Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Levitikọs 23:1-44

23  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:  “Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Ememme ndị a na-emere Jehova n’oge a kara aka+ bụ́ ndị unu ga-akpọsa+ bụ mgbakọ dị nsọ. Ndị a bụ ememme m ndị a ga na-eme n’oge a kara aka:  “‘Ụbọchị isii ka a ga-arụ ọrụ, ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike, nke a ga-ezu naanị ike na ya,+ ọ bụ mgbakọ dị nsọ. Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla. Ọ bụ ụbọchị izu ike nye Jehova n’ebe niile unu bi.+  “‘Ndị a bụ ememme ndị a na-emere Jehova n’oge a kara aka,+ mgbakọ dị nsọ,+ ndị unu ga-akpọsa n’oge ha a kara aka:+  N’ọnwa mbụ, n’abalị iri na anọ n’ọnwa ahụ,+ ná mgbede, ka a ga-emere Jehova ememme ngabiga.+  “‘Abalị iri na ise n’ọnwa a bụ ụbọchị ememme achịcha na-ekoghị eko nke a na-emere Jehova.+ Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa.+  N’ụbọchị mbụ ka unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla siri ike.  Kama unu ga-achụrụ Jehova àjà a na-esure n’ọkụ ruo ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asaa, a ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla siri ike.’”  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: 10  “Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu batara n’ala ahụ m ga-enye unu, unu ewee wee ihe ubi ya, unu ga-ewetara onye nchụàjà otu ùkwù ọka* nke si n’ihe mbụ+ unu wetara n’ubi unu. 11  Onye nchụàjà ga-efegharị+ ùkwù ọka ahụ n’ihu Jehova iji nwetara unu ihu ọma. N’ụbọchị na-esote ụbọchị izu ike ka onye nchụàjà ga-efegharị ya. 12  N’ụbọchị unu ga-eme ka e fegharịa ùkwù ọka ahụ, unu ga-achụ nwa ebule ahụ́ dị mma, nke na-agafebeghị otu afọ, n’àjà, ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ a chụụrụ Jehova; 13  chụọkwa ụzọ abụọ n’ime ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, n’àjà, ka ọ bụrụ àjà ọka ya, dị ka àjà na-esi ísì ụtọ nke e sureere Jehova n’ọkụ; chụọkwa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin mmanya n’àjà ka ọ bụrụ àjà ihe ọṅụṅụ ya. 14  Unu atala achịcha ọ bụla ma ọ bụ ọka a ṅara n’ọkụ ma ọ bụ ọka ọhụrụ ruo n’ụbọchị ahụ,+ ruo mgbe unu wetara onyinye unu na-enye Chineke unu. Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka n’ebe niile unu ga-ebi. 15  “‘Unu ga-agụpụtara onwe unu ụbọchị izu ike asaa+ malite n’ụbọchị na-esote ụbọchị izu ike ahụ, malite n’ụbọchị unu wetara ùkwù ọka àjà a na-efegharị efegharị. Ha ga-ezu ezu. 16  Unu ga-agụ ya ruo n’ụbọchị na-esote ụbọchị izu ike nke asaa ahụ, ụbọchị iri ise,+ unu ga-ewetakwara Jehova àjà ọka ọhụrụ.+ 17  Unu ga-esi n’ebe obibi unu weta ogbe achịcha abụọ+ ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị. A ga-eji ụzọ abụọ n’ime ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ntụ ọka e gwere nke ọma mee ha. A ga-eji ihe na-eko achịcha mee ha,+ ka ha bụrụ mkpụrụ mbụ kara aka nye Jehova.+ 18  Unu ga-ewetakwa ogbe achịcha ndị ahụ, ha na ebule asaa ahụ́ dị mma,+ ndị gbara otu afọ otu afọ, na otu nwa ehi na ebule abụọ. Ha ga-abụ àjà nsure ọkụ a chụụrụ Jehova, ha na àjà ọka ha na àjà ihe ọṅụṅụ ha dị ka àjà a na-esure n’ọkụ, ka ha bụrụ ihe na-esi ìsì ụtọ nye Jehova. 19  Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà+ ka ọ bụrụ àjà mmehie, chụọkwa ụmụ ebule abụọ ndị gbara otu afọ otu afọ n’àjà, ka ha bụrụ àjà udo.+ 20  Onye nchụàjà ga-efegharị ha,+ ha na ogbe achịcha ndị ahụ e ji mkpụrụ mbụ kara aka mee, ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova, ha na ebule abụọ ahụ. Ha ga-abụrụ Jehova ihe dị nsọ nke dịịrị onye nchụàjà.+ 21  Unu ga-eme mkpọsa+ n’ụbọchị ahụ; unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Ọ dịghị ọrụ ọ bụla siri ike unu ga-arụ. Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka n’ebe niile unu ga-ebi. 22  “‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi nke ala unu, unu ewerechala ihe dị n’ọnụ ọnụ ubi unu mgbe unu na-ewe ya, unu atụtụkọtala ihe unu wefọrọ n’ubi unu.+ Unu ga-ahapụ ha maka ndị nọ n’ahụhụ+ na ndị mbịarambịa.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’” 23  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: 24  “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘N’ọnwa nke asaa,+ n’abalị mbụ n’ọnwa ahụ, unu ga-ezu naanị ike, ụbọchị a ga-eji ụda opi na-echeta,+ ọ bụ mgbakọ dị nsọ.+ 25  Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla siri ike, unu ga-achụkwara Jehova àjà a na-esure n’ọkụ.’” 26  Jehova gwakwara Mozis, sị: 27  “Otú ọ dị, abalị iri n’ọnwa nke asaa nke a ga-abụ ụbọchị mkpuchi mmehie.+ Unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ, unu ga-emekpa mkpụrụ obi unu ahụ́,+ chụọkwara Jehova àjà+ a na-esure n’ọkụ. 28  Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla n’ụbọchị a, n’ihi na ọ bụ ụbọchị mkpuchi mmehie iji kpuchiere unu mmehie+ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu; 29  n’ihi na mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emekpaghị onwe ya ahụ́ n’ụbọchị a, a ga-ebipụ ya n’etiti ndị ya.+ 30  Mkpụrụ obi ọ bụla nke rụrụ ụdị ọrụ ọ bụla n’ụbọchị a, m ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ n’etiti ndị ya.+ 31  Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla.+ Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka n’ebe unu ga-ebi. 32  Ọ bụ ụbọchị izu ike, nke unu ga-ezu naanị ike na ya,+ unu ga-emekpakwa+ mkpụrụ obi unu ahụ́ n’ụbọchị nke itoolu n’ọnwa ahụ, ná mgbede ya. Unu ga-edebe ụbọchị izu ike unu malite ná mgbede ruo ná mgbede.” 33  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: 34  “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Abalị iri na ise n’ọnwa nke asaa nke a bụ ụbọchị ememme ụlọ ndò a na-emere Jehova ruo ụbọchị asaa.+ 35  Ụbọchị nke mbụ bụ mgbakọ dị nsọ. Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla siri ike. 36  Unu ga-achụrụ Jehova àjà a na-esure n’ọkụ ruo ụbọchị asaa. N’ụbọchị nke asatọ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ,+ unu ga-achụkwara Jehova àjà a na-esure n’ọkụ. Ọ bụ nzukọ ukwu. Unu agaghị arụ ụdị ọrụ ọ bụla siri ike. 37  “‘Ndị a bụ ememme a na-emere Jehova n’oge a kara aka+ bụ́ ndị unu ga-akpọsa dị ka mgbakọ dị nsọ,+ maka ịchụrụ Jehova àjà a na-esure n’ọkụ:+ àjà nsure ọkụ+ na àjà ọka+ nke àjà ahụ na àjà ihe ọṅụṅụ,+ dị ka usoro a na-agbaso kwa ụbọchị si dị, 38  ma e wezụga ụbọchị izu ike niile nke Jehova,+ wezụga onyinye unu,+ wezụga onyinye niile unu kwere ná nkwa,+ wezụgakwa onyinye afọ ofufo unu niile,+ bụ́ nke unu ga-enye Jehova. 39  Otú ọ dị, n’abalị iri na ise n’ọnwa nke asaa, mgbe unu chịkọtaworo ihe ala unu mepụtara, unu ga-eme ememme+ Jehova ruo ụbọchị asaa.+ Ụbọchị nke mbụ ga-abụ ụbọchị a ga-ezu naanị ike, ụbọchị nke asatọ ga-abụkwa ụbọchị a ga-ezu naanị ike.+ 40  N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-aghọrọ mkpụrụ nke osisi ndị mara mma, gburukwa igu nkwụ+ na alaka nke osisi ndị wara alaka na osisi pọpla nke ndagwurugwu, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ+ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu ruo ụbọchị asaa. 41  Unu ga-eme ya dị ka ememme a na-emere Jehova ruo ụbọchị asaa n’afọ.+ Nke a bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka, unu ga-eme ya n’ọnwa nke asaa. 42  Ọ bụ n’ụlọ ndò ka unu ga-ebi ruo ụbọchị asaa.+ Ụmụ afọ Izrel niile ga-ebi n’ụlọ ndò,+ 43  ka ọgbọ unu niile wee mara+ na ọ bụ n’ụlọ ndò ka m mere ka ụmụ Izrel biri mgbe m na-akpọpụta ha n’ala Ijipt.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’” 44  Mozis wee gwa ụmụ Izrel banyere ememme ndị a na-emere Jehova n’oge a kara aka.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.