Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Hibru 12:1-29

12  Ya mere, ebe anyị nwere oké ìgwè ndị àmà dị otú a+ gbara anyị gburugburu, ka anyị yipụkwa ihe ọ bụla dị arọ+ nakwa mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị,+ ka anyị jirikwa ntachi obi+ na-agba ọsọ+ ahụ e debere n’ihu anyị,+  ka anyị na-elegide anya n’ebe Onye Nnọchiteanya Ukwu+ na Onye Mmezu nke okwukwe anyị nọ,+ bụ́ Jizọs. N’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya, o diri+ osisi ịta ahụhụ, leghara ihere anya, ọ nọdụwokwa ala n’aka nri nke ocheeze Chineke.+  N’ezie, chesienụ echiche ike banyere onye ahụ nke diri okwu mmegide+ dị otú ahụ nke ndị mmehie kwuru megide ọdịmma ha, ka ike wee ghara ịgwụ unu, unu ewee daa mbà ná mkpụrụ obi unu.+  Na mgba unu na-agbaso mmehie ahụ, unu alụbeghị ọgụ ruo n’ọbara,+  ma unu echefuchawo ndụmọdụ ahụ nke na-agwa unu okwu dị ka ụmụ, sị:+ “Nwa m, eledala ịdọ aka ná ntị nke si n’aka Jehova anya, adakwala mbà mgbe ọ na-abara gị mba;+  n’ihi na onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị; n’eziokwu, ọ na-apịa onye ọ bụla ọ nabatara ịbụ nwa ya ihe.”+  Unu na-atachi obi ka e wee dọọ unu aka ná ntị.+ Chineke na-emeso unu dị ka ụmụ.+ N’ihi na olee nwa nke nna ya na-adịghị adọ aka ná ntị?+  Ma ọ bụrụ na unu adịghị anata ịdọ aka ná ntị nke mmadụ niile na-anata, n’ezie, unu bụ ndị a kwatara n’iko,+ ọ bụghị ụmụ.  Ọ dịkwa mgbe anyị nwere ndị nna anyị na ha bụ anụ ahụ́, ndị na-adọ anyị aka ná ntị,+ anyị na-akwanyekwara ha ùgwù. Ọ̀ bụ na anyị agaghị edo onwe anyị n’okpuru Nna nke ndụ ime mmụọ anyị karị wee dịrị ndụ?+ 10  N’ihi na ruo ụbọchị ole na ole, ha na-adọ anyị aka ná ntị dị ka o si dị ha mma,+ ma ọ na-eme otú ahụ n’ihi ọdịmma anyị ka anyị wee keta òkè n’ịdị nsọ ya.+ 11  N’eziokwu, ọ dịghị ịdọ aka ná ntị ọ bụla nke na-eyi ihe na-enye ọṅụ mgbe a na-adọ ya, kama ọ na-eyi ihe mwute;+ ma n’ikpeazụ, ọ na-amịrị ndị e ji ya zụọ mkpụrụ udo,+ ya bụ, ezi omume.+ 12  N’ihi ya, na-agbatịnụ aka kụdara akụda+ na ikpere na-adịghị ike,+ 13  na-emerenụ ụkwụ unu ụzọ kwụ ọtọ,+ ka e wee ghara ikwokapụ ihe dara ngwọrọ ná nkwonkwo ya, kama ka e wee gwọọ ya.+ 14  Na-achụsonụ udo n’ebe mmadụ niile nọ,+ na ịdị nsọ+ nke ọ na-adịghị onye ga-ahụ Onyenwe anyị ma o nweghị ya,+ 15  na-elezinụ anya nke ọma ka e wee ghara ịnapụ onye ọ bụla obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ;+ ka mgbọrọgwụ ọ bụla nke na-egbu mmadụ+ ghara ipulite wee kpata nsogbu, ka o wee ghara imerụ ọtụtụ ndị;+ 16  ka e wee ghara inwe onye ọ bụla nke na-akwa iko ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ejighị ihe dị nsọ kpọrọ ihe, dị ka Isọ,+ onye nyefere ihe ruuru ya dị ka ọkpara iji gbanweta otu efere nri.+ 17  N’ihi na unu maara na mgbe o mesịrị chọọ inweta ngọzi ahụ,+ a jụrụ ya,+ n’ihi na, ọ bụ ezie na o ji anya mmiri chọsie ike ka nna ya gbanwee obi ya,+ o nwetaghị ohere ọ bụla.+ 18  N’ihi na unu abịarubeghị nso n’ihe ahụ nke a pụrụ imetụ aka,+ nke a mụnyekwara ọkụ,+ na ígwé ojii na oké ọchịchịrị na oké ifufe,+ 19  na ụda opi+ na olu okwu;+ nke bụ́ olu ndị Izrel nụrụ wee rịọ ka a ghara ịgwa ha okwu ọ bụla ọzọ.+ 20  N’ihi na ha apụghị ịnagide iwu ahụ e nyere bụ́: “Ọ bụrụ na ahụ́ anụmanụ emetụ ugwu ahụ, a ghaghị iji nkume tụgbuo ya.”+ 21  Ihe a hụrụ dịkwa egwu nke na Mozis sịrị: “Egwu ji m, m na-amakwa jijiji.”+ 22  Ma unu abịaruwo nso n’Ugwu Zayọn+ nakwa obodo+ nke Chineke dị ndụ, bụ́ Jeruselem nke eluigwe,+ na ọtụtụ iri puku ndị mmụọ ozi,+ 23  ná mgbakọ ezumezu+ nakwa n’ọgbakọ nke ndị e bu ụzọ mụọ,+ bụ́ ndị e dere aha ha+ n’akwụkwọ n’eluigwe, na Chineke bụ́ Onyeikpe nke mmadụ niile,+ na ndụ ime mmụọ+ nke ndị ezi omume ndị e mere ka ha zuo okè,+ 24  na Jizọs bụ́ onye ogbugbo+ nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ,+ na ọbara ahụ a na-efesa efesa,+ nke na-ekwu okwu n’ụzọ dị mma karịa ọbara Ebel.+ 25  Hụnụ na unu adịghị ajụ irubere onye ahụ nke na-ekwu okwu isi.+ N’ihi na ọ bụrụ na ndị ahụ alanahụghị, ya bụ, ndị jụrụ irubere onye ahụ isi, bụ́ onye nọ n’ụwa+ na-enye ha ịdọ aka ná ntị nke si n’aka Chineke, lee otú anyị na-agaghị esi lanahụ ma ọlị ma ọ bụrụ na anyị agbakụta onye ahụ nke si n’eluigwe+ na-ekwu okwu azụ. 26  N’oge ahụ, olu ya mere ka ụwa maa jijiji,+ ma ugbu a, o kwewo nkwa, sị: “Ọ ka fọrọ otu ugboro m ga-eme ka ọgba aghara dị, ọ bụghị naanị n’ụwa kamakwa n’eluigwe.”+ 27  Ma okwu ahụ bụ́ “Ọ ka fọrọ otu ugboro” na-egosi na a ga-ewepụ ihe ndị e mere ka ha maa jijiji dị ka ihe ndị e meworo eme,+ ka ihe ndị a na-adịghị eme ka ha maa jijiji wee dịgide.+ 28  Ya mere, ebe anyị ga-enweta alaeze nke a na-apụghị ime ka ọ maa jijiji,+ ka anyị na-enweta obiọma na-erughịrị mmadụ, nke anyị ga-esite na ya jiri egwu Chineke na ụjọ+ na-ejere Chineke ozi dị nsọ nke ọ na-anabata. 29  N’ihi na Chineke anyị bụkwa ọkụ na-erepịa erepịa.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji