Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Rom 12:1-21

12  Ya mere, ụmụnna m, eji m ọmịiko nke Chineke na-arịọsi unu ike ka unu nyefee Chineke ahụ́ unu+ dị ka àjà+ dị ndụ,+ dị nsọ,+ nke dị Chineke mma,+ ya bụ, ozi dị nsọ+ site n’ike iche echiche unu.+  Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka+ usoro ihe nke a si dị, kama gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ,+ ka unu wee chọpụta n’onwe unu+ ihe bụ́ uche+ Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.  N’ihi na site n’obiọma na-erughịrị mmadụ nke e nyere m, ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị iche;+ kama ka ọ na-eche echiche iji nwee uche zuru okè,+ onye ọ bụla dị ka+ okwukwe Chineke nyere ya si dị.+  N’ihi na dị nnọọ ka anyị nwere ọtụtụ akụkụ ahụ́ n’otu ahụ́,+ ma akụkụ ahụ́ ndị ahụ niile adịghị arụ otu ọrụ,  otú ahụ ka anyị onwe anyị bụ otu ahụ́+ n’ime Kraịst, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, ma bụrụ akụkụ ahụ́ ndị dịịrị ibe anyị n’otu n’otu.+  Ya mere, ebe anyị nwere onyinye dị iche iche+ dị ka obiọma na-erughịrị mmadụ+ nke e nyere anyị si dị, ọ bụrụ amụma ka anyị na-ebu, ka anyị na-ebu amụma dị ka okwukwe e kenyere anyị si dị;  ọ bụrụ ozi ka anyị na-eje, ka anyị nọgide n’ije ozi a;+ ọ bụrụ onye na-ezi ihe,+ ya nọgide n’izi ihe ya;+  ọ bụrụ onye na-enye ndụmọdụ, ya nọgide na ndụmọdụ ọ na-enye;+ onye na-ekesa ihe, ya jiri mmesapụ aka na-ekesa ya;+ onye na-edu ndú,+ ya jiri ezi ịdị ọkụ n’obi na-edu ndú; onye na-eme ebere,+ ya jiri mgbasapụ ihu na-eme ya.  Ka ịhụnanya+ unu ghara ịbụ nke ihu abụọ.+ Kpọọnụ ihe ọjọọ asị,+ jidesienụ ezi ihe ike.+ 10  N’ịhụnanya ụmụnna,+ na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ. N’inye ibe unu nsọpụrụ,+ na-ebutenụ ụzọ. 11  Unu adịla umengwụ n’ihe unu na-eme.+ Ka mmụọ Chineke mee ka unu na-anụ ọkụ n’obi.+ Bụrụnụ ndị ohu Jehova.+ 12  Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’olileanya ahụ.+ Na-atachinụ obi n’ime mkpagbu.+ Nọgidesienụ ike n’ekpere.+ 13  Na-enyenụ ndị nsọ ihe dị ka mkpa ha si dị.+ Na-elenụ ọbịa.+ 14  Na-agọzinụ ndị na-akpagbu unu;+ na-agọzinụ+ ndị mmadụ, unu abụkwala ha ọnụ.+ 15  Soronụ ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ;+ soronụ ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá. 16  Na-elenụ ndị ọzọ anya otú unu si ele onwe unu;+ ka uche unu ghara ịdị n’ihe ndị dị elu,+ kama ka ihe ndị dị ala na-eduzi unu.+ Unu abụla ndị nwere uche n’anya onwe unu.+ 17  Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.+ Na-emenụ ihe dị mma n’anya mmadụ niile. 18  Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.+ 19  Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ,+ kama nyenụ ọnụma ahụ ohere;+ n’ihi na e dere, sị: “Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru.”+ 20  Ma, “ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri; ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ;+ n’ihi na site n’ime nke a, ị ga-ekpokwasị icheku ọkụ n’isi ya.”+ 21  Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji