Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Levitikọs 14:1-57

14  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:  “Nke a ga-abụ iwu metụtara onye ekpenta+ n’ụbọchị a ga-ekwupụta na ọ dị ọcha, mgbe a ga-akpọrọ ya gakwuru onye nchụàjà.+  Onye nchụàjà ga-aga ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu, onye nchụàjà ga-ele ya anya n’ahụ́; ọ bụrụ na a gwọwo ekpenta+ nke na-eme onye ekpenta ahụ,  mgbe ahụ onye nchụàjà ga-enye iwu ka o weta nnụnụ abụọ dị ndụ bụ́ ndị dị ọcha+ nakwa osisi sida+ na ákwà na-acha uhie uhie+ na ahịhịa hisop+ iji mee onwe ya ka ọ dị ọcha.  Onye nchụàjà ga-enyekwa iwu, a ga-egbu otu nnụnụ n’ime ite ụrọ nke mmiri iyi dị n’ime ya.+  Ma ọ ga-ewere nnụnụ ahụ dị ndụ na osisi sida ahụ na ákwà ahụ na-acha uhie uhie na ahịhịa hisop ahụ, ọ ga-asụnye ha, tinyere nnụnụ ahụ dị ndụ, n’ime ọbara nke nnụnụ ahụ e gburu n’elu mmiri iyi ahụ.  Mgbe ahụ, ọ ga-efesa+ ya ugboro asaa+ n’ahụ́ onye ahụ nke na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha pụọ n’ekpenta, ọ ga-ekwupụtakwa na ọ dị ọcha,+ ọ ga-ahapụkwa nnụnụ ahụ dị ndụ ka o feba n’ọhịa.+  “Onye ahụ nke na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha ga-asụ uwe ya+ ma kpụọ ntutu isi ya niile ma saa ahụ́+ na mmiri wee dị ọcha, e mesịakwa, ọ ga-abata n’ebe ha mara ụlọikwuu. Ọ gaghị abanye n’ụlọikwuu ya ruo ụbọchị asaa.+  Ọ ga-erukwa n’ụbọchị nke asaa na ọ ga-akpụ ntutu niile dị ya n’isi,+ na ajị agba ya na iku anya ya. Ee, ọ ga-akpụ ntutu ya niile, ọ ga-asụkwa uwe ya ma saa ahụ́ na mmiri; ọ ga-adịkwa ọcha. 10  “N’ụbọchị nke asatọ,+ ọ ga-akpụrụ ụmụ ebule abụọ ahụ́ dị mma na otu nne atụrụ,+ nke na-agafebeghị otu afọ, kporokwa ụzọ atọ n’ime ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka* e gwere nke ọma ka ọ bụrụ àjà ọka+ nke a gwara mmanụ na otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ lọg mmanụ;+ 11  onye nchụàjà nke kwupụtara na ọ dị ọcha ga-akpọta onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha, wetakwa ihe ndị ahụ, n’ihu Jehova n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 12  Onye nchụàjà ga-akpụrụ otu nwa ebule chụọ ya n’àjà ka ọ bụrụ àjà ikpe ọmụma,+ tinyere ihe ọ̀tụ̀tụ̀ lọg+ mmanụ ahụ, ọ ga-efegharị ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị+ n’ihu Jehova. 13  Ọ ga-egbu nwa ebule ahụ n’ebe+ a na-egbu anụ àjà mmehie na anụ àjà nsure ọkụ, n’ebe dị nsọ,+ n’ihi na, dị ka anụ àjà mmehie, anụ àjà ikpe ọmụma bụ nke onye nchụàjà.+ Ọ bụ ihe kasị nsọ. 14  “Onye nchụàjà ga-eweretụ ọbara anụ àjà ikpe ọmụma ahụ, onye nchụàjà ga-etekwa ya n’ọnụ ọnụ ntị aka nri nke onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ya nakwa na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ya.+ 15  Onye nchụàjà ga-agbaratụ mmanụ n’ime ihe ọ̀tụ̀tụ̀ lọg+ mmanụ ahụ ma wụnye ya n’ọbụ aka aka ekpe nke ya. 16  Onye nchụàjà ga-arụnye mkpịsị aka aka nri ya ná mmanụ ahụ dị n’ọbụ aka aka ekpe ya wee fesa mmanụ ahụ n’ala ugboro asaa+ n’ihu Jehova. 17  Ma onye nchụàjà ga-ete mmanụ ahụ fọdụrụ n’ọbụ aka ya n’ọnụ ọnụ ntị aka nri nke onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ya nakwa na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ya n’elu ọbara nke anụ àjà ikpe ọmụma ahụ.+ 18  Ma onye nchụàjà ga-ete nke fọdụrụ ná mmanụ ahụ dị n’ọbụ aka ya n’isi onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha, onye nchụàjà ga-ekpuchiri ya mmehie ya+ n’ihu Jehova. 19  “Onye nchụàjà ga-achụ anụ àjà mmehie+ ahụ n’àjà wee kpuchiere onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha adịghị ọcha ya, e mesịakwa, ọ ga-egbu anụ àjà nsure ọkụ ahụ. 20  Onye nchụàjà ga-achụ anụ àjà nsure ọkụ ahụ na àjà ọka+ ahụ n’elu ebe ịchụàjà, onye nchụàjà+ ga-ekpuchiri ya mmehie ya;+ ọ ga-aghọkwa onye dị ọcha.+ 21  “Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ bụ ogbenye,+ aka ya erughịkwa ya+, ọ ga-eweta otu nwa ebule dị ka àjà ikpe ọmụma ka ọ bụrụ àjà a na-efegharị efegharị iji kpuchiere ya mmehie ya, wetakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka, wetakwa otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ lọg mmanụ, 22  na nduru abụọ+ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ, dị ka ihe aka ya ruru si dị, otu ga-abụ anụ àjà mmehie, nke ọzọ ga-abụ anụ àjà nsure ọkụ. 23  N’ụbọchị nke asatọ,+ ọ ga-ewetara ha onye nchụàjà n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute,+ n’ihu Jehova, ka e wee kwupụta na ọ dịwo ọcha.+ 24  “Onye nchụàjà ga-akpụrụ nwa ebule ahụ bụ́ anụ àjà ikpe ọmụma,+ werekwa ihe ọ̀tụ̀tụ̀ lọg mmanụ ahụ, onye nchụàjà ga-efegharịkwa ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova.+ 25  Ọ ga-egbu nwa ebule àjà ikpe ọmụma ahụ, onye nchụàjà ga-eweretụ ọbara anụ àjà ikpe ọmụma ahụ tee n’ọnụ ọnụ ntị aka nri nke onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ya nakwa na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ya.+ 26  Onye nchụàjà ga-awụnye ụfọdụ n’ime mmanụ ahụ n’ọbụ aka aka ekpe nke ya.+ 27  Onye nchụàjà ga-eji mkpịsị aka aka nri ya fesa+ mmanụ ahụ dị n’ọbụ aka aka ekpe ya n’ala ugboro asaa n’ihu Jehova. 28  Onye nchụàjà ga-ete mmanụ ahụ dị n’ọbụ aka ya n’ọnụ ọnụ ntị aka nri onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha nakwa na mkpịsị aka ukwu nke aka nri ya nakwa na mkpịsị ụkwụ ukwu nke ụkwụ aka nri ya n’elu ebe ahụ o tere ọbara anụ àjà ikpe ọmụma ahụ.+ 29  Ma onye nchụàjà ga-ete nke fọdụrụ ná mmanụ ahụ dị n’ọbụ aka ya n’isi+ onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha iji kpuchiere ya mmehie ya n’ihu Jehova. 30  “Ọ ga-achụ otu n’ime nduru ahụ ma ọ bụ otu n’ime kpalakwukwu ahụ aka ya ruru n’àjà,+ 31  otu n’ime ha nke o wetaliri ga-abụ àjà mmehie,+ nke ọzọ ga-abụ àjà nsure ọkụ,+ tinyere àjà ọka ahụ; onye nchụàjà ga-ekpuchiri onye ahụ na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha mmehie ya+ n’ihu Jehova. 32  “Ọ bụ nke a bụ iwu metụtara onye nwere ọrịa ekpenta bụ́ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya mgbe a ga-ekwupụta na ọ dịwo ọcha.” 33  Jehova wee gwa Mozis na Erọn, sị: 34  “Mgbe unu batara n’ala Kenan,+ bụ́ nke m ga-enye unu ka ọ bụrụ ala unu,+ e wee nwee ụlọ m tinyere ọrịa ekpenta na ya n’ala unu ga-enweta,+ 35  onye nwe ụlọ ahụ ga-abịa gwa onye nchụàjà, sị, ‘Ahụwo m ihe dị ka ọrịa n’ụlọ m.’ 36  Onye nchụàjà ga-enye iwu, ha ga-ewepụsị ihe dị n’ụlọ ahụ tupu onye nchụàjà abata ịhụ ihe ahụ yiri ọrịa, ka ọ ghara ikwupụta na ihe niile dị n’ụlọ ahụ adịghị ọcha; mgbe e mesịrị, onye nchụàjà ga-abata lee ụlọ ahụ. 37  Mgbe ọ hụrụ ihe ahụ yiri ọrịa, ọ bụrụ na ọ bụ n’ahụ́ ụlọ ka ọrịa ahụ dị, ya enweekwa ebe ndị dakpuru ime, ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma ọ bụ ọbara ọbara, ya abụrụkwa na otú ọ dị n’anya gosiri na ọ bara ime n’ahụ́ ụlọ ahụ, 38  onye nchụàjà ga-esi n’ụlọ ahụ pụta gaa n’ọnụ ụzọ ụlọ ahụ, mechie ya+ ka a ghara ịba n’ime ya ruo ụbọchị asaa. 39  “Onye nchụàjà ga-abịaghachi n’ụbọchị nke asaa wee lee ya anya;+ ọ bụrụ na ọrịa ahụ agbasawo n’ahụ́ ụlọ ahụ, 40  onye nchụàjà ga-enye iwu, ha ga-akụpụta+ nkume ndị ọrịa ahụ dị na ha, ha ga-ekpofu ha ná mpụga obodo, n’ebe na-adịghị ọcha. 41  Ọ ga-ahụ na a kpụchasịrị ime ụlọ ahụ gburugburu, ha ga-ekporo ájá ụrọ ha kpụchapụtara kpoga ná mpụga obodo, n’ebe na-adịghị ọcha. 42  Ha ga-ewere nkume ndị ọzọ dochie nkume ndị nke mbụ; ọ ga-ahụ na e wetara ájá ụrọ ọzọ, ọ ga-ahụkwa na e techiri ahụ́ ụlọ ahụ. 43  “Ma ọ bụrụ na ọrịa ahụ abịaghachi wee pụta n’ụlọ ahụ mgbe a kụpụtasịworo nkume ndị ahụ na mgbe a kpụchasịworo ahụ́ ụlọ ahụ ma techie ya, 44  onye nchụàjà+ ga-abata lee ya anya; ọ bụrụ na ọrịa ahụ agbasawo n’ụlọ ahụ, ọ bụ ajọ ekpenta+ pụtara n’ụlọ ahụ. Ọ dịghị ọcha. 45  Ọ ga-ahụ na a kwaturu ụlọ ahụ, tinyere nkume ya na osisi ya na ájá ụrọ niile e ji rụọ ụlọ ahụ, ọ ga-ahụkwa na e bugara ha ná mpụga obodo, n’ebe na-adịghị ọcha.+ 46  Ma onye ọ bụla banyere n’ụlọ ahụ n’ụbọchị ndị ahụ e mechiri ya ka a ghara ịbanye na ya+ ga-aghọ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede;+ 47  onye ọ bụla dinara n’ụlọ ahụ ga-asụ uwe ya,+ onye ọ bụla riri nri n’ụlọ ahụ ga-asụ uwe ya. 48  “Otú ọ dị, ọ bụrụ na onye nchụàjà abịa lee ya anya, ma, lee, ọrịa ahụ agbasaghị n’ụlọ ahụ mgbe e techisịrị ahụ́ ụlọ ahụ, onye nchụàjà ga-ekwupụta na ụlọ ahụ dị ọcha, n’ihi na e gbuwo ọrịa ahụ.+ 49  Ọ ga-ewere nnụnụ abụọ+ na osisi sida+ na ákwà na-acha uhie uhie+ na ahịhịa hisop sachapụ ụlọ ahụ mmehie. 50  Ọ ga-egbu otu nnụnụ n’ime ite ụrọ nke mmiri iyi dị n’ime ya.+ 51  Ọ ga-ewere osisi sida ahụ na ahịhịa hisop+ na ákwà na-acha uhie uhie na nnụnụ ahụ dị ndụ, sụnye ha n’ime ọbara nke nnụnụ ahụ e gburu na mmiri iyi, ọ ga-efegakwa ya+ ugboro asaa+ n’ụlọ ahụ. 52  Ọ ga-eji ọbara nnụnụ ahụ na mmiri iyi ahụ na nnụnụ ahụ dị ndụ na osisi sida ahụ na ahịhịa hisop ahụ na ákwà ahụ na-acha uhie uhie sachapụ ụlọ ahụ mmehie. 53  Ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ dị ndụ ná mpụga obodo ka o feba n’ọhịa, ọ ga-ekpuchiri ụlọ ahụ mmehie;+ ụlọ ahụ ga-adịkwa ọcha. 54  “Nke a bụ iwu banyere ekpenta+ nakwa banyere ọrịa ntutu ịdapụsị adapụsị+ 55  nakwa banyere ekpenta pụtara n’uwe+ nakwa n’ụlọ, 56  nakwa banyere ọkọ na akpụkpa na ntụpọ,+ 57  iji na-enye ntụziaka+ mgbe ihe na-adịghị ọcha nakwa mgbe ihe dị ọcha. Nke a bụ iwu banyere ekpenta.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.