Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Galeshia 2:1-21

2  E mesịa, mgbe afọ iri na anọ gasịrị, agaghachiri m Jeruselem,+ mụ na Banabas,+ akpọkwaara m Taịtọs ka o soro m.  Ma agara m n’ihi ihe e kpugheere m.+ Akọkwaara m ha+ banyere ozi ọma m na-ekwusa n’etiti ndị mba ọzọ, otú ọ dị, akọọrọ m ya ndị ikom a ma ama mgbe naanị ha nọ, ka ọsọ m na-agba+ ugbu a ma ọ bụ nke m gbara n’oge gara aga wee ghara ịbụ ihe efu n’ụzọ ọ bụla.+  Otú o sina dị, a manyeghị ọbụna Taịtọs,+ bụ́ onye mụ na ya nọ, ka e bie ya úgwù,+ ọ bụ ezie na ọ bụ onye Grik.  Ma n’ihi ụmụnna ụgha+ ndị e ji nwayọọ kpọbata,+ bụ́ ndị gbebatara dị ka ndị nledo ka ha wee mebie nnwere onwe+ nke anyị nwere n’ime Kraịst Jizọs, ka ha wee mee ka anyị bụrụ nnọọ ndị ohu+  anyị enyeghị ndị a ohere site n’ido onwe anyị n’okpuru ha,+ ee e, ọbụna ruo otu awa, ka eziokwu+ nke ozi ọma ahụ wee dịgide n’ebe unu nọ.  Ma n’ebe ndị ahụ nọ, bụ́ ndị yiri ka ọ̀ dị ihe ha bụ,+ n’eziokwu, n’echiche m, ndị ikom ahụ a ma ama agwaghị unu ihe ọhụrụ ọ bụla. Ee, achọghị m ịma ihe ọ bụla ha bụ n’oge gara aga,+ n’ihi na ihe Chineke na-ele abụghị otú mmadụ dị n’elu ahụ́.+  Ma, kama nke ahụ, mgbe ha hụrụ na e nyefere ozi ọma maka ndị a na-ebighị úgwù+ n’aka m,+ dị nnọọ ka e nyefere ozi ọma maka ndị e biri úgwù n’aka Pita+  n’ihi na Onye ahụ nke nyere Pita ike dị mkpa ka ọ bụrụ onyeozi nke ndị e biri úgwù nyekwara m ike+ ka m bụrụ nke ndị si mba ọzọ;  mgbe ha matara banyere obiọma ahụ na-erughịrị mmadụ+ nke e nyere m,+ Jems+ na Sifas na Jọn, bụ́ ndị yiri ka hà bụ ogidi,+ kwere mụ na Banabas+ n’aka bụ́ nke na-egosi na anyị niile bụ ndị na-arụkọ ọrụ,+ ka anyị wee gakwuru ndị mba ọzọ, ma ka ha gakwuru ndị e biri úgwù. 10  Ọ bụ naanị na anyị kwesịrị iburu ndị ogbenye n’uche.+ Agbasiwokwa m mbọ ike ime nke a.+ 11  Otú ọ dị, mgbe Sifas+ bịara Antiọk,+ agwara m ya okwu ihu na ihu, n’ihi na ihe o mere kwesịrị nkatọ.+ 12  N’ihi na tupu ụfọdụ ndị ha na Jems maara abịarute,+ ọ na-esobu ndị mba ọzọ na-eri ihe;+ ma mgbe ha bịarutere, o wezụgara ma kewapụ onwe ya, n’ihi egwu+ nke ndị ahụ e biri úgwù.+ 13  Ndị Juu ndị ọzọ sonyekwaara ya n’ime ihu abụọ a,+ nke mere na ọbụna Banabas+ sooro ha mewe ihu abụọ. 14  Ma mgbe m hụrụ na ha adịghị agazi agazi dị ka eziokwu nke ozi ọma ahụ si dị,+ agwara m Sifas n’ihu ha niile, sị:+ “Ọ bụrụ na gị onwe gị na-ebi ndụ dị ka ndị mba ọzọ si ebi, ọ bụghị dị ka ndị Juu si ebi, ọ bụ ezie na ị bụ onye Juu, gịnị mere i ji na-achọ ime ka ndị mba ọzọ na-ebi ndụ dị ka omume ndị Juu si dị?”+ 15  Anyị bụ́ ndị Juu site n’ọmụmụ,+ anyị abụghị ndị mmehie+ ndị si mba ọzọ, 16  ebe anyị maara na a na-akpọ mmadụ onye ezi omume,+ ọ bụghị n’ihi ọrụ nke iwu, kama naanị site n’inwe okwukwe+ n’ebe Kraịst Jizọs nọ, ọbụna anyị onwe anyị enwewo okwukwe n’ebe Kraịst Jizọs nọ, ka e wee kpọọ anyị ndị ezi omume n’ihi inwe okwukwe n’ebe Kraịst nọ,+ ọ bụghị n’ihi ọrụ nke iwu, n’ihi na a gaghị akpọ anụ ahụ́ ọ bụla onye ezi omume n’ihi ọrụ nke iwu.+ 17  Ma ọ bụrụ na mgbe anyị na-achọ ka a kpọọ anyị ndị ezi omume site na Kraịst,+ na a hụrụ na anyị bụ ndị mmehie,+ Kraịst ọ̀ bụ onye ozi nke mmehie?+ Tụfịakwa! 18  N’ihi na ọ bụrụ na m na-ewulighachi ihe ndị ahụ m kwaturu na mbụ,+ m na-egosi na m bụ onye mmebi iwu.+ 19  Ma mụ onwe m nwụrụ n’ebe iwu dị site n’ịnabata iwu,+ ka m wee dị ndụ n’ebe Chineke nọ.+ 20  A na-akpọgidekọ mụ na Kraịst n’osisi.+ Ọ bụkwaghị m dị ndụ,+ kama ọ bụ Kraịst bụ onye m so na-adị ndụ.+ N’ezie, ndụ nke m dị ugbu a+ n’anụ ahụ́, m dị ya site n’okwukwe nke m nwere n’ebe Ọkpara Chineke nọ, bụ́ onye hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.+ 21  Adịghị m eleda obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ anya;+ n’ihi na ọ bụrụ na ezi omume na-esite n’iwu,+ n’ezie, Kraịst nwụrụ n’efu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji