Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Daniel 3:1-30

3  Nebukadneza bụ́ eze kpụrụ ihe oyiyi+ ọlaedo nke ịdị elu ya dị kubit iri isii, obosara ya dịkwa kubit isii. O guzobere ya na mbara ala Dura, n’ógbè Babịlọn a na-achị achị.+  Nebukadneza ziri ozi dị ka eze ka a kpọkọta ndị setrap, ndị prifekt,+ ndị gọvanọ, ndị ndụmọdụ, ndị na-echekwa akụ̀, ndị ikpe, ndị uwe ojii,+ na ndị niile na-elekọta ógbè dị iche iche a na-achị achị ka ha bịa maka ememme imeghe+ ihe oyiyi ahụ Nebukadneza bụ́ eze guzobere.  N’oge ahụ, ndị setrap,+ ndị prifekt na ndị gọvanọ, ndị ndụmọdụ, ndị na-echekwa akụ̀, ndị ikpe, ndị uwe ojii, na ndị niile na-elekọta ógbè dị iche iche a na-achị achị zukọtara maka ememme imeghe ihe oyiyi ahụ nke Nebukadneza bụ́ eze guzobere, ha guzokwa n’ihu ihe oyiyi ahụ nke Nebukadneza guzobere.  Onye na-akpọsa ozi+ jikwa olu dara ụda na-akpọsa, sị: “Ọ bụ unu, ndị dị iche iche, ndị mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche ka a na-agwa,+  na mgbe unu nụrụ ụda opi, obere ọjà, ụbọ zita, une, ụbọ akwara, nnukwu ọjà, na ụdị ngwá egwú dị iche iche,+ daanụ n’ala kpọọrọ ihe oyiyi ọlaedo ahụ Nebukadneza bụ́ eze guzobere isiala.  Onye ọ bụla nke na-adaghị n’ala kpọọ isiala,+ a ga-atụba ya ozugbo+ n’oké ọkụ a kwanyere.”+  N’ihi nke a, ozugbo mmadụ niile nụrụ ụda opi, obere ọjà, ụbọ zita, une, ụbọ akwara, na ụdị ngwá egwú dị iche iche, mmadụ niile,+ ndị mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche dara n’ala kpọọrọ ihe oyiyi ọlaedo ahụ Nebukadneza bụ́ eze guzobere isiala.  N’ihi nke a, ụfọdụ ndị Kaldia bịara wee bo ndị Juu ebubo n’otu oge ahụ.+  Ha gwara Nebukadneza bụ́ eze, sị: “Eze, ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.+ 10  Gị onwe gị, eze, nyere iwu na onye ọ bụla nke nụrụ ụda opi, obere ọjà, ụbọ zita, une, ụbọ akwara, nnukwu ọjà, na ụdị ngwá egwú dị iche iche,+ ga-ada n’ala kpọọrọ ihe oyiyi ọlaedo ahụ isiala; 11  nakwa na onye ọ bụla nke na-adaghị n’ala kpọọ isiala, a ga-atụba ya n’oké ọkụ ahụ a kwanyere.+ 12  E nwere ndị Juu ị họpụtara ka ha na-elekọta ógbè Babịlọn a na-achị achị,+ bụ́ Shedrak, Mishak na Abednego; ndị ikom a enyeghị gị nsọpụrụ, eze, ha adịghị efe chi gị dị iche iche ofufe, ha achọghịkwa ịkpọrọ ihe oyiyi ọlaedo ahụ i guzobere isiala.”+ 13  Mgbe ahụ, Nebukadneza ji iwe na ọnụma+ kwuo ka a kpọta Shedrak, Mishak na Abednego.+ E wee kpọta ndị ikom a n’ihu eze. 14  Nebukadneza wee sị ha: “Ọ̀ bụ eziokwu, Shedrak, Mishak na Abednego, na unu adịghị efe chi m dị iche iche ofufe,+ nakwa na unu akpọrọghị ihe oyiyi ọlaedo m guzobere isiala?+ 15  Ọ bụrụ na unu dị njikere ugbu a ịda n’ala kpọọrọ ihe oyiyi ahụ m mere isiala, mgbe unu nụrụ ụda opi, obere ọjà, ụbọ zita, une, ụbọ akwara, nnukwu ọjà na ụdị ngwá egwú dị iche iche,+ ọ dị mma. Ma ọ bụrụ na unu akpọrọghị ya isiala, a ga-atụba unu ozugbo n’oké ọkụ ahụ a kwanyere. Olee chi ga-anapụtali unu n’aka m?”+ 16  Shedrak, Mishak na Abednego wee sị eze: “Nebukadneza, ọ dịghị mkpa ka anyị zaa gị ihe ọ bụla n’okwu a.+ 17  Ọ bụrụ na a tụba anyị n’ime ya, Chineke anyị bụ́ onye anyị na-efe ofufe ga-anapụtali anyị. Ọ ga-anapụta anyị n’oké ọkụ ahụ a kwanyere, napụtakwa anyị n’aka gị, eze.+ 18  Ọ bụrụgodị na ọ gaghị anapụta anyị, mara amara, eze, na anyị agaghị efe chi gị dị iche iche, anyị agaghịkwa akpọrọ ihe oyiyi ọlaedo ahụ i guzobere isiala.”+ 19  Iwe wee ju Nebukadneza obi, ihu ya wee gbarụọ n’ihi Shedrak, Mishak na Abednego. O wee kwuo ka e mee ka oké ọkụ ahụ a kwanyere dịkwuo ọkụ okpukpu asaa karịa ka a na-emebu ka ọ dị ọkụ. 20  Ọ gwakwara ndị dimkpa ụfọdụ dị ike,+ bụ́ ndị so ná ndị agha ya, ka ha kee Shedrak, Mishak na Abednego agbụ, iji tụba ha n’oké ọkụ ahụ a kwanyere.+ 21  E wee kee ndị ikom ahụ agbụ n’eyipụghị ha ákwà mgbokwasị ha, uwe mwụda ha na okpu ha na ihe ndị ọzọ ha yi, wee tụba ha n’oké ọkụ ahụ a kwanyere. 22  Ebe ọ bụ na ihe eze kwuru ka e mee abụghị obere okwu, ebe ọ bụ na e mekwara ka oké ọkụ ahụ a kwanyere dị ọkụ gabiga ókè, ọ bụ ndị dimkpa ahụ ndị kpụụrụ Shedrak, Mishak na Abednego ka ire ọkụ ahụ regburu. 23  Ma ndị ikom ndị ọzọ ahụ, ha atọ, Shedrak, Mishak na Abednego, bu agbụ ahụ e kere ha daba n’oké ọkụ ahụ a kwanyere.+ 24  Ụjọ wee jide Nebukadneza bụ́ eze, o wee bilie n’ike. O wee gwa ndị na-ejere ya ozi, bụ́ ndị ọkwá ha dị elu, sị: “Ọ́ bụghị ndị ikom atọ ka anyị kere agbụ tụba n’ime ọkụ?”+ Ha wee sị eze: “Ee, Eze.” 25  O wee sị: “Lee! M na-ahụ ndị ikom anọ ka ha na-ejegharịrị onwe ha n’ime ọkụ ahụ, ọkụ adịghịkwa ere ha, onye nke anọ yiri chi.”+ 26  Nebukadneza wee bịaruo nso n’ọnụ ụzọ ebe a kwanyere oké ọkụ ahụ.+ O wee sị: “Shedrak, Mishak na Abednego, unu ndị ohu Chineke bụ́ Onye Kasị Elu,+ pụtanụ bịa n’ebe a!” Shedrak, Mishak na Abednego wee si n’ime ọkụ ahụ pụta. 27  Ndị setrap, ndị prifekt na ndị gọvanọ na ndị na-ejere eze ozi, bụ́ ndị ọkwá ha dị elu,+ bụ́ ndị zukọtaranụ, wee hụ ndị ikom ndị a, na ọkụ ahụ emeghị ha ihe ọ bụla n’ahụ́,+ o reghịkwa ọbụna otu mkpụrụ ntutu dị ha n’isi,+ ọbụna ákwà mgbokwasị ha agbanweghị, ha esighịkwa anwụrụ ọkụ anwụrụ ọkụ. 28  Nebukadneza wee sị: “Ka Chineke Shedrak, Mishak na Abednego bụrụ onye a gọziri agọzi,+ bụ́ onye zitere mmụọ ozi ya+ wee napụta ndị ohu ya bụ́ ndị tụkwasịrị ya obi,+ ndị nupụkwara isi n’okwu eze wee kwere ọnwụ, n’ihi na ha jụrụ ife+ chi ọ bụla ma ọ bụ ịkpọrọ ya isiala+ ma e wezụga Chineke ha.+ 29  M na-etikwa iwu,+ na ndị ọ bụla, mba ọ bụla ma ọ bụ ndị na-asụ asụsụ ọ bụla nke kwuru ihe ọ bụla dị njọ banyere Chineke Shedrak, Mishak na Abednego, a ga-abọkasị ha,+ meekwa ka ụlọ ha ghọọ ebe ọha mmadụ ga na-aga mposi;+ n’ihi na e nweghị chi ọzọ nwere ike ịnapụta mmadụ dị ka nke a.”+ 30  N’oge ahụ, eze mere ka ihe na-agaziri Shedrak, Mishak na Abednego n’ógbè Babịlọn a na-achị achị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji