Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Levitikọs 5:1-19

5  “‘Ọ bụrụ na mkpụrụ obi+ emehie site n’ịnụ ka a nọ n’ihu ọha na-abụ ọnụ,+ o wee bụrụ na ọ nọ mgbe o mere, ma ọ bụ, na ọ hụrụ ya ma ọ bụ mara banyere ya, ma o kwughị ya,+ ọ ga-aza ajụjụ maka njehie ya.  “‘Ma ọ bụ mgbe mkpụrụ obi metụrụ ihe na-adịghị ọcha aka, ma ọ̀ bụ ozu anụ ọhịa na-adịghị ọcha ma ọ̀ bụ ozu anụ ụlọ na-adịghị ọcha ma ọ̀ bụ ozu ihe e kere eke na-enupụta n’ìgwè bụ́ ndị na-adịghị ọcha,+ ọ bụ ezie na ọ maghị na o metụrụ ya aka,+ ọ bụ onye na-adịghị ọcha, ọ bụ onye ikpe mara.+  Ma ọ bụ, ọ bụrụ na o metụ ihe ọ bụla pụrụ ime ka mmadụ ghara ịdị ọcha aka,+ mmadụ ọ bụla na-adịghị ọcha ma ọ bụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha, nke pụrụ ime ka ọ ghara ịdị ọcha, ọ bụ ezie na ọ maghị na o metụrụ ya aka, o wee mesịa mata banyere ya, ọ bụ onye ikpe mara.  “‘Ma ọ bụ, ọ bụrụ na mkpụrụ obi aṅụọ iyi wee jiri egbugbere ọnụ ya kwuo okwu n’echeghị echiche,+ iji mee ihe ọjọọ+ ma ọ bụ ihe ọma, n’ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịṅụ iyi na ya wee kwuo okwu n’echeghị echiche,+ ọ bụ ezie na ọ maghị na o mere otú ahụ, ma ya emesịa mata ya, ọ bụ onye ikpe mara n’otu n’ime ihe ndị a.  “‘Ọ bụrụkwa na ikpe mara ya na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a, ọ ga-ekwupụta+ otú o siri mehie.  Ọ ga-ewetara Jehova àjà ikpe ọmụma ya,+ ya bụ, obere nne atụrụ ma ọ bụ obere nne ewu,+ ka ọ bụrụ àjà mmehie maka mmehie o mere; onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya.+  “‘Ma ọ bụrụ na ọ gaghị ewetali atụrụ,+ ọ ga-ewetara Jehova nduru abụọ+ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ ka ọ bụrụ àjà ikpe ọmụma maka mmehie o mere, otu ga-abụ maka àjà mmehie,+ otu abụrụ maka àjà nsure ọkụ.  Ọ ga-ewetara ha onye nchụàjà, bụ́ onye ga-ebu ụzọ nye nke mbụ ka ọ bụrụ àjà mmehie wee si n’ihu olu ya tụbie ya olu,+ ma ọ gaghị atụbipụ ya isi.  Ọ ga-efesa ọbara anụ àjà mmehie ahụ n’elu akụkụ ebe ịchụàjà, ma ọ ga-ahapụ ọbara ya nke fọdụrụ ka ọ gbasịa n’ala ebe ịchụàjà.+ Ọ bụ àjà mmehie. 10  Ma ọ ga-eme nke ọzọ otú a na-eme anụ àjà nsure ọkụ dị ka usoro ya si dị;+ onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie o mere,+ a ga-agbaghara ya.+ 11  “‘Ma ọ bụrụ na o nweghị ike iweta+ nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, ọ ga-eweta otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa+ ntụ ọka* e gwere nke ọma ka ọ bụrụ àjà mmehie maka mmehie o mere. Ọ gaghị awụ mmanụ+ n’elu ya, ọ gaghịkwa atụkwasị frankinsens n’elu ya, n’ihi na ọ bụ àjà mmehie.+ 12  Ọ ga-ewetara ya onye nchụàjà, onye nchụàjà ga-esikwa na ya kporo otu nju aka ka ọ bụrụ ihe ncheta ya,+ ọ ga-esurekwa ya n’ọkụ n’elu ebe ịchụàjà, n’elu àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova.+ Ọ bụ àjà mmehie.+ 13  Onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie+ o mere, bụ́ nke ọ bụla n’ime mmehie ndị a, a ga-agbaghara ya; ihe fọdụrụ n’ime ya ga-aghọkwa nke onye nchụàjà+ dị nnọọ ka àjà ọka.’” 14  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: 15  “Ọ bụrụ na mkpụrụ obi emee omume ekwesịghị ntụkwasị obi wee mehie n’amaghị ama site n’imebi ihe ndị dị nsọ nke Jehova,+ ọ ga-esi n’ìgwè ewu na atụrụ wetara Jehova ebule ahụ́ dị mma ịbụ àjà ikpe ọmụma ya,+ dị ka ọnụ ahịa shekel ọlaọcha+ ole e kwuru si dị, ma e jiri shekel ebe nsọ tụọ ya, ka ọ bụrụ àjà ikpe ọmụma. 16  Ọ ga-eweta ihe iji kwụọ ụgwọ maka mmehie o mere megide ebe nsọ ahụ, ọ ga-atụkwasịkwa ya otu ụzọ n’ụzọ ise+ nke ihe o wetara, ọ ga-enyekwa ya onye nchụàjà, ka onye nchụàjà wee were ebule àjà ikpe ọmụma kpuchiere ya mmehie ya,+ a ga-agbaghara ya.+ 17  “Ọ bụrụ na mkpụrụ obi emehie wee mee otu n’ime ihe niile Jehova nyere iwu ka a ghara ime, ọ bụ ezie na ọ maghị+ na o mere ya, ọ bụ onye ikpe mara, ọ ga-azakwa ajụjụ maka njehie ya.+ 18  Ọ ga-esikwa n’ìgwè ewu na atụrụ wetara onye nchụàjà ebule ahụ́ dị mma dị ka ọnụ ahịa e kwuru si dị, ka ọ bụrụ àjà ikpe ọmụma;+ onye nchụàjà ga-ekpuchikwara ya mmehie+ o mere n’amaghị ama, ọ bụ ezie na ọ maghị na o mere ya, a ga-agbaghara ya.+ 19  Ọ bụ àjà ikpe ọmụma. Ọ bụ onye ikpe mara+ n’ihu Jehova.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.