Ndị Kọlọsị 2:1-23
2 N’ihi na achọrọ m ka unu mata otú m si na-agbasi mgba ike,+ bụ́ nke m na-agba n’ihi ọdịmma unu nakwa n’ihi ọdịmma nke ndị bi na Leodisia+ na ndị niile na-ahụbeghị ihu m anya n’anụ ahụ́,
2 ka e wee kasie ha obi,+ ka e wee jikọọ ha ọnụ n’ịhụnanya,+ ka ha wee nweta akụ̀ dị ukwuu nke obi ike zuru ezu ná nghọta ha,+ ka ha wee nweta ezi ihe ọmụma banyere ihe nzuzo dị nsọ nke Chineke, ya bụ, Kraịst.+
3 E ji nlezianya zochie akụ̀ niile dị oké ọnụ ahịa nke amamihe na nke ihe ọmụma n’ime ya.+
4 Ana m ekwu nke a ka onye ọ bụla ghara iji arụmụka ire ụtọ duhie unu.+
5 N’ihi na ọ bụ ezie na anọghị m ya n’anụ ahụ́, ma mụ na unu nọ n’ime mmụọ,+ m na-aṅụrị ọṅụ, na-ahụkwa na unu na-eme ihe n’usoro,+ na-ahụkwa otú okwukwe+ unu n’ebe Kraịst nọ si sie ike.
6 Ya mere, ebe ọ bụ na unu nabatara Kraịst Jizọs bụ́ Onyenwe anyị, na-ejenụ ije dị ka ndị ha na ya dị n’otu,+
7 bụrụnụ ndị gbanyere mgbọrọgwụ+ n’ime ya, ndị a na-ewulikwa elu+ n’ime ya, ndị a na-eme ka ha gbasie ike n’okwukwe,+ dị nnọọ ka a kụziiri unu, nweenụ okwukwe na ekele dị ukwuu.+
8 Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu+ unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma+ na aghụghọ efu,+ dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ+ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị;
9 n’ihi na ọ bụ n’ime ya ka izu ezu+ niile nke ọdịdị+ Chineke+ bi n’anụ ahụ́.
10 N’ihi ya, unu nwezuru ihe niile site n’aka ya, ya bụ, onye bụ́ isi nke ọchịchị niile na ikike niile.+
11 Site ná mmekọrịta+ unu na ya, e bikwara unu úgwù+ nke bụ́ úgwù a na-ejighị aka bie site n’ibepụ anụ ahụ́,+ site n’ibi úgwù nke Kraịst,
12 n’ihi na e likọrọ unu na ya na baptizim ya,+ sitekwa ná mmekọrịta unu na ya, a kpọlitekọkwara+ unu na ya site n’okwukwe+ unu nwere n’ịrụ ọrụ+ nke Chineke, onye mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.+
13 Ọzọkwa, ọ bụ ezie na unu nwụrụ anwụ ná njehie unu, mgbe a na-ebighịkwa unu úgwù n’anụ ahụ́, Chineke mere ka unu na ya dịkọọ ndụ.+ O ji obiọma gbaghara anyị njehie anyị niile,+
14 hichapụkwa+ ihe ahụ e ji aka dee+ nke gbara àmà megide anyị, nke iwu+ mejupụtara, nke na-emegidekwa anyị;+ O wepụwokwa ya n’ụzọ site n’ịkụgide+ ya n’osisi ịta ahụhụ ahụ.+
15 Ọ gbara ọchịchị na ikike+ dị iche iche ọtọ wee gosi ha n’ihu ọha dị ka ndị e meriri emeri,+ na-edu ha ná ngagharị mmeri+ site na ya.
16 Ya mere, unu ekwela ka onye ọ bụla kpee unu ikpe+ n’iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ+ ma ọ bụ n’ihe banyere ememme+ ma ọ bụ banyere ememme ọnwa ọhụrụ+ ma ọ bụ banyere ụbọchị izu ike;+
17 n’ihi na ihe ndị ahụ bụ onyinyo+ nke ihe gaje ịbịa, ma ihe bụ́ ezie+ dịịrị Kraịst.+
18 Unu ekwela ka onye ọ bụla gbochie+ unu inweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ,+ bụ́ onye na-enwe mmasị n’ịdị umeala n’obi ụgha nakwa n’ụdị ofufe a na-efe ndị mmụọ ozi, “ọ na-eguzosi ike”* n’ihe ndị ọ hụrụ, onye echiche ya nke anụ ahụ́ na-achị na-afụli elu n’enweghị ezi ihe kpatara ya,
19 ebe ọ na-ejidesighị onye bụ́ isi aka ike,+ onye ahụ nke ahụ́ dum si n’aka ya na-eto uto ahụ nke Chineke na-eme ka ọ na-eto,+ ebe a na-enye ya ihe niile, ebe e jikọtakwara ya ọnụ+ site na nkwonkwo na akwara njikọ ya.
20 Ọ bụrụ na unu na Kraịst nwụkọrọ+ n’ihe metụtara ihe ndị mbụ+ nke ụwa,+ gịnị mere unu ji na-edo onwe unu n’okpuru iwu ndị ahụ,+ dị ka à ga-asị na unu ka bi n’ụwa, na-asị,
21 “Emetụla aka, edetụla ire,+ ebitụla aka,”+
22 n’ihe banyere ihe niile a ga-ebibi ebibi site n’iji ha mee ihe, dị ka iwu na ozizi ndị mmadụ si dị?+
23 A na-egosipụta ihe ndị ahụ n’ụdị ofufe nke mmadụ na-amanye onwe ya ịgbaso, n’ịdị umeala n’obi ụgha, nakwa n’ịta onwe onye ahụhụ.+ N’ezie, e nwere ihe yiri amamihe na ha, ma ọ dịghị uru ha bara n’ịlụso ọchịchọ anụ ahụ́ ọgụ.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Grik bụ “ọ na-abanye.”