Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Malakaị 2:1-17

2  “Unu ndị nchụàjà,+ ọ bụ unu ka m na-enye iwu a.  Ọ bụrụ na unu egeghị ntị,+ ọ bụrụkwa na unu etinyeghị ya n’obi unu+ inye aha m otuto,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “m ga-eme ka ọbụbụ ọnụ bịakwasị unu,+ m ga-emekwa ka ngọzi unu ghọọ ọbụbụ ọnụ.+ Ee, m meworị ka ngọzi unu ghọọ ọbụbụ ọnụ, n’ihi na unu etinyeghị ya n’obi.”  “Lee! M na-abara mkpụrụ+ a kụrụ akụ mba n’ihi unu, m ga-efekwa unu nsị n’ihu, nsị oge ememme unu; mmadụ ga-ebugakwa unu na ya.  Unu ga-amarakwa na ọ bụ m ziteere unu iwu a,+ ka ọgbụgba ndụ+ mụ na Livaị wee dịgide,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.  “Ma ọgbụgba ndụ m, bụ́ nke ndụ na nke udo,+ dị n’ebe ọ nọ, m wee were ya na-enye ya, ka o wee tụọ egwu m. O wee na-atụ egwu m;+ ee, ụjọ jidere ya n’ihi aha m.+  Iwu nke eziokwu dị n’ọnụ ya,+ ọ dịghịkwa ajọ omume a hụrụ n’egbugbere ọnụ ya. O so m na-eje ije n’udo nakwa n’ịkwụwa aka ọtọ,+ o mekwara ka ọtụtụ ndị hapụ njehie ha.+  N’ihi na egbugbere ọnụ onye nchụàjà kwesịrị ichekwa ihe ọmụma, ndị mmadụ kwesịkwara ịchọ iwu n’ọnụ ya;+ n’ihi na ọ bụ onye ozi Jehova nke ụsụụ ndị agha.+  “Ma unu onwe unu, unu ahapụwo ụzọ ahụ.+ Unu emewo ka ọtụtụ ndị sụọ ngọngọ n’ịgbaso iwu ahụ.+ Unu emebiwo ọgbụgba ndụ Livaị,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.  “Ma mụ onwe m ga-eme ka unu bụrụ ndị a na-eleda anya na ndị dị ala n’anya ndị niile,+ ebe ọ bụ na unu adịghị agbaso ụzọ m, kama unu na-ele mmadụ anya n’ihu n’ihe metụtara iwu.”+ 10  “Ọ́ bụghị otu nna ka anyị niile nwere?+ Ọ́ bụghị otu Chineke kere anyị?+ Gịnị mere anyị ji aghọ ibe anyị aghụghọ,+ na-emerụ ọgbụgba ndụ ndị nna nna anyị?+ 11  Juda aghọwo aghụghọ, e mewokwa ihe arụ n’Izrel nakwa na Jeruselem;+ n’ihi na Juda emerụwo ịdị nsọ Jehova,+ bụ́ nke Ọ hụrụ n’anya, ọ lụrụwokwa ada nke chi ndị mba ọzọ.+ 12  Jehova ga-ebipụ onye ọ bụla nke na-eme otú ahụ+ n’ụlọikwuu Jekọb, onye mụ anya na onye na-azaghachi, nakwa onye na-ewetara Jehova nke ụsụụ ndị agha onyinye inweta ihu ọma.”+ 13  “Nke a bụ ihe nke abụọ unu na-eme, ọ na-akpata ịkwa ákwá na ịsụ ude, na-emekwa ka anya mmiri kpuchie ebe ịchụàjà Jehova, nke mere na a dịkwaghị anabata onyinye inweta ihu ọma, a dịghịkwa ele ihe ọ bụla si n’aka unu anya ọma.+ 14  Unu sịkwara, ‘Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?’+ Ọ bụ n’ihi na Jehova agbawo akaebe n’etiti gị na nwunye ị lụrụ n’okorobịa,+ bụ́ onye ị ghọworo aghụghọ, ọ bụ ezie na ọ bụ nwaanyị gị nakwa nwunye gị na ya gbara ndụ.+ 15  O nwere onye na-emeghị otú ahụ, ebe ọ bụ na mmụọ nsọ ka fọdụrụ n’ime ya. Gịnịkwa ka onye ahụ na-achọ? Ọ bụ mkpụrụ nke Chineke.+ Lezienụ mmụọ unu anya,+ ka onye ọ bụla ghara ịghọ nwunye ọ lụrụ n’okorobịa aghụghọ.+ 16  N’ihi na ọ kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị,”+ ka Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru; “kpọọkwa onye ji ime ihe ike kpuchie uwe ya,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. “Lezienụ mmụọ unu anya, unu aghọkwala aghụghọ.+ 17  “Unu emewo ka ike unu gwụ Jehova site n’okwu unu,+ unu sịkwara, ‘Olee otú anyị si mee ka ike anyị gwụ ya?’ Site n’unu ịsị, ‘Onye ọ bụla nke na-eme ihe ọjọọ dị mma n’anya Jehova, ihe ya na-amasịkwa ya’;+ ma ọ bụ, ‘Ebee ka Chineke nke ikpe ziri ezi nọ?’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji