Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọn 17:1-26

17  Jizọs kwuru ihe ndị a wee lelie anya n’eluigwe,+ sị: “Nna, oge awa ahụ eruwo; mee ka ọkpara gị dị ebube, ka ọkpara gị wee mee ka ị dị ebube,+  ebe i nyere ya ikike n’ebe anụ ahụ́ niile dị,+ ka o wee nye ndị ahụ niile i nyere ya+ ndụ ebighị ebi.+  Iji nweta ndụ ebighị ebi,+ ọ dị ha mkpa ịmata+ gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke,+ matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.+  Emewo m ka ị dị ebube+ n’ụwa, ebe ọ bụ na arụchaala m ọrụ i nyere m ka m rụọ.+  Ya mere, ugbu a, Nna, mee ka m nwee ebube n’akụkụ gị, bụ́ ebube m nwere n’akụkụ gị mgbe ụwa na-adịbeghị.+  “Emewo m ka aha gị pụta ìhè nye ndị i si n’ụwa nye m.+ Ha bụ nke gị, i nyekwara m ha, ha edebewokwa okwu gị.  Ha amarawo ugbu a na ihe niile i nyere m si n’aka gị;  n’ihi na enyewo m ha okwu i nyere m,+ ha anatawokwa ya, ha amarawokwa n’ezie na m bịara dị ka onye nnọchiteanya gị,+ ha ekwerewokwa na ọ bụ gị zitere m.+  M na-arịọ arịrịọ banyere ha; m na-arịọ, ọ bụghị banyere ụwa,+ kama banyere ndị i nyere m; n’ihi na ha bụ nke gị, 10  ihe m niile bụkwa nke gị, ihe gị bụkwa nke m,+ e mewokwa ka m dị ebube n’etiti ha. 11  “Anọkwaghị m n’ụwa, ma ha nọ n’ụwa,+ m na-abịakwutekwa gị. Nna dị nsọ, chee ha nche+ n’ihi aha gị nke i nyere m, ka ha wee bụrụ otu, dị ka anyị bụ otu.+ 12  Mgbe mụ na ha nọ, m na-eche ha nche+ n’ihi aha gị nke i nyere m; edebewokwa m ha, ọ dịghịkwa otu n’ime ha e bibiri+ ma e wezụga nwa mbibi ahụ,+ ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ wee mezuo.+ 13  Ma ugbu a, m na-abịakwute gị, m na-ekwukwa ihe ndị a n’ụwa ka ha wee nwee ọṅụ m n’ụzọ zuru ezu n’ime onwe ha.+ 14  Enyewo m ha okwu gị, ma ụwa kpọrọ ha asị,+ n’ihi na ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.+ 15  “Ihe m na-arịọ gị abụghị ka ị kpọpụ ha n’ụwa, kama ka i chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ.+ 16  Ha abụghị nke ụwa,+ dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.+ 17  Jiri eziokwu doo ha nsọ;+ okwu gị+ bụ eziokwu.+ 18  Dị nnọọ ka i zitere m n’ụwa, m zipụkwara ha n’ụwa.+ 19  M na-edokwa onwe m nsọ n’ihi ha, ka e wee jirikwa eziokwu doo ha nsọ.+ 20  “M na-arịọ arịrịọ, ọ bụghị naanị banyere ndị a, kamakwa banyere ndị nwere okwukwe n’ebe m nọ site n’okwu ha;+ 21  ka ha niile wee bụrụ otu,+ dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ onwe m dị n’otu, mụ onwe m na gị adịrịkwa n’otu,+ ka anyị na ha wee dị n’otu,+ ka ụwa wee kwere na ọ bụ gị zitere m.+ 22  M nyewokwa ha otuto ahụ i nyere m, ka ha wee bụrụ otu dị nnọọ ka anyị bụ otu.+ 23  Mụ na ha dị n’otu, gị onwe gị na mụ onwe m dịkwa n’otu, ka ha wee dị n’otu n’ụzọ zuru okè,+ ka ụwa wee mara na ọ bụ gị zitere m, marakwa na ị hụrụ ha n’anya dị nnọọ ka ị hụrụ m n’anya. 24  Nna, banyere ihe i nyere m, ọ dị m ka ya bụrụ na ha onwe ha ga-eso m nọrọ n’ebe m nọ,+ ka ha wee hụ ebube i nyere m, n’ihi na ị hụrụ m n’anya tupu a tọọ ntọala+ ụwa.+ 25  Nna bụ́ onye ezi omume,+ n’ezie, ụwa amarabeghị gị;+ ma amarawo m gị, ndị a amarawokwa na ọ bụ gị zitere m.+ 26  Emewokwa m ka ha mara aha gị,+ m ga-emekwa ka a mara ya, ka ịhụnanya i nwere n’ebe m nọ wee dịrị n’ime ha, mụ na ha adịkwa n’otu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji