Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọshụa 22:1-34

22  N’oge ahụ, Jọshụa kpọrọ ụmụ Ruben na ụmụ Gad na ọkara ebo Manase+  wee sị ha: “Unu onwe unu edebewo ihe niile Mozis ohu Jehova nyere unu n’iwu,+ unu rubekwaara m isi n’ihe niile m nyere unu n’iwu.+  Unu ahapụghị ụmụnne unu kemgbe ọtụtụ ụbọchị+ ndị a ruo taa, unu edebewokwa ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere n’iwu.+  Jehova bụ́ Chineke unu enyewo ụmụnne unu ezumike, dị nnọọ ka o kwere ha ná nkwa.+ Ugbu a, tụgharịanụ laa n’ụlọikwuu unu n’ala unu, nke Mozis ohu Jehova nyere unu n’ofe Jọdan.+  Naanị lezienụ anya debe ntụziaka+ na iwu ahụ Mozis ohu Jehova nyere unu site n’ịhụ Jehova bụ́ Chineke unu+ n’anya nakwa ije ije n’ụzọ ya niile,+ sitekwa n’idebe ihe o nyere n’iwu+ na ịrapara n’ahụ́ ya,+ sitekwa n’iji obi+ unu dum na mkpụrụ obi+ unu dum na-ejere ya ozi.”+  Jọshụa wee gọzie+ ha ma gwa ha ka ha laa n’ụlọikwuu ha.  Mozis nyekwara ọkara ebo Manase ihe nketa na Beshan,+ Jọshụa wee nye ọkara nke ọzọ na ụmụnne ha ndị nọ n’akụkụ ọdịda anyanwụ+ nke Jọdan ihe nketa. Ya mere, mgbe Jọshụa gwara ha ka ha laa n’ụlọikwuu ha, ọ gọziri ha.  O wee gaa n’ihu ịsị ha: “Jirinụ ọtụtụ akụ̀ na ọtụtụ anụ ụlọ laghachi n’ụlọikwuu unu, jirikwanụ ọlaọcha na ọlaedo na ọla kọpa na ígwè na uwe dị nnọọ ukwuu.+ Werenụ òkè unu n’ihe a kwatara+ n’aka ndị iro unu, unu na ụmụnne unu.”  E mesịa, ụmụ Ruben na ụmụ Gad nakwa ọkara ebo Manase si n’ebe ụmụ Izrel ndị ọzọ nọ pụọ, ya bụ, na Shaịlo, nke dị n’ala Kenan, wee lawa, ka ha wee laa n’ala Gilied,+ n’ala ha nwetara, bụ́ ebe e mere ka ha biri dị ka iwu Jehova nyere site n’ọnụ Mozis si dị.+ 10  Mgbe ha bịarutere n’ógbè Jọdan ndị dị n’ala Kenan, ụmụ Ruben na ụmụ Gad na ọkara ebo Manase wuru ebe ịchụàjà+ n’ebe ahụ n’akụkụ Jọdan, bụ́ ebe ịchụàjà nke dị ukwuu n’ile anya. 11  E mesịa, ụmụ Izrel ndị ọzọ nụrụ+ ka a sịrị: “Lee! Ụmụ Ruben na ụmụ Gad na ọkara ebo Manase ewuwo ebe ịchụàjà n’ókè nke ala Kenan nke dị n’ógbè Jọdan, ná mpaghara bụ́ nke ụmụ Izrel.” 12  Mgbe ụmụ Izrel nụrụ ya, nzukọ ụmụ Izrel+ dum gbakọrọ na Shaịlo+ ịga buso ha agha.+ 13  Ụmụ Izrel wee zipụ+ Finihas+ nwa Elieza onye nchụàjà ka ọ gakwuru ụmụ Ruben na ụmụ Gad na ọkara ebo Manase, bụ́ ndị bi n’ala Gilied, 14  ha zipụrụ ya na ndị isi iri, otu onyeisi si n’ọnụmara ọ bụla dị n’ebo niile nke Izrel, onye ọ bụla n’ime ha bụ onyeisi nke ụlọ nna ya n’ime puku kwuru puku ndị Izrel.+ 15  E mesịa, ha bịakwutere ụmụ Ruben na ụmụ Gad na ọkara ebo Manase n’ala Gilied wee malite ịgwa ha okwu,+ sị: 16  “Nke a bụ ihe nzukọ Jehova dum+ kwuru, ‘Gịnị bụ omume ekwesịghị ntụkwasị obi+ nke a unu mesoro Chineke Izrel site n’ịkwụsị+ taa iso Jehova, site n’iwuru onwe unu ebe ịchụàjà,+ ka unu wee nupụrụ Jehova isi taa? 17  Njehie anyị jehiere na Piọ+ ọ̀ bụụrụ anyị ihe nta, bụ́ nke anyị na-asachapụbeghị n’ahụ́ anyị ruo taa, ọ bụ ezie na ihe otiti ahụ dakwasịrị nzukọ Jehova?+ 18  Ma unu onwe unu na-aga ịkwụsị iso Jehova taa; ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na unu onwe unu enupụrụ Jehova isi taa, echi ọ ga-abụ nzukọ Izrel dum ka ọ ga-eweso iwe.+ 19  Ugbu a, ọ bụrụ na ala unu nwetara adịghị ọcha,+ gafetanụ n’ala bụ́ nke Jehova,+ bụ́ ebe ụlọikwuu Jehova dị,+ birikwanụ n’etiti anyị; unu enupụkwarala Jehova isi, unu emekwala ka anyị nupụ isi site n’iwuru onwe unu ebe ịchụàjà ọzọ, tinyere ebe ịchụàjà Jehova bụ́ Chineke anyị.+ 20  Ọ́ bụghị Ekan+ nwa Zira mere omume ekwesịghị ntụkwasị obi n’ihe banyere ihe a ga-ebibi ebibi, ọ́ bụghị nzukọ Izrel dum ka e wesoro iwe?+ Ọ bụghịkwa naanị ya nwụrụ n’ihi njehie ya.’”+ 21  Ụmụ Ruben na ụmụ Gad na ọkara ebo Manase wee zaa+ ndị isi nke puku kwuru puku ndị Izrel,+ sị: 22  “Jehova Chineke,+ Onye Dị Ike,+ Jehova Chineke, Onye Dị Ike,+ ọ bụ ya maara,+ Izrel ga-amatakwa.+ Ọ bụrụ na ọ bụ ka unu nupụ isi,+ ọ bụrụkwa na ọ bụ ekwesịghị ntụkwasị obi nye Jehova,+ azọpụtala anyị taa. 23  Ọ bụrụ na ọ bụ iji wuoro onwe anyị ebe ịchụàjà iji kwụsị iso Jehova, ọ bụrụkwa na ọ bụ iji chụọ àjà nsure ọkụ na àjà ọka* n’elu ya,+ ọ bụrụkwa na ọ bụ iji chụọ àjà udo n’elu ya, Jehova n’onwe ya ga-achọpụta;+ 24  ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ bụghị n’ihi nchegbu maka ihe ọzọ mere anyị ji mee ihe a, sị, ‘N’ọdịnihu, ụmụ unu ga-asị ụmụ anyị: “Gịnị jikọrọ unu na Jehova bụ́ Chineke Izrel? 25  E nwere ókè Jehova kpara n’etiti anyị na unu, ụmụ Ruben na ụmụ Gad, ya bụ, Jọdan. Unu enweghị òkè na Jehova.”+ Ụmụ unu ga-emekwa ka ụmụ anyị kwụsị ịtụ egwu Jehova.’+ 26  “N’ihi ya, anyị sịrị, ‘Biko, ka anyị meere onwe anyị ihe site n’iwu ebe ịchụàjà, ọ bụghị maka ịchụ àjà nsure ọkụ ma ọ bụ àjà nkịtị, 27  kama ka ọ bụrụ ihe àmà n’etiti anyị+ na unu nakwa ọgbọ ga-abịa mgbe anyị nwụsịrị na anyị ga na-eje ozi Jehova n’ihu ya site n’ịchụ àjà nsure ọkụ anyị na àjà nkịtị anyị niile nakwa àjà udo anyị,+ ka ụmụ unu ghara ịgwa ụmụ anyị n’ọdịnihu, sị: “Unu enweghị òkè n’ebe Jehova nọ.”’ 28  Anyị wee sị, ‘Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na ha agwa anyị otú ahụ, gwakwa ọgbọ anyị n’ọdịnihu, anyị ga-asịkwa: “Lee ihe nnọchianya nke ebe ịchụàjà Jehova nke nna anyị hà wuru. Ọ bụghị maka ịchụ àjà nsure ọkụ ma ọ bụ àjà nkịtị, kama ọ bụ ihe àmà n’etiti anyị na unu.”’ 29  Tụfịakwa! Anyị agaghị enupụrụ Jehova isi, anyị agaghịkwa akwụsị iso Jehova taa,+ site n’iwu ebe ịchụàjà maka ịchụ àjà nsure ọkụ, àjà ọka na àjà nkịtị, ma e wezụga ebe ịchụàjà Jehova bụ́ Chineke nke dị n’ihu ụlọikwuu ya.”+ 30  Mgbe Finihas+ onye nchụàjà na ndị isi nke nzukọ+ ahụ na ndị isi nke puku kwuru puku ndị Izrel, bụ́ ndị ha na ya so, nụrụ ihe ụmụ Ruben na ụmụ Gad na ụmụ Manase kwuru, ọ dị ha mma. 31  Finihas nwa Elieza onye nchụàjà wee gwa ụmụ Ruben na ụmụ Gad na ụmụ Manase, sị: “Anyị amatawo taa na Jehova nọ n’etiti anyị,+ n’ihi na unu emesoghị Jehova omume ekwesịghị ntụkwasị obi a. Ugbu a, unu anapụtawo ụmụ Izrel n’aka Jehova.”+ 32  Finihas nwa Elieza onye nchụàjà na ndị isi ahụ wee si n’ebe ụmụ Ruben na ụmụ Gad nọ, n’ala Gilied, laghachi+ n’ala Kenan, lakwuru ụmụ Izrel ndị ọzọ wee kọọrọ ha ihe ha gatara.+ 33  Ihe ahụ ha kwuru wee dị ụmụ Izrel mma; ụmụ Izrel wee gọzie Chineke.+ Ha ekwuteghịkwa okwu ịga buso ha agha iji bibie ala ahụ ụmụ Ruben na ụmụ Gad bi. 34  Ụmụ Ruben na ụmụ Gad wee gụọ ebe ịchụàjà ahụ aha, n’ihi na “ọ bụ ihe àmà n’etiti anyị, na Jehova bụ ezi Chineke.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.