Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Rom 3:1-31

3  Gịnịzi ka onye Juu ji ka mma,+ ma ọ bụ, olee uru ibi úgwù bara?+  Ọ bara uru nke ukwuu n’ụzọ ọ bụla. Nke mbụ, n’ihi na ọ bụ ha ka e nyefere okwu dị nsọ nke Chineke n’aka.+  Ọ̀ bụzi ka gịnị mee? Ọ bụrụ na ụfọdụ egosighị okwukwe,+ enweghị okwukwe ha ọ̀ ga-eme, ma eleghị anya, ka ikwesị ntụkwasị obi+ nke Chineke ghara ịdị irè?+  Tụfịakwa! Kama ka Chineke bụrụ onye eziokwu,+ ọ bụ ezie na mmadụ niile bụ ndị ụgha,+ ọbụna dị ka e dere, sị: “Ka e wee gosi na ị bụ onye ezi omume n’okwu gị, ka i wee merie mgbe a na-ekpe gị ikpe.”+  Otú ọ dị, ọ bụrụ na ajọ omume anyị emee ka ezi omume nke Chineke+ pụta ìhè, gịnị ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ̀ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi+ mgbe ọ na-egosi ọnụma ya? (Ana m ekwu dị ka mmadụ.+)  Tụfịakwa! Ma ọ́ bụghị otú ahụ, olee otú Chineke ga-esi kpee ụwa ikpe?+  Ma ọ bụrụ na e si n’okwu ụgha m mee ka a mara eziokwu nke Chineke+ nke ọma karị, wee nye ya otuto, gịnị mere a ka jikwa na-ama m ikpe na m bụ onye mmehie?+  Gịnị mere na anyị agaghị asị, dị nnọọ ka a na-ebo anyị ebubo ụgha,+ dịkwa nnọọ ka ụfọdụ ndị na-asị na anyị na-ekwu: “Ka anyị mee ihe ọjọọ ka ihe ọma wee bịa”?+ Ikpe+ a mara ndị ahụ bụ ikpe ziri ezi.+  Ọ̀ bụ ka gịnị mee? Ànyị ka ha mma?+ Ọ dịghị ma ọlị! N’ihi na anyị ekwuwo na mbụ na ndị Juu na ndị Grik nọcha n’okpuru mmehie;+ 10  dị nnọọ ka e dere, sị: “Ọ dịghị onye ezi omume dịnụ, ọbụnadị otu onye;+ 11  ọ dịghị onye nwere nghọta ọ bụla, ọ dịghị onye na-achọ Chineke.+ 12  Mmadụ niile agahiewo, ha niile aghọwo ndị na-abaghị uru; ọ dịghị onye nwere obiọma, e nweghị ọbụna otu onye.”+ 13  “Akpịrị ha bụ ili e meghere emeghe, ha ejiriwo ire ha ghọọ aghụghọ.”+ “Nsí agwọ dị n’okpuru egbugbere ọnụ ha.”+ 14  “Ọnụ ha jupụtakwara n’ịbụ ọnụ na okwu ọjọọ.”+ 15  “Ụkwụ ha dị ngwa ịwụfu ọbara.”+ 16  “Mbibi na nhụsianya dị n’ụzọ ha,+ 17  ha amaghịkwa ụzọ udo.”+ 18  “Ha adịghị atụ egwu Chineke.”+ 19  Ma anyị maara na ihe niile Iwu+ ahụ na-ekwu, ọ bụ ndị nọ n’okpuru Iwu ahụ ka ọ na-agwa, ka e wee mechie ọnụ niile,+ ka Chineke wee nye ụwa dum+ ntaramahụhụ.+ 20  Ya mere, a gaghị esi n’ọrụ nke iwu kpọọ anụ ahụ́ ọ bụla onye ezi omume+ n’ihu ya, n’ihi na ọ bụ iwu+ na-eme ka a mata nke ọma ihe bụ́ mmehie.+ 21  Ma ugbu a, e mewo ka ọ pụta ìhè na mmadụ pụrụ ịbụ onye ezi omume n’ihu Chineke+ n’adabereghị n’iwu, dị ka Iwu+ ahụ na Akwụkwọ Ndị Amụma+ na-agba àmà ya;+ 22  ee, mmadụ pụrụ ịbụ onye ezi omume n’ihu Chineke site n’inwe okwukwe n’ebe Jizọs Kraịst nọ,+ ya bụ, ndị niile nwere okwukwe.+ N’ihi na ọ dịghị ihe dị iche.+ 23  N’ihi na mmadụ niile emehiewo,+ ha adịghịkwa eru ebube Chineke,+ 24  a na-akpọkwa ha ndị ezi omume,+ nke bụ́ onyinye e nyere n’efu,+ site n’obiọma ya na-erughịrị mmadụ site ná ntọhapụ nke si n’ihe mgbapụta+ ahụ Kraịst Jizọs kwụrụ. 25  Chineke wepụtara ya dị ka àjà ime udo;+ udo a na-abịa site n’inwe okwukwe n’ọbara ya.+ Nke a bụ iji gosi ezi omume nke ya, n’ihi na ọ na-agbaghara mmehie+ ndị e mere n’oge gara aga mgbe Chineke nọ na-enwe ndidi;+ 26  iji gosi ezi omume nke ya n’oge a a kara aka, ka o wee bụrụ onye ezi omume+ ọbụna mgbe ọ na-akpọ onye nwere okwukwe n’ebe Jizọs nọ onye ezi omume.+ 27  Ọ̀ dị ihe mere anyị ga-eji na-anya isi?+ Ọ dịghị. Olee iwu mere ka ọ dị otú a?+ Ọ̀ bụ iwu nke ọrụ?+ Ọ dịghị ma ọlị, kama ọ bụ iwu nke okwukwe.+ 28  N’ihi na anyị na-ewere ya na a na-akpọ mmadụ onye ezi omume site n’okwukwe nke na-agụnyeghị ọrụ nke iwu.+ 29  Ka ọ̀ bụ Chineke nke naanị ndị Juu?+ Ọ́ bụghịkwa nke ndị mba ọzọ?+ Ee, ọ bụkwa nke ndị mba ọzọ,+ 30  ma ọ bụrụ n’ezie na Chineke bụ otu,+ bụ́ onye ga-akpọ ndị e biri úgwù+ ndị ezi omume n’ihi okwukwe, kpọọkwa ndị a na-ebighị úgwù+ ndị ezi omume site n’okwukwe ha. 31  Ànyị ga-esitezi n’okwukwe anyị mee ka iwu ghara ịdị?+ Tụfịakwa! Kama nke ahụ, anyị na-eme ka iwu guzosie ike.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji