Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Levitikọs 10:1-20

10  E mesịa, ụmụ Erọn bụ́ Nedab na Abaịhu+ weere ihe ịgụ ọkụ ha,+ onye nke ọ bụla wetara nke ya ma tinye ya ọkụ, tụkwasịkwa ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ n’elu ya, ha wee malite iji ọkụ suree ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nke iwu na-akwadoghị+ n’ihu Jehova, bụ́ nke ọ na-agwaghị ha suree.  Ọkụ wee si n’ihu Jehova pụta repịa ha,+ ha wee nwụọ n’ihu Jehova.+  Mozis wee sị Erọn: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Ka e doo m nsọ+ n’etiti ndị na-abịaru m nso,+ ka e nyekwa m otuto+ n’ihu mmadụ niile.’” Ma Erọn gbara nkịtị.  Mozis wee kpọọ Mishel na Elzefan, bụ́ ụmụ Ọziel,+ nwanne nna Erọn, wee sị ha: “Bịanụ nso, sinụ n’ihu ebe nsọ a buru ụmụnne unu gaa ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu.”+  Ha wee bịaruo nso buru ha mgbe ha ka yi uwe mwụda ha gaa ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu, dị ka Mozis kwuru.  Mozis wee gwa Erọn, gwakwa Elieza na Ịtama bụ́ ụmụ ya ndị nke ọzọ, sị: “Unu ahapụla isi unu n’edozighị ya edozi,+ unu adọwakwala uwe unu, ka unu ghara ịnwụ, ka ọ gharakwa iweso nzukọ a dum iwe;+ kama ụmụnne unu bụ́ ụlọ Izrel dum ga-akwa ákwá maka ọkụ rere ha bụ́ nke Jehova kpatara.  Unu esikwala n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute pụọ ka unu ghara ịnwụ,+ n’ihi na e tere unu mmanụ Jehova ji ete mmadụ mmanụ n’isi.”+ Ha wee mee ihe Mozis kwuru.  Jehova wee gwa Erọn, sị:  “Aṅụla mmanya ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu,+ gị na ụmụ gị ndị gị na ha nọ, mgbe unu na-abata n’ụlọikwuu nzute, ka unu ghara ịnwụ. Ọ bụ ụkpụrụ dịịrị ọgbọ unu niile ruo mgbe a na-akaghị aka, 10  iji kpaa ókè n’agbata ihe dị nsọ na ihe rụrụ arụ nakwa n’agbata ihe na-adịghị ọcha na ihe dị ọcha,+ 11  nakwa iji kụziere ụmụ Izrel+ ụkpụrụ niile Jehova si n’ọnụ Mozis nye ha.” 12  Mozis wee gwa Erọn, gwakwa Elieza na Ịtama bụ́ ụmụ ya ndị fọdụrụ, sị: “Werenụ àjà ọka*+ fọdụrụ n’àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova, nọrọkwanụ nso n’ebe ịchụàjà rie ya n’etinyeghị ya ihe na-eko achịcha, n’ihi na ọ bụ ihe kasị nsọ.+ 13  Unu ga-anọ n’ebe dị nsọ rie ya,+ n’ihi na ọ bụ òkè gị na òkè ụmụ gị ga na-eketa n’àjà a na-esure n’ọkụ nye Jehova; n’ihi na ọ bụ nke a ka e nyere m n’iwu. 14  Unu ga-anọ n’ebe dị ọcha rie obi anụ àjà ahụ a na-efegharị efegharị+ na ụkwụ anụ nke bụ́ òkè dị nsọ,+ gị na ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom,+ n’ihi na e nyewo ha ka ha bụrụ òkè gị na òkè ụmụ gị ga na-eketa n’àjà udo nke ụmụ Izrel. 15  Ha ga-eweta ụkwụ anụ nke bụ́ òkè dị nsọ na obi nke anụ àjà a na-efegharị efegharị,+ tinyere abụba nke àjà a na-esure n’ọkụ, ka e wee fegharịa àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova; ọ ga-abụ òkè+ gị na ụmụ gị ndị gị na ha nọ ga na-eketa ruo mgbe a na-akaghị aka, dị ka Jehova nyere n’iwu.” 16  Mozis wee chọsie ewu àjà mmehie+ ahụ ike, ma, lee! e surewo ya n’ọkụ. O wee weso Elieza na Ịtama, bụ́ ụmụ Erọn ndị fọdụrụnụ, iwe, wee sị: 17  “Gịnị mere na unu erighị anụ àjà mmehie ahụ n’ebe dị nsọ,+ ebe ọ bụ ihe kasị nsọ, o nyewokwa ya unu ka unu wee na-aza ajụjụ maka njehie nke nzukọ a iji na-ekpuchiri ha mmehie n’ihu Jehova?+ 18  Lee! E webataghị ọbara ya n’ebe nsọ nke dị n’ime.+ Unu gaara eri ya n’ebe nsọ, dị ka e nyere m n’iwu.”+ 19  Erọn wee sị Mozis: “Lee! Taa ka ha wetara àjà mmehie ha na àjà nsure ọkụ ha n’ihu Jehova,+ mgbe ihe ndị a malitere ịdakwasị m; a sị na m riri anụ àjà mmehie ahụ taa, ọ̀ ga-adị mma n’anya Jehova?”+ 20  Mgbe Mozis nụrụ nke ahụ, ọ dị mma n’anya ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Le 10:12*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.