Jọn 18:1-40
18 Mgbe Jizọs kwusịrị ihe ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ wee gafee iyi Kidrọn+ gaa n’ebe e nwere ubi. Ya na ndị na-eso ụzọ ya banyekwara n’ime ya.+
2 Judas, onye ga-arara ya nye, makwaara ebe ahụ, n’ihi na Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya zukọrọ n’ebe ahụ ọtụtụ mgbe.+
3 Ya mere, Judas kpọọrọ ndị agha na ndị ọrụ nche nke ndị isi nchụàjà nakwa nke ndị Farisii wee jiri ọwa na oriọna na ngwá ọgụ bịa ebe ahụ.+
4 Ya mere, ebe Jizọs maara ihe niile ga-abịakwasị ya,+ ọ gakwuuru ha, sị ha: “Ònye ka unu na-achọ?”
5 Ha wee zaa ya, sị: “Ọ bụ Jizọs onye Nazaret.”+ O wee sị ha: “Ọ bụ m.” Judas, onye na-arara ya nye,+ sokwa ha guzoro.
6 Otú ọ dị, mgbe ọ sịrị ha: “Ọ bụ m,” ha lara azụ+ wee daa n’ala.
7 Ya mere, ọ jụrụ ha ọzọ, sị: “Ònye ka unu na-achọ?” Ha wee sị: “Jizọs onye Nazaret.”
8 Jizọs zara, sị: “Agwara m unu na ọ bụ m. Ya mere, ọ bụrụ na ọ bụ m ka unu na-achọ, hapụnụ ndị a ka ha laa”;
9 ka okwu ahụ wee mezuo, nke o kwuru, sị: “N’ime ndị ahụ i nyere m, otu onye efunahụghị m.”+
10 Ma ebe Saịmọn Pita ji mma agha, ọ mịịrị ya gbuo ohu nnukwu onye nchụàjà, wee bepụ ntị aka nri ya.+ Aha ohu ahụ bụ Malkọs.
11 Otú ọ dị, Jizọs sịrị Pita: “Mịghachi mma agha ahụ n’ọbọ ya.+ Iko nke Nna m nyere m, ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ijisi ike ṅụọ+ ya?”
12 Ndị agha ahụ na ọchịagha na ndị ọrụ nche nke ndị Juu wee jide Jizọs kee ya agbụ,
13 ha wee buru ụzọ dugara ya Anas; n’ihi na ọ bụ nna nwunye Keyafas, bụ́ nnukwu onye nchụàjà n’afọ ahụ.+
14 N’eziokwu, Keyafas bụ onye ahụ nyere ndị Juu ndụmọdụ na ọ kaara ha mma ka otu onye nwụchitere ha ọnwụ.+
15 Saịmọn Pita nọ na-eso Jizọs, ya na onye ọzọ bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs.+ Nnukwu onye nchụàjà maara onye ahụ na-eso ụzọ Jizọs, onye a wee soro Jizọs banye na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà ahụ,
16 ma Pita guzo n’èzí n’ọnụ ụzọ.+ Ya mere, onye ọzọ ahụ bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ onye nnukwu onye nchụàjà ahụ maara, gara gwa onye nche ọnụ ụzọ okwu wee kpọbata Pita.
17 Nwa agbọghọ nke na-eje ozi, bụ́ onye nche ọnụ ụzọ ahụ, wee sị Pita: “Ọ̀ bụ na ị bụghị otu n’ime ndị na-eso ụzọ nwoke a?” O wee sị: “Abụghị m.”+
18 Ndị ohu na ndị ọrụ nche guzocha nso n’ebe ahụ, ebe ha kwanyere ọkụ icheku,+ n’ihi na oyi na-atụ, ha na-anyakwa ọkụ. Pita sokwa ha guzoro, na-anya ọkụ.
19 Ya mere, onyeisi nchụàjà jụrụ Jizọs ajụjụ banyere ndị na-eso ụzọ ya na ozizi ya.
20 Jizọs zara ya, sị: “Agwara m ụwa okwu n’ihu ọha. M kụziri ihe mgbe niile n’ụlọ nzukọ nakwa n’ụlọ nsọ,+ bụ́ ebe ndị Juu niile na-ezukọta; ọ dịghịkwa ihe m kwuru na nzuzo.
21 Gịnị mere i ji na-ajụ m ajụjụ? Jụọ ndị nụrụ ihe m gwara ha. Lee! Ha maara ihe m kwuru.”
22 Mgbe o kwusịrị ihe ndị a, otu n’ime ndị ọrụ nche ahụ guzo nso n’ebe ahụ mara Jizọs ụra+ n’ihu wee sị: “Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si aza onyeisi nchụàjà ajụjụ?”
23 Jizọs zara ya, sị: “Ọ bụrụ na o nwere ihe ọjọọ m kwuru, gbaa akaebe na o nwere ihe ọjọọ m kwuru; ma ọ bụrụ na ihe m kwuru ziri ezi, gịnị mere i ji tie m ihe?”
24 Ka o bu agbụ e kere ya, Anas nyere iwu ka a kpụrụ ya kpụgara Keyafas bụ́ nnukwu onye nchụàjà.+
25 Saịmọn Pita guzo na-anya ọkụ. Ha wee sị ya: “Ọ̀ bụ na ị bụghị otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya?” Ọ gọrọ agọ wee sị: “Abụghị m.”+
26 Otu n’ime ndị ohu nnukwu onye nchụàjà ahụ, bụ́ onye ikwu nke nwoke ahụ Pita bepụrụ ntị,+ sịrị: “Ọ̀ bụ na mụ ahụghị gị na ya n’ubi ahụ?”
27 Otú ọ dị, Pita gọrọ agọ ọzọ; ozugbo ahụ, oké ọkpa kwara.+
28 Ha wee duru Jizọs si n’ụlọ Keyafas gaa n’obí gọvanọ.+ Ọ bụzi ụtụtụ. Ma ha onwe ha abanyeghị n’obí gọvanọ ahụ, ka ha wee ghara ịbụ ndị e merụrụ,+ kama ka ha nwee ike iri nri ememme ngabiga.
29 Ya mere, Paịlet bịakwutere ha n’èzí, sị: “Olee ebubo unu na-ebo nwoke a?”+
30 Ha zara ya, sị: “A sị na nwoke a abụghị onye na-eme ihe ọjọọ, anyị agaraghị enyefe ya n’aka gị.”
31 Ya mere, Paịlet sịrị ha: “Kpọrọnụ ya, kpeekwanụ ya ikpe dị ka iwu unu si dị.”+ Ndị Juu sịrị ya: “Iwu akwadoghị ka anyị gbuo onye ọ bụla.”+
32 Nke a bụ ka e wee mezuo okwu Jizọs kwuru iji gosi ụdị ọnwụ a kara aka na ọ ga-anwụ.+
33 Ya mere, Paịlet banyere ọzọ n’obí gọvanọ wee kpọọ Jizọs, sị ya: “Ị̀ bụ eze ndị Juu?”+
34 Jizọs zara, sị: “Ọ̀ bụ gị chepụtara ihe a ị na-ekwu, ka ọ̀ bụ ndị ọzọ gwara gị banyere m?”+
35 Paịlet zara, sị: “Àbụ m onye Juu? Mba gị na ndị isi nchụàjà nyefere gị n’aka m.+ Gịnị ka i mere?”
36 Jizọs zara, sị:+ “Alaeze m abụghị nke ụwa a.+ A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ+ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Otú ọ dị, alaeze m esighị n’ebe a.”
37 Ya mere, Paịlet sịrị ya: “Ọ dị mma, ị̀ bụ eze?” Jizọs zara, sị: “Gị onwe gị na-ekwu na m bụ eze.+ Ọ bụ n’ihi nke a ka e ji mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m ji bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.+ Onye ọ bụla nke dịnyeere eziokwu+ na-ege ntị n’olu m.”+
38 Paịlet sịrị ya: “Gịnị bụ eziokwu?”
Mgbe o kwusịrị ihe a, ọ gaghachikwuuru ndị Juu, sị ha: “O nweghị ihe ọjọọ m hụrụ o mere.+
39 Unu nwekwara omenala na m ga-ahapụrụ unu otu onye n’oge ememme ngabiga.+ Ya mere, ùnu chọrọ ka m hapụrụ unu eze ndị Juu?”
40 Ha wee tie mkpu ọzọ, sị: “Ọ bụghị nwoke a, kama ọ bụ Barabas!” Barabas bụ onye na-apụnara mmadụ ihe.+