  N’ihi na ọ gaghị echeta ụbọchị ndụ ya mgbe niile, n’ihi na ezi Chineke na-eme ka obi ya jupụta n’aṅụrị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji