Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọshụa 12:1-24

12  Ndị a bụ ndị eze na-achị ala ụmụ Izrel meriri, ndị ha weghaara ala ha n’akụkụ ọwụwa anyanwụ+ nke Jọdan, malite n’iyi ndagwurugwu Anọn+ ruo n’Ugwu Hemọn,+ tinyere Araba+ dum nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ:  Saịhọn+ eze ndị Amọraịt, onye biri na Heshbọn,+ bụ́ onye na-achị malite n’Aroa+ nke dị n’akụkụ iyi ndagwurugwu Anọn,+ na etiti ndagwurugwu ahụ, na ọkara nke Gilied ruo Jabọk+ bụ́ iyi ndagwurugwu, nke bụ́ ókè nke ala ụmụ Amọn,  nakwa Araba+ ruo oké osimiri Kineret*+ dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ruokwa n’oké osimiri Araba, Oké Osimiri Nnu,+ n’ebe ọwụwa anyanwụ Bet-jeshimọt,+ nakwa n’ebe ndịda nke dị n’ala ala mkpọda Pisga.+  Tinyere ókèala Ọg+ eze Beshan, onye fọdụrụ n’ime ndị Refeyim,+ bụ́ ndị biri n’Ashtarọt+ na Edriaị,+  onye chịrị n’Ugwu Hemọn+ nakwa na Saleka nakwa na Beshan dum,+ ruo n’ókè ndị Geshọ+ na ndị Meakat,+ na ọkara nke Gilied, ruo n’ókèala Saịhọn+ eze Heshbọn.+  Ọ bụ Mozis ohu Jehova na ụmụ Izrel meriri ha,+ Mozis ohu Jehova wee nye ya ụmụ Ruben+ na ụmụ Gad+ na ọkara ebo Manase+ ka ọ bụrụ ihe nketa ha.  Ndị a bụ ndị eze na-achị ala Jọshụa na ụmụ Izrel meriri n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke Jọdan, malite na Bel-gad+ nke dị na ndagwurugwu* Lebanọn,+ ruo n’Ugwu Helak,+ nke dị ruo Sia,+ Jọshụa wee nye ya ebo niile nke Izrel ka ọ bụrụ ihe nketa ha n’òkè n’òkè,+  n’ógbè bụ́ ugwu ugwu nakwa na Shefila nakwa n’Araba nakwa n’ebe ndị dị ná mkpọda nakwa n’ala ịkpa nakwa na Negeb+—ndị Het, ndị Amọraịt+ na ndị Kenan, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt na ndị Jibọs:+   Eze Jeriko,+ otu; eze E-aị,+ nke dị n’akụkụ Betel, otu; 10  eze Jeruselem,+ otu; eze Hibrọn,+ otu; 11  eze Jamọt,+ otu; eze Lekish,+ otu; 12  eze Eglọn,+ otu; eze Giza,+ otu; 13  eze Diba, +otu; eze Gida, otu; 14  eze Họma, otu; eze Erad, otu; 15  eze Libna,+ otu; eze Adọlam, otu; 16  eze Makida,+ otu; eze Betel,+ otu; 17  eze Tapua, otu; eze Hifa,+ otu; 18  eze Efek, otu; eze Lasharọn, otu; 19  eze Medọn,+ otu; eze Hezọ,+ otu; 20  eze Shimrọn-mirọn, otu; eze Akshaf,+ otu; 21  eze Teanak, otu; eze Megido,+ otu; 22  eze Kidesh, otu; eze Jọkniam+ nke dị na Kamel, otu; 23  eze Dọọ nke dị na mkputamkpu ugwu nke Dọọ,+ otu; eze Goyim nke dị na Gilgal, otu; 24  eze Teza, otu; ndị eze ahụ niile dị iri atọ na otu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

N’ezie, ọ bụ ọdọ mmiri; Baịbụl kpọkwara ya ọdọ mmiri Genesaret, Osimiri Galili, nakwa Osimiri Taịbirịas.
Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mbara ala nke dị na ndagwurugwu.”