Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Hibru 2:1-18

2  Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị mee ka uche anyị dịrị n’ihe anyị nụrụ+ karịa otú anyị na-eme, ka anyị wee ghara ịkpafu+ mgbe ọ bụla.  N’ihi na ọ bụrụ na okwu ahụ e kwuru site n’ọnụ ndị mmụọ ozi+ guzosiri ike, ọ bụrụkwa na e nyere ntaramahụhụ maka mmebi iwu na omume nnupụisi ọ bụla dị ka ikpe ziri ezi si dị;+  olee otú anyị ga-esi gbanahụ+ ma ọ bụrụ na anyị leghaara+ nzọpụta dị ukwuu otú ahụ anya,+ ebe Onyenwe anyị malitere ikwu banyere ya,+ ndị nụrụ olu ya gwakwara anyị na ọ bụ eziokwu,+  ebe ọ bụ na Chineke so na-agba àmà site n’ihe ịrịba ama na ihe ebube na ọrụ dị iche iche dị ike,+ sitekwa n’ikesa+ onyinye dị iche iche nke mmụọ nsọ dị ka uche ya si dị?+  N’ihi na ọ bụghị n’okpuru ndị mmụọ ozi ka o doro elu ụwa mmadụ bi nke gaje ịbịa,+ bụ́ nke anyị na-ekwu okwu banyere ya.  Ma otu onye àmà nyere ihe àmà n’otu ebe, sị: “Gịnị ka mmadụ bụ, nke mere i ji na-echeta ya,+ gịnịkwa ka nwa nke mmadụ bụ, nke mere i ji na-elekọta ya?+  I mere ya ka ọ dị ala karịa ndị mmụọ ozi; i kpuwere ya ebube na nsọpụrụ+ dị ka okpueze, meekwa ka ọ bụrụ onye na-achị ọrụ aka gị.+  I doro ihe niile n’okpuru ụkwụ ya.”+ N’ihi na ebe o doro ihe niile n’okpuru ya,+ ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke n’edoghị ya n’okpuru ya.+ Ma, ugbu a, anyị ahụwabeghị ka ihe niile nọ n’okpuru ya;+  ma anyị na-ahụ Jizọs, onye e mere ka ọ dị ala karịa ndị mmụọ ozi,+ ka e kpuwere ya ebube+ na nsọpụrụ dị ka okpueze n’ihi na ọ nwụwo anwụ,+ ka o wee site n’obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ detụ ọnwụ ire maka mmadụ niile.+ 10  N’ihi na o kwesịrị ekwesị ka onye ahụ nke ihe niile dị n’ihi ya,+ onye ihe niile sikwa n’aka ya dịrị, mee ka Onye Nnọchiteanya Ukwu+ nke nzọpụta ha zuo okè site n’ịta ahụhụ,+ mgbe Ọ na-eme ka ọtụtụ ụmụ nwee ebube.+ 11  N’ihi na ma onye na-edo ha nsọ ma ndị a na-edo nsọ+ sitechara n’otu onye,+ n’ihi nke a, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha “ụmụnna,”+ 12  dị ka o kwuru, sị: “M ga-akọsara ụmụnna m aha gị; m ga-anọ n’ime ọgbakọ jiri abụ too gị.”+ 13  Ọ sịkwara: “M ga-atụkwasị ya obi.”+ Ọ sịkwara: “Lee! Mụ na ụmụaka Jehova nyere m.”+ 14  Ya mere, ebe “ụmụntakịrị” ahụ bụ ndị na-eketa òkè n’ọbara na anụ ahụ́, ya onwe ya n’ụzọ yiri nke ahụ kekwaara òkè n’otu ihe ndị ahụ,+ ka o wee site n’ọnwụ ya+ mee ka ọ ghara ịdị+ bụ́ onye ahụ nke nwere ikike ịkpata ọnwụ,+ ya bụ, Ekwensu;+ 15  ka o wee tọhapụkwa+ ndị niile egwu ọnwụ+ mere ka ha nọrọ n’ohu ná ndụ ha niile.+ 16  N’ihi na, n’ezie, ọ dịghị enyere ndị mmụọ ozi aka ma ọlị, kama ọ na-enyere mkpụrụ Ebreham aka.+ 17  N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ọ dị ka “ụmụnna” ya n’ụzọ niile,+ ka o wee ghọọ nnukwu onye nchụàjà na-eme ebere, nke kwesịrị ntụkwasị obi n’ijere Chineke ozi,+ ka o wee chụọ àjà ime udo+ maka mmehie nke ndị mmadụ.+ 18  N’ihi na ebe ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-ele ya ule,+ o nwere ike ịgbatara ndị a na-ele ule ọsọ enyemaka.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji