Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Levitikọs 12:1-8

12  Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị:  “Gwa ụmụ Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na nwaanyị atụrụ ime+ wee mụọ nwa nwoke, nwaanyị ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa; ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha dị ka ọ na-adị mgbe ọ na-ahụ nsọ ya.+  N’ụbọchị nke asatọ, a ga-ebi nwa ahụ úgwù.+  Ọ ga-anọkwu ụbọchị iri atọ na atọ wee na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha n’ọbara gbara ya. Ọ gaghị emetụ ihe ọ bụla dị nsọ aka, ọ gaghịkwa abata n’ebe dị nsọ ruo mgbe ụbọchị ime onwe ya ka ọ dị ọcha zuru.+  “‘Ọ bụrụ na ọ mụrụ nwa nwaanyị, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị iri na anọ, dị ka ọ na-adị mgbe ọ na-ahụ nsọ ya. Ọ ga-anọkwu ụbọchị iri isii na isii wee na-eme onwe ya ka ọ dị ọcha pụọ n’ọbara ahụ.  Mgbe ụbọchị ime onwe ya ka ọ dị ọcha maka nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwaanyị zuru, ọ ga-ewetara onye nchụàjà nwa ebule na-agafebeghị otu afọ maka àjà nsure ọkụ+ nakwa nwa kpalakwukwu ma ọ bụ nduru+ maka àjà mmehie n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.  Ọ ga-eweta ya n’ihu Jehova wee kpuchiere nwaanyị ahụ mmehie ya, ebe ọbara ya si na-asọpụta ga-adịkwa ọcha.+ Nke a bụ iwu banyere onye mụrụ nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwaanyị.  Ma ọ bụrụ na ọ gaghị ewetali atụrụ, ọ ga-ewere nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ,+ otu maka àjà nsure ọkụ, otu maka àjà mmehie, onye nchụàjà ga-ekpuchikwara ya mmehie ya,+ ọ ga-adịkwa ọcha.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji