Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Ikpe 5:1-31

5  N’ụbọchị ahụ, Debora+ na Berak+ nwa Abinoam+ malitere ịbụ abụ,+ sị:   “N’ihi ịhapụ ntutu isi ka ọ ghasasịa aghasasịa n’Izrel maka agha,N’ihi ndị Izrel inye onwe ha n’afọ ofufo,+Gọzienụ Jehova.+   Geenụ ntị, unu ndị eze;+ ṅaanụ ntị, unu ndị isi;M ga-abụku Jehova abụ, ee, m ga-abụ abụ.M ga-abụku Jehova, bụ́ Chineke Izrel,+ abụ olu ụtọ.+   Jehova, mgbe i si na Sia na-apụta,+Mgbe i si n’ala Idọm zọrọ ije na-apụta,+Ala mara jijiji,+ mmiri sikwa n’eluigwe zoo,+Mmiri sikwa n’ígwé ojii zoo.   Ugwu gbazere n’ihu Jehova,+Saịnaị+ nke a gbazere n’ihu Jehova,+ bụ́ Chineke Izrel.+   N’ụbọchị Shamga+ nwa Enat,N’ụbọchị Jeel,+ e nweghị ndị na-aga n’ụzọ,Ndị njem ndị na-aga n’okporo ụzọ na-aga nkọnkọ nkọnkọ.+   Ndị bi n’obodo a na-agbaghị ogige anọkwaghị, ha anọkwaghị n’Izrel,+Ruo mgbe mụ onwe m, bụ́ Debora,+ biliri,Ruo mgbe m biliri dị ka nne n’Izrel.+   Ha wee họrọ chi ọhụrụ.+Ọ bụ mgbe ahụ ka agha dara n’ọnụ ụzọ ámá.+A hụghị ọta ma ọ bụ ubeN’etiti puku mmadụ iri anọ n’Izrel.+   Obi m dịnyeere ndị ọchịagha Izrel,+Ndị nyere onwe ha n’afọ ofufo n’etiti ndị Izrel.+Gọzienụ Jehova.+ 10  Unu ndị na-agba nne ịnyịnya ibu na-acha ọbara ọbara,+Unu ndị na-anọdụ na kapet ọma,Unu ndị na-eje ije n’okporo ụzọ,Tụgharịanụ uche!+ 11  A na-anụ olu ụfọdụ n’ime ndị na-enye anụmanụ mmiri n’ebe ndị a na-eseta mmiri,+N’ebe ahụ ka ha malitere ịkọ ọrụ ezi omume Jehova,+Ọrụ ezi omume nke ndị ya bi n’obodo a na-agbaghị ogige n’Izrel.Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị Jehova gbadara n’ọnụ ụzọ ámá. 12  Teta, teta, Debora;+Teta, teta, bụọ abụ!+Bilie, Berak,+ duru ndị ị dọtara n’agha laa, gị nwa Abinoam!+ 13  Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị lanahụrụnụ gbadakwuuru ndị ukwu;Ndị Jehova wee gbadakwute m ibuso ndị dike agha. 14  N’Ifrem ka ha si, bụ́ ndị nọ na ndagwurugwu,+Ndị so gị, Benjamin, n’etiti ndị gị.Na Mekia+ ka ndị ọchịagha si gbadaa,Na Zebulọn ka ndị ji ihe odeakwụkwọ ji ede ihe sikwa.+ 15  Ndị bụ́ ndị isi n’Ịsaka+ so Debora,Dị ka Ịsaka mere, otú ahụ ka Berak mekwara.+E dunyere ya ka o jiri ụkwụ gaa na ndagwurugwu.+E mere ọtụtụ nchọpụta iji mata ihe ndị nọ n’ógbè niile nke Ruben bu n’obi.+ 16  Gịnị mere i ji nọdụ ala n’agbata akpa abụọ a na-ekokwasị n’elu ịnyịnya,Ịnụrụ ọjà a na-egburu ìgwè atụrụ?+N’ihi na e mere ọtụtụ nchọpụta iji mata ihe ndị nọ n’ógbè niile nke Ruben bu n’obi.+ 17  Gilied nọgidere n’ebe obibi ya n’ofe Jọdan;+Gịnịkwa mere Dan ka ji nọrọ n’ụgbọ mmiri?+Asha nọ nkịtị n’ụsọ oké osimiri,Ọ bụkwa n’ebe ọ na-akwụsị ụgbọ mmiri ya ka o bi.+ 18  Zebulọn tinyere mkpụrụ obi ya n’ihe ize ndụ ruo n’ọnwụ;+Naftalaị+ mekwara otú ahụ, n’ebe ndị dị elu n’ọhịa.+ 19  Ndị eze bịara, ha buru agha;Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị eze Kenan buru agha+Na Teanak,+ n’akụkụ mmiri Megido.+Ha enwetaghị ọlaọcha ọ bụla dị ka uru.+ 20  Kpakpando si n’eluigwe buo agha,+Ha si n’ụzọ ha buso Sisera agha. 21  Iyi Kaịshọn buuru ha,+Iyi oge ochie, iyi Kaịshọn.+I wee na-azọ ndị dị ike ụkwụ,+ gị mkpụrụ obi m. 22  Ọ bụ mgbe ahụ ka ịnyịnya zọsiri ụkwụ ike n’ala+N’ihi oké ọsọ nke ịnyịnya ya na-awụ. 23  ‘Bụọnụ Mirọz ọnụ,’+ ka mmụọ ozi Jehova kwuru,+‘Na-abụnụ ndị bi na ya ọnụ mgbe niile,N’ihi na ha abịaghị nyere Jehova aka,Ha esoghị ndị dike nyere Jehova aka.’ 24  N’ime ndị inyom niile, Jeel+ nwunye Hiba onye Kenaịt+ ga-abụ onye a gọziri agọzi karịsịa,N’ime ndị inyom bi n’ụlọikwuu, ọ ga-abụ onye a gọziri agọzi karịsịa.+ 25  Ọ rịọrọ mmiri, ya enye ya mmiri ara ehi;O ji nnukwu efere nke ndị ukwu nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.+ 26  O wee matịa aka ya were mkpọ́ ụlọikwuu,Matịakwa aka nri ya were hama nke ndị na-arụsi ọrụ ike.+O wee kụọ ya Sisera, kpọpuo ya isi,+O wee kpọwaa ma kpọpuo agba ntị ya. 27  N’agbata ụkwụ ya abụọ ka o ruru ala, ọ dara wee tọgbọrọ n’ala;N’agbata ụkwụ ya abụọ ka o ruru ala, ka ọ dara;N’ebe ahụ o ruru ala ka ọ dara bụrụ onye e meriri emeri.+ 28  Otu nwaanyị si na windo lepụ anya, na-ele anya ya,Nne Sisera si na mpio ụlọ na-elepụ anya,+ sị,‘Gịnị mere ụgbọ ịnyịnya agha ya ji na-egbu oge ịlọta?+Gịnị mere ụda ụkwụ ụgbọ ịnyịnya ya ji na-egbu oge?’+ 29  Ndị maara ihe n’etiti ndị inyom ya a ma ama+ na-aza ya, sị,Ee, ya onwe ya na-azakwa onwe ya, sị, 30  ‘Ọ̀ bụ na ha ekwesịghị ịchọpụta, ọ̀ bụ na ha ekwesịghị ikesa ihe nkwata,+Nwoke ọ bụla ga-eketa otu akpa nwa, akpa nwa abụọ,+Sisera ga-eketa ákwà e sijiri esiji ndị a kwatara akwata, ee, ákwà e sijiri esiji ndị a kwatara akwata,Otu uwe a kpara ihe, otu ákwà e sijiri esiji, uwe abụọ a kpara iheKa a ga-eji chọọ olu ndị kwatara ihe mma?’ 31  Jehova, ka ndị iro gị niile si otú a laa n’iyi,+Ka ndị hụrụ gị n’anya+ dịrị ka mgbe anyanwụ ji ike ya dum na-awa.”+ Ala ahụ enwekwaghị nsogbu ọzọ ruo afọ iri anọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji