Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Hibru 13:1-25

13  Ka ịhụnanya ụmụnna unu dịgide.+  Unu echefula ile ọbịa,+ n’ihi na site na ya, ụfọdụ lere ndị mmụọ ozi ọbịa+ n’amaghị ama.  Na-echetanụ ndị nọ n’agbụ ụlọ mkpọrọ+ dị ka à ga-asị na e kere unu na ha agbụ,+ na ndị a na-emegbu emegbu,+ ebe unu onwe unu ka nọkwa n’anụ ahụ́.  Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye gharakwa ịbụ ihe e merụrụ emerụ,+ n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.+  Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya,+ ka unu nọ na-enwe afọ ojuju+ n’ihe ndị dị ugbu a.+ N’ihi na o kwuwo, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.”+  Ka anyị nwee obi ike+ wee sị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”+  Na-echetanụ ndị na-edu ndú n’etiti unu,+ bụ́ ndị gwara unu okwu Chineke, ka unu na-ahụkwa ihe na-esi n’omume ha apụta, na-eṅominụ+ okwukwe ha.+  Jizọs Kraịst bụ otu onye ahụ ọ bụ ụnyaahụ na taa, ruokwa mgbe ebighị ebi.+  Unu abụla ndị e ji ozizi ọhụrụ dị iche iche bufuo;+ n’ihi na ọ dị mma isite n’obiọma na-erughịrị mmadụ mee ka obi sie mmadụ ike,+ ọ bụghị site n’ihe oriri,+ bụ́ nke na-ababereghị ndị na-etinye obi na ha uru. 10  Anyị nwere ebe ịchụàjà bụ́ ebe ndị na-eje ozi dị nsọ n’ụlọikwuu ahụ na-enweghị ikike iri ihe sitere na ya.+ 11  N’ihi na ozu anụmanụ ndị ahụ ndị nnukwu onye nchụàjà na-ewebata ọbara ha n’ebe nsọ maka mmehie bụ ndị a na-akpọ ọkụ ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu.+ 12  N’ihi ya, Jizọs tara ahụhụ ná mpụga ọnụ ụzọ ámá,+ ka o wee jiri ọbara ya+ doo ndị mmadụ nsọ.+ 13  Ya mere, ka anyị gakwuru ya ná mpụga ebe a mara ụlọikwuu, na-edi nkọcha ahụ o diri,+ 14  n’ihi na anyị enweghị obodo nke na-adịgide adịgide n’ebe a,+ kama anyị na-achọsi nke ahụ gaje ịbịa ike.+ 15  Ka anyị site n’aka ya na-achụrụ Chineke àjà otuto mgbe niile,+ ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ+ bụ́ nke na-ekwupụta aha ya n’ihu ọha.+ 16  Unu echefukwala ime ihe ọma+ na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.+ 17  Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi,+ na-anọkwanụ n’okpuru ha,+ n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ;+ ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị ịsụ ude, n’ihi na nke a ga-emebiri unu ihe.+ 18  Na-ekpenụ ekpere+ maka anyị, n’ihi na anyị kwenyesiri ike na anyị nwere akọ na uche ziri ezi, ebe anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.+ 19  Ma m na-agba unu ume ime nke a karịsịa, ka e wee mee ka m bịakwute unu n’oge na-adịghị anya.+ 20  Ka Chineke nke udo,+ onye mere ka nnukwu onye ọzụzụ+ atụrụ ahụ+ bụ́ Onyenwe anyị Jizọs, onye ji ọbara nke ọgbụgba ndụ ebighị ebi,+ si ná ndị nwụrụ anwụ bilie,+ 21  jiri ihe ọma niile kwadebe unu ime uche ya. Ka o si n’aka Jizọs Kraịst na-arụ ihe ahụ dị mma n’anya ya n’ime anyị;+ ka otuto dịrị ya ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Amen. 22  M na-agbakwa unu ume, ụmụnna m, ka unu nabata okwu agbamume a, n’ihi na edetaara m unu akwụkwọ ozi dị nkenke.+ 23  Maranụ na a tọhapụwo nwanna anyị Timoti,+ onye mụ na ya ga-eso bịa hụ unu, ma ọ bụrụ na ọ bịa n’oge na-adịghị anya. 24  Keleerenụ m ndị niile na-edu ndú+ n’etiti unu nakwa ndị nsọ niile. Ndị nọ n’Ịtali+ na-ekele unu. 25  Ka obiọma na-erughịrị mmadụ+ dịnyere unu niile.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji