Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Ikpe 19:1-30

19  N’oge ahụ, e nweghị eze n’Izrel.+ Ọ dị otu onye Livaị nke bi nwa mgbe n’ime ime ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu.+ Ka oge na-aga, ọ kpọọrọ otu nwaanyị onye Betlehem+ nke dị na Juda ka ọ bụrụ iko ya.+  Iko ya nwaanyị na ndị ọzọ wee na-akwa iko.+ E mesịa, nwaanyị ahụ hapụrụ ya laa n’ụlọ nna ya na Betlehem nke dị na Juda ma nọọ ọnwa anọ zuru ezu n’ebe ahụ.  Di ya wee bilie chọrọ ya gaa ka ọ gwa ya okwu ga-emeda ya obi ka o wee kpọghachite ya; ya na onye na-ejere ya ozi sokwa,+ ha jikwa ịnyịnya ibu abụọ. Nwaanyị ahụ wee kpọbata ya n’ụlọ nna ya. Ozugbo nna nwa agbọghọ ahụ hụrụ ya, ọ ṅụrịrị ọṅụ.  Ọgọ nwoke ahụ, bụ́ nna nwa agbọghọ ahụ, ekweghị ka ọ laa, o wee nọnyere ya ruo ụbọchị atọ; ha wee na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ọ na-ehikwa n’ebe ahụ.+  O wee ruo n’ụbọchị nke anọ, mgbe ha biliri n’isi ụtụtụ, dị ka ha na-eme, o biliri ka ọ lawa, ma nna nwa agbọghọ ahụ gwara ọgọ ya nwoke, sị: “Ritụ nri+ ka i nweta ume, e mesịa, unu alawa.”  Ha wee nọdụ ala, ha abụọ wee malite irikọ ihe na ịṅụkọ ihe ọṅụṅụ; e mesịa, nna nwa agbọghọ ahụ gwara nwoke ahụ, sị: “Biko, nọrọ ka chi bọọ,+ meekwa onwe gị obi ụtọ.”+  Mgbe nwoke ahụ biliri ka ọ lawa, ọgọ ya nwoke nọ na-arịọ ya, o wee rahụ n’ebe ahụ ọzọ.+  Mgbe o biliri n’isi ụtụtụ n’ụbọchị nke ise ka ọ lawa, nna nwa agbọghọ ahụ sịrị ya: “Biko, rie ihe ka i nweta ume.”+ Ha wee cheretụ ruo mgbe ụbọchị gamiri. Ha abụọ wee na-eri ihe.  Nwoke ahụ+ wee bilie ka ọ lawa, ya na iko ya nwaanyị+ na onye na-ejere ya ozi;+ ma ọgọ ya nwoke, bụ́ nna nwa agbọghọ ahụ, sịrị ya: “Lee! Chi ejiwela. Biko, nọrọnụ ka chi bọọ.+ Lee, ụbọchị agamiwo. Nọrọnụ ebe a ka chi bọọ, meekwanụ onwe unu obi ụtọ.+ Echi, unu ga-ebili n’isi ụtụtụ maka njem unu, unu ga-alakwa n’ụlọikwuu unu.” 10  Otú ọ dị, nwoke ahụ ekweghị ịnọrọ ka chi bọọ, kama o biliri lawa ma bịarute n’ihu Jibọs,+ ya bụ, Jeruselem;+ o jikwa ịnyịnya ibu abụọ e dokwasịrị ihe e ji anọkwasị ha, ya na iko ya nwaanyị na onye na-ejere ya ozi sokwa. 11  Mgbe ha rutewere Jibọs, ebe ọ bụ na ụbọchị agamiwo,+ onye ahụ na-eje ozi gwara nna ya ukwu, sị: “Bịa ka anyị banye n’obodo a, bụ́ obodo ndị Jibọs,+ nọrọ ka chi bọọ.” 12  Ma nna ya ukwu sịrị ya: “Ka anyị ghara ịbanye n’obodo ndị mba ọzọ+ ndị na-abụghị ụmụ Izrel; ka anyị gawa ruo Gibia.”+ 13  O wee gaa n’ihu ịsị onye na-ejere ya ozi: “Bịa ka anyị garuo Gibia ma ọ bụ Rema,+ anyị ga-anọkwa n’otu n’ime ha ka chi bọọ.” 14  Ha wee gafere na-aga ebe ha na-aga, anyanwụ wee malite ịda mgbe ha nọ Gibia nke Benjamin nso. 15  Ha wee banye n’ebe ahụ ka ha gaa rahụ na Gibia. Ha wee banye gaa nọdụ ala n’ámá obodo ahụ, ọ dịghịkwa onye kpọbatara ha n’ụlọ ka ha nọrọ ka chi bọọ.+ 16  Mgbe e mesịrị, lee! otu agadi nwoke si ubi na-alọta n’uhuruchi,+ nwoke ahụ si n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu+ ma o bi dị ka ọbịa na Gibia; ma ndị obodo ahụ bụ ndị ebo Benjamin.+ 17  Mgbe o leliri anya ya, ọ hụrụ nwoke ahụ, bụ́ onye njem ahụ, n’ámá obodo. Agadi nwoke ahụ wee sị ha: “Ebee ka ị na-aga, ebeekwa ka i si?”+ 18  O wee sị ya: “Anyị si na Betlehem nke dị na Juda na-aga n’ebe dị n’ime ime n’ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu.+ Ọ bụ ebe ahụ ka m si, kama m gara Betlehem nke dị na Juda;+ ọ bụkwa n’ụlọ m ka m na-ala, ma ọ dịghị onye chọrọ ịkpọbata m n’ụlọ ya.+ 19  Anyị nwere okporo ọka* na nri anụ+ nke ịnyịnya ibu anyị ga-eri, anyị nwekwara achịcha+ na mmanya maka mụ na ohu gị nwaanyị+ na onye na-ejere ohu gị ozi.+ Ọ dịghị ihe ọ bụla kọrọ anyị.” 20  Ma, agadi nwoke ahụ sịrị ya: “Udo dịrị gị!+ Ka m nye gị ihe ọ bụla kọrọ gị.+ Kama, arahụla n’ámá obodo a.” 21  O wee kpọbata ya n’ụlọ ya+ ma nye ịnyịnya ibu ya nri anụ.+ Ha wee saa ụkwụ ha+ ma malite iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ. 22  Mgbe ha nọ na-eme onwe ha obi ụtọ,+ lee! ndị ikom obodo ahụ, bụ́ ndị na-abaghị n’ihe,+ gbara ụlọ ahụ gburugburu,+ na-enu ibe ha aka n’ibo ụzọ; ha wee na-agwa agadi nwoke ahụ bụ́ onye nwe ụlọ, sị: “Kpọpụta nwoke ahụ batara n’ụlọ gị, ka anyị na ya nwee mmekọahụ.”+ 23  Onye ahụ nwe ụlọ wee gakwuru ha, sị ha:+ “Ee e, ụmụnne m,+ biko, unu emela ihe ọjọọ ọ bụla, ebe ọ bụ na nwoke a batara n’ụlọ m. Unu emela ihe nzuzu a na-eme ihere.+ 24  Leenụ nwa m nwaanyị nke na-amaghị nwoke, ya na iko nwaanyị nwoke a. Bikonụ, ka m kpọpụtara unu ha, dinaanụ ha,+ meekwanụ ha ihe dị unu mma. Ma unu emela nwoke a ihe nzuzu a na-eme ihere.” 25  Ndị ikom ahụ achọghị ige ya ntị. Nwoke ahụ wee kpọrọ iko ya nwaanyị+ kpọpụtara ha n’èzí; ha na ya wee malite inwe mmekọahụ́,+ ha wee na-emetọ+ ya n’abalị ahụ dum ruo n’ụtụtụ, wee hapụ ya mgbe chi bọwara. 26  Nwaanyị ahụ wee bịa mgbe chi bọwara ma daa n’ọnụ ụzọ ụlọ nwoke ahụ, n’ụlọ ahụ nna ya ukwu nọ,+—ruo mgbe chi bọchara. 27  E mesịa, nna ya ukwu biliri n’ụtụtụ meghee ọnụ ụzọ ụlọ ya wee pụọ ka ọ lawa, ma, lee! iko+ ya nwaanyị ahụ adawo n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ, bikwasịkwa aka n’ọnụ ụzọ! 28  O wee sị ya: “Bilie, ka anyị lawa.” Ma ọ tụpụrụghị ya ọnụ.+ Nwoke ahụ wee kukwasị ya n’ịnyịnya ibu ya, bilie lawa n’obodo ya.+ 29  O wee banye n’ụlọ ya, were mma e ji egbu anụ, jide iko ya nwaanyị gburie ya ụzọ iri na abụọ,+ dị ka ọkpụkpụ ya si dị, ma ziga ya n’ókèala niile nke Izrel.+ 30  O wee ruo na onye ọ bụla nke hụrụ ya na-asị: “E metụbeghị ụdị ihe a, a hụtụbeghịkwa ya malite n’ụbọchị ụmụ Izrel si n’ala Ijipt pụta ruo taa. Chebaranụ ya echiche, gbaanụ izu,+ kwuokwanụ okwu.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.