Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ndị Efesọs 6:1-24

6  Ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ+ unu isi n’ime+ Onyenwe anyị, n’ihi na nke a bụ ezi omume:+  “Sọpụrụ nna gị na nne gị”;+ nke bụ́ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nwere nkwa:+  “Ka ihe wee gaziere gị, ka i wee dị ogologo ndụ n’elu ụwa.”+  Unu ndị bụ́ nna, unu emela ụmụ unu ihe iwe,+ kama na-azụlitenụ ha+ n’ọzụzụ+ na nduzi echiche+ nke si n’aka Jehova.  Unu ndị bụ́ ohu, jirinụ egwu na ịma jijiji+ na ezi obi na-erubere ndị bụ́ nna ukwu unu n’ụwa isi,+ dị ka ọ̀ bụ Kraịst ka unu na-erubere isi,  ọ bụghị naanị mgbe a na-ele unu anya, dị ka ndị na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ,+ kama dị ka ndị ohu Kraịst, ndị ji mkpụrụ obi dum+ na-eme uche Chineke.  Bụrụnụ ndị ohu nwere ezi obi, dị ka ọ̀ bụ Jehova+ ka unu bụ ohu ya, ọ bụghị ndị mmadụ,  n’ihi na unu maara na onye ọ bụla ga-anata ụgwọ ọrụ ya n’aka Jehova,+ n’agbanyeghị ihe ọma ọ bụla o mere, ma ọ̀ bụ ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya.+  Unu ndị bụ́ nna ukwu, nọgidenụ na-emere ha otu ihe ahụ, kwụsịnụ iyi ha egwu,+ n’ihi na unu maara na Nna Ukwu nke unu+ na ha nọ n’eluigwe, ọ dịghịkwa ele mmadụ anya n’ihu.+ 10  N’ikpeazụ, nọgidenụ na-enweta ike+ n’ime Onyenwe anyị nakwa n’ịdị ike+ nke ume ya. 11  Yirinụ ekike agha zuru ezu+ nke si n’aka Chineke, ka unu wee nwee ike iguzosi ike megide atụmatụ aghụghọ nke Ekwensu;+ 12  n’ihi na anyị nwere mgba,+ ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́, kama megide ọchịchị,+ megide ikike,+ megide ndị na-achị ụwa+ nke ọchịchịrị a, megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ+ n’ebe ndị dị n’eluigwe. 13  N’ihi nke a, chịrịnụ ekike agha zuru ezu nke si n’aka Chineke,+ ka unu wee nwee ike iguzo n’ajọ ụbọchị ahụ, ka unu wee guzosie ike+ mgbe unu mezuworo ihe niile. 14  Ya mere, guzosienụ ike, werenụ eziokwu+ kee úkwù unu,+ yirinụ ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume,+ 15  yirikwanụ akpụkpọ ụkwụ bụ́ ngwá ọrụ nke ozi ọma nke udo+ n’ụkwụ unu.+ 16  Karịsịa ihe niile, burunụ ọta ukwu bụ́ okwukwe,+ nke unu ga-eji nwee ike imenyụ akụ́ ụta niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.+ 17  Narakwanụ okpu agha+ bụ́ nzọpụta, na mma agha+ nke mmụọ nsọ,+ ya bụ, okwu Chineke,+ 18  ka unu ji ụdị ikpe ekpere+ ọ bụla na ụdị ịrịọsi arịrịọ ike ọ bụla na-anọgide n’ekpere n’oge niile n’ime mmụọ nsọ.+ Iji mee nke ahụ, mụrụnụ anya mgbe niile, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike n’ihi ndị nsọ niile, 19  nakwa n’ihi m, ka e wee nye m ike ikwu okwu+ ma m meghee ọnụ m, ka m wee jiri nkwuwa okwu+ mee ka a mara ihe nzuzo dị nsọ banyere ozi ọma ahụ,+ 20  nke m bụ onye nnọchiteanya ya+ n’agbụ ígwè; ka m wee na-ekwu banyere ya n’atụghị egwu dị ka m kwesịrị ikwu.+ 21  Ka unu wee marakwa ihe niile m na-eme, na otú m mere. Tikikọs+ ga-eme ka unu mara ihe niile. Ọ bụ nwanna a hụrụ n’anya na onye ozi nke kwesịrị ntụkwasị obi n’ime Onyenwe anyị.+ 22  Ọ bụ ya mere m ji na-ezitere ya unu, ka unu wee mara ihe banyere anyị, ka o wee kasiekwa unu obi.+ 23  Ka udo na ịhụnanya dịrị ụmụnna anyị, ya na okwukwe nke si n’aka Chineke bụ́ Nna nakwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. 24  Ka obiọma na-erughịrị mmadụ+ dịnyere ndị niile ịhụnanya ha nwere n’ebe Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nọ na-apụghị ire ure.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji