Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Maịka 3:1-12

3  M wee sị: “Biko, nụrụnụ, unu ndị isi Jekọb na unu ndị ọchịagha nke ụlọ Izrel.+ Ọ́ bụghị unu ka ọ dịịrị ịmara ihe bụ́ ikpe ziri ezi?+  Unu ndị kpọrọ ihe ọma asị+ ma hụ ihe ọjọọ n’anya,+ na-agba ndị mmadụ akpụkpọ, na-adọpụsịkwa uru ahụ́ n’ọkpụkpụ ha;+  unu ndị riworo anụ ahụ́ nke ndị m,+ gbaa ha akpụkpọ, kụrie ọkpụkpụ ha, gwerisiekwa ha dị ka ihe a wụnyere n’ite nwere ọnụ obosara, dịkwa ka anụ dị n’ime ite e ji esi nri.+  N’oge ahụ, ha ga-akpọku Jehova maka enyemaka, ma ọ gaghị aza ha.+ Ọ ga-ewepụ ihu ya n’ebe ha nọ n’oge ahụ,+ n’ihi ihe ọjọọ ha mere.+  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru megide ndị amụma na-eme ka ndị m kpafuo,+ ndị ọ na-abụ ha were ezé ha taa ihe,+ ha etie, ‘Udo!’+ ma ọ bụrụ na mmadụ etinyeghị ha ihe n’ọnụ, ha ebuso onye ahụ agha,*+  ‘N’ihi ya, chi ga-ejiri unu,+ ka ọhụụ wee ghara ịdị;+ ọchịchịrị ga-agbachiri unu, ka unu wee ghara ịdị na-agba afa. Anyanwụ ga-ada n’ihi ndị amụma, chi ga-ejibido ha.+  Ihere ga-emekwa+ ndị na-ahụ ọhụụ,+ a ga-emechukwa ndị na-agba afa+ ihu. Ha niile ga-ekpuchi afụ ọnụ ha,*+ n’ihi na Chineke azaghị ha ihe ọ bụla.’”+  Ma mụ onwe m, mmụọ Jehova emewo ka m jupụta n’ike, jupụtakwa n’ikpe ziri ezi na ịdị ike,+ ka m wee gwa Jekọb nnupụisi ya, gwakwa Izrel mmehie ya.+  Biko, nụrụnụ ihe a, unu ndị isi nke ụlọ Jekọb na unu ndị ọchịagha nke ụlọ Izrel,+ ndị kpọrọ ikpe ziri ezi asị, ndị na-eme ka ọbụna ihe kwụ ọtọ gbagọọ agbagọ;+ 10  ha na-eji mwụfu ọbara ewu Zayọn, na-ejikwa ajọ omume ewu Jeruselem.+ 11  Ndị isi ya anaghị ekpe ikpe ma ọ bụrụ na e nyeghị ha ngarị,+ ndị nchụàjà ya anaghị ezi ihe ma ọ bụrụ na a kwụghị ha ụgwọ,+ ndị amụma ya na-agba afa iji nweta ego;+ ma n’ebe Jehova nọ ka ha dabeere, na-asị: “Ọ̀ bụ na Jehova anọghị n’etiti anyị?+ Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị.”+ 12  Ya mere, a ga-akọ Zayọn dị ka ubi n’ihi unu, Jeruselem ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe,+ ugwu ụlọ nsọ ga-adịkwa ka ebe dị elu nke dị n’oké ọhịa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “ha edoo agha nsọ megide onye ahụ.”
Ya bụ, ajị dị n’elu egbugbere ọnụ.