Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọshụa 1:1-18

1  O wee ruo mgbe Mozis ohu Jehova nwụsịrị na Jehova gwara Jọshụa+ nwa Nọn, onye na-ejere Mozis ozi,+ sị:  “Ohu m Mozis anwụọla;+ bilie, gafee Jọdan a, gị na ndị a niile, banye n’ala ahụ m na-enye ha, bụ́ ụmụ Izrel.+  Ebe ọ bụla ọbụ ụkwụ unu ga-azọsa, ọ bụ unu ka m ga-enye ya, dị nnọọ ka m kwere Mozis ná nkwa.+  Malite n’ala ịkpa nakwa na Lebanọn a ruo ná nnukwu osimiri ahụ, bụ́ osimiri Yufretis, ya bụ, ala ndị Het dum,+ ruokwa n’Osimiri Ukwu dị n’ebe ọdịda anyanwụ, ka ókèala unu ga-eru.+  Ọ dịghị onye ga-eguzosi ike n’ihu gị ụbọchị niile nke ndụ gị.+ M ga-anọnyere gị dị nnọọ ka m nọnyeere Mozis.+ Agaghị m agbahapụ gị, agaghịkwa m ahapụ gị ma ọlị.+  Nwee obi ike, dịkwa ike,+ n’ihi na ọ bụ gị ga-eme ka ndị a keta+ ala ahụ m ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi inye ha.+  “Naanị nwee obi ike, dịkwa ike nke ukwuu ka i wee lezie anya mezuo iwu ahụ dum nke Mozis ohu m nyere gị.+ Ahapụla ya gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe,+ ka i wee jiri amamihe mee ihe n’ebe ọ bụla ị na-aga.+  Akwụkwọ iwu a agaghị apụ n’ọnụ gị,+ ị ga na-agụkwa ihe dị na ya n’olu dị ala ehihie na abalị, ka i wee lezie anya mee ihe niile e dere na ya;+ n’ihi na mgbe ahụ, ị ga-eme ka ụzọ gị gaa nke ọma, mgbe ahụkwa, ị ga-eji amamihe mee ihe.+  Ọ̀ kwa m nyere gị iwu?+ Nwee obi ike, dịkwa ike. Amala jijiji, atụkwala ụjọ,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị ebe ọ bụla ị na-aga.”+ 10  Jọshụa wee nye ndị na-elekọta ụmụ Izrel iwu, sị: 11  “Gagharịanụ n’ebe unu mara ụlọikwuu ma nye ụmụ Izrel iwu, sị, ‘Kwadeberenụ onwe unu ihe oriri, n’ihi na abalị atọ taa unu ga-agafe Jọdan a ịbanye nweta ala ahụ nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ka ọ bụrụ nke unu.’”+ 12  Jọshụa gwakwara ụmụ Ruben na ụmụ Gad na ọkara ebo Manase, sị: 13  “Na-echetanụ okwu Mozis bụ́ ohu Jehova nyere unu n’iwu,+ sị, ‘Jehova bụ́ Chineke unu na-eme ka unu zuru ike, o nyewokwa unu ala a. 14  Ndị nwunye unu, ụmụntakịrị unu na anụ ụlọ unu ga-anọ n’ala ahụ Mozis nyere unu n’akụkụ a nke Jọdan;+ ma unu niile, ndị dimkpa bụ́ dike,+ ga-anọ n’usoro dị ka ndị agha+ wee butere ụmụnne unu ụzọ, unu ga-enyekwara ha aka. 15  Mgbe Jehova bu ụzọ mee ka ụmụnne unu zuru ike dị ka o meere unu, ha enwetakwa ala ahụ nke Jehova bụ́ Chineke unu na-enye ha,+ unu ga-alọghachikwa n’ala nke bụ́ ihe nketa unu ma nweta ya,+ bụ́ nke Mozis ohu Jehova nyere unu n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Jọdan.’”+ 16  Ha wee zaa Jọshụa, sị: “Anyị ga-eme ihe niile i nyere anyị n’iwu, anyị ga-agakwa ebe ọ bụla ị ga-eziga anyị.+ 17  Dị ka anyị gere Mozis ntị n’ihe niile, otú ahụ ka anyị ga-ege gị ntị. Naanị ka Jehova bụ́ Chineke gị nọnyere gị+ dị nnọọ ka ọ nọnyeere Mozis.+ 18  A ga-egbu+ onye ọ bụla nke nupụrụ isi n’iwu gị,+ nke na-egeghịkwa ntị n’okwu gị, bụ́ ihe niile ị ga-enye ya n’iwu. Naanị nwee obi ike, dịkwa ike.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji