Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Rom 15:1-33

15  Ma anyị ndị siri ike kwesịrị iburu adịghị ike nke ndị na-esighị ike,+ ọ bụghịkwa ịdị na-eme ihe na-amasị anyị onwe anyị.+  Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-eme ihe na-amasị onye agbata obi ya n’ihe dị mma maka iwuli ya elu.+  N’ihi na ọbụna Kraịst emeghị ihe masịrị onwe ya;+ kama dị nnọọ ka e dere, sị: “Nkọcha nke ndị na-akọcha gị adakwasịwo m.”+  N’ihi na ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere+ ha iji nye anyị ntụziaka,+ ka anyị wee site ná ntachi obi+ anyị na nkasi obi+ sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.+  Ma ka Chineke onye na-enye ntachi obi na nkasi obi mee ka unu nwee n’etiti onwe unu ụdị echiche+ ahụ Kraịst Jizọs nwere,  ka unu wee site n’otu obi+ jiri otu olu na-enye Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst otuto.  Ya mere, na-anabatanụ ibe unu,+ dị nnọọ ka Kraịst nabatara anyị,+ ka e wee nye Chineke otuto.  N’ihi na ana m asị na Kraịst ghọrọ n’ezie onye na-ejere+ ndị e biri úgwù+ ozi iji gosi na Chineke na-ekwu eziokwu,+ na nkwa niile o kwere ndị nna nna ha bụkwa eziokwu,+  nakwa ka ndị mba ọzọ+ wee nye Chineke otuto maka ebere ya.+ Dị nnọọ ka e dere, sị: “Ọ bụ ya mere m ga-eji kwupụta gị n’ihu ọha n’etiti ndị mba ọzọ, m ga-abụkwara aha gị abụ olu ụtọ.”+ 10  Ọ sịkwara: “Soronụ ndị ya nwee ọṅụ, unu ndị mba ọzọ.”+ 11  Ọ sịkwara: “Toonụ Jehova, unu ndị mba ọzọ niile, ka ndị niile tookwa ya.”+ 12  Aịzaya sịkwara: “A ga-enwe mgbọrọgwụ Jesi,+ a ga-enwekwa onye na-ebili ịchị mba niile;+ mba niile ga-enwe olileanya n’ebe ọ nọ.”+ 13  Ka Chineke onye na-enye olileanya mee ka unu jupụta n’ọṅụ niile na udo niile n’ihi na unu kwere ekwe, ka unu wee jupụta n’olileanya n’ike mmụọ nsọ.+ 14  E mewokwa ka mụ onwe m kweta banyere unu, ụmụnna m, na unu onwe unu jupụtakwara n’ịdị mma, ebe e meworo ka unu nwee ihe ọmụma zuru ezu,+ nakwa na unu pụkwara ịdụrịta ibe unu ọdụ.+ 15  Otú ọ dị, ana m edetara unu akwụkwọ banyere ihe ụfọdụ n’ezoghị ọnụ, dị ka ọ̀ bụ ichetara+ unu ihe ndị a ọzọ, n’ihi obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke nyere m+ 16  ka m wee bụrụ onye ozi Kraịst Jizọs nke na-ejere ọha mmadụ bụ́ ndị mba ọzọ ozi,+ na-arụ ọrụ dị nsọ nke ozi ọma+ banyere Chineke, ka àjà+ ahụ, ya bụ, ndị mba ọzọ a, wee bụrụ ihe dị ya mma,+ ebe e ji mmụọ nsọ na-edo ya nsọ.+ 17  Ya mere, enwere m ihe na-eme ka m nwee aṅụrị n’ime Kraịst Jizọs+ ma a bịa n’ozi m na-ejere Chineke.+ 18  N’ihi na agaghị m anwa anwa ikwu otu ihe ma ọ́ bụghị banyere ihe ndị ahụ Kraịst rụrụ site n’aka m+ ka ndị mba ọzọ wee rube isi,+ site n’okwu+ na omume m, 19  site n’ike nke ihe ịrịba ama na ihe ebube,+ site n’ike mmụọ nsọ; nke mere na, malite na Jeruselem+ gazuo Ilirikọm, ekwusawo m ozi ọma banyere Kraịst nke ọma.+ 20  N’ezie, n’ụzọ dị otú a, ekpebiri m na agaghị m ezisa ozi ọma n’ebe a kpọwororị Kraịst aha, ka m wee ghara ịdị na-ewukwasị ihe na ntọala nke onye ọzọ;+ 21  kama, dị nnọọ ka e dere, sị: “Ndị ọ na-adịghị ọkwa a maara ha banyere ya ga-ahụ ụzọ, ndị na-anụbeghịkwa ga-aghọta.”+ 22  Ya mere, e gbochikwara m ọtụtụ ugboro irute n’ebe unu nọ.+ 23  Ma ugbu a m na-enwekwaghị ókèala a na-akpabeghị aka n’ógbè ndị a, ebe ọ gụsiwokwara m agụụ ike ruo afọ ụfọdụ irute n’ebe unu nọ+ 24  mgbe ọ bụla m gawara Spen,+ enwekwara m olileanya ịhụ unu, nweekwa olileanya na unu ga-edupụtụ m,+ mgbe m bu ụzọ nwetatụ afọ ojuju n’ọnụnọ mụ na unu. 25  Ma ugbu a, achọwala m ịga Jeruselem ijere ndị nsọ ozi.+ 26  N’ihi na ọ masịrị ndị nọ na Masedonia na Akeya+ inye ndị ọzọ ihe ha site n’inye ndị dara ogbenye n’etiti ndị nsọ nọ na Jeruselem onyinye.+ 27  N’eziokwu, ọ masịrị ha ime otú ahụ, ma ha jikwa ha ụgwọ; n’ihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ eketawo òkè n’ihe ime mmụọ ha,+ ha jikwa ụgwọ iwere ihe anụ ahụ́ jeere ndị a ozi n’ihu ọha.+ 28  N’ihi ya, mgbe m mesịrị ihe a wee wegara ha mkpụrụ a+ n’enweghị ihe mere ya, m ga-abata na nke unu ma m gawa Spen.+ 29  Amakwaara m na mgbe m ga-abịakwute unu, m ga-eji ngọzi dị ukwuu nke si n’ebe Kraịst nọ bịa.+ 30  Eji m aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nakwa ịhụnanya nke sitere na mmụọ nsọ+ na-agba unu ume, ụmụnna m, ka unu soro m na-ekpekusi Chineke ekpere ike n’ihi m,+ 31  ka e wee napụta m+ n’aka ndị na-ekweghị ekwe na Judia, ka ozi m na-ejekwa maka Jeruselem+ wee bụrụ ihe dị ndị nsọ mma,+ 32  nke ga-eme na mgbe m ga-eji ọṅụ rute n’ebe unu nọ site n’uche Chineke, a ga-eme ka mụ na unu nweta ume.+ 33  Ka Chineke onye na-enye udo nọnyere unu niile.+ Amen.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji