Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Jọn 13:1-38

13  Ma, ebe Jizọs maara tupu ememme ngabiga ahụ na oge awa ya eruwo+ ka ọ pụọ n’ụwa lakwuru Nna ya,+ ọ hụrụ ndị nke ya nọ n’ụwa n’anya,+ ọ hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.  Ya mere, mgbe ha nọ na-eri nri anyasị ahụ, mgbe Ekwensu tinyeworo ya n’obi Judas Iskarịọt,+ nwa Saịmọn, ịrara ya nye,+  ya onwe ya maara na Nna ya enyefewo ihe niile n’aka ya,+ marakwa na ya si n’ebe Chineke nọ bịa, na-alakwurukwa Chineke.+  O biliri na nri anyasị ahụ ma chịsa uwe elu ya n’akụkụ. O weere ákwà e ji ehicha ahụ́ kee n’úkwù.+  Mgbe o mesịrị, ọ gbanyere mmiri n’efere wee malite ịsa ụkwụ+ ndị na-eso ụzọ ya, jirikwa ákwà ahụ e ji ehicha ahụ́ o kere n’úkwù na-ehicha ha.  O wee rute n’ebe Saịmọn Pita nọ. Ọ sịrị ya: “Onyenwe anyị, ị̀ na-asa m ụkwụ?”+  Jizọs zara ya, sị: “Ị ghọtaghị ugbu a ihe m na-eme, ma ị ga-aghọta ya mgbe ihe ndị a gasịrị.”+  Pita sịrị ya: “N’ezie, ị gaghị asa m ụkwụ ma ọlị.” Jizọs wee sị ya: “Ọ bụrụ na mụ asaghị gị ụkwụ,+ o nweghị ihe jikọrọ mụ na gị.”  Saịmọn Pita sịrị ya: “Onyenwe anyị, ọ bụghị naanị ụkwụ m, kamakwa aka m na isi m.” 10  Jizọs wee sị ya: “Onye sara ahụ́,+ ọ dịghị mkpa ịsa ya ebe ọzọ ma e wezụga ụkwụ ya, ma ahụ́ ya dum dị ọcha. Unu dịkwa ọcha, ma ọ bụghị unu niile.” 11  N’ezie, ọ maara onye na-arara ya nye.+ Ọ bụ ya mere o ji sị: “Ọ bụghị unu niile dị ọcha.” 12  Mgbe ọ sasịrị ha ụkwụ, yirikwa uwe elu ya wee nọdụ ala ọzọ na tebụl, ọ sịrị ha: “Ùnu maara ihe m meere unu? 13  Unu na-akpọ m, ‘Onye Ozizi,’+ na, ‘Onyenwe anyị,’+ ihe unu na-akpọ m zikwara ezi, n’ihi na ọ bụ ihe m bụ.+ 14  Ya mere, ọ bụrụ na mụ onwe m sara unu ụkwụ,+ ọ bụ ezie na m bụ Onyenwe unu na Onye Ozizi, unu kwesịkwara ịsarịta ibe unu ụkwụ.+ 15  N’ihi na m na-enye unu ihe nlereanya, ka unu meekwa otú ahụ, dị nnọọ ka m meere unu.+ 16  N’ezie, n’ezie, ana asị unu, Ohu adịghị aka nna ya ukwu, onye ozi adịghịkwa aka onye zitere ya.+ 17  Ọ bụrụ na unu maara ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu ana-eme ha.+ 18  Adịghị m ekwu banyere unu niile; amaara m ndị m họọrọ.+ Kama ọ bụ ka e wee mezuo Akwụkwọ Nsọ,+ nke sịrị, ‘Onye na-eri nri m ebiliwo megide m.’*+ 19  Malite ugbu a gaa n’ihu, ana m agwa unu tupu ya emee,+ ka unu wee kwere na ọ bụ m bụ ya mgbe ọ ga-eme. 20  N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Onye na-anabata onye ọ bụla nke m zitere na-anabatakwa m.+ N’aka nke ọzọ, onye na-anabata m, na-anabatakwa onye ahụ nke zitere m.”+ 21  Mgbe Jizọs kwusịrị ihe ndị a, mmụọ ya malitere inye ya nsogbu, o wee gbaa àmà, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Otu onye n’ime unu ga-arara m nye.”+ 22  Ndị na-eso ụzọ ya malitere ilerịta ibe ha anya, n’amaghị onye n’ime ha ọ na-ekwu maka ya.+ 23  Ọ dị otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs nke nọ nso n’obi ya na-eri ihe, Jizọs hụkwara ya n’anya.+ 24  Ya mere, Saịmọn Pita kweere onye a n’isi, sị ya: “Kwuo onye ọ na-ekwu maka ya.” 25  Ya mere, onye a dalara azụ dabere n’obi Jizọs wee sị ya: “Onyenwe anyị, ònye ka ọ bụ?”+ 26  Ya mere, Jizọs zara, sị: “Ọ bụ onye ahụ m ga-enye achịcha a m na-esuru.”+ N’ihi ya, mgbe o suuru achịcha ahụ, o weere ya nye Judas, nwa Saịmọn Iskarịọt. 27  Mgbe o nyesịrị ya achịcha ahụ, Setan banyere n’ime Judas.+ Ya mere, Jizọs sịrị ya: “Ihe ị na-eme, mee ya ọsọ ọsọ.” 28  Otú ọ dị, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị nọ na-eri ihe na tebụl maara ihe mere o ji gwa ya ihe a. 29  N’eziokwu, ụfọdụ chere na ebe ọ bụ Judas na-eji igbe ego,+ na Jizọs na-asị ya: “Zụta ihe ndị dị anyị mkpa maka ememme a,” ma ọ bụ na o kwesịrị inye ndị ogbenye ihe.+ 30  Ya mere, mgbe ọ narasịịrị achịcha ahụ, ọ pụrụ ozugbo. Ọ bụkwa n’abalị.+ 31  Ya mere, mgbe ọ pụrụ, Jizọs sịrị: “Ugbu a, e mewo ka Nwa nke mmadụ dị ebube,+ e mewokwa ka Chineke dị ebube site n’aka ya. 32  Chineke ga-emekwa ka ọ dị ebube,+ ọ ga-emekwa ka ọ dị ebube ozugbo. 33  Ụmụntakịrị,+ mụ na unu ga-anọkwu obere oge. Unu ga-achọ m; dị nnọọ ka m gwara ndị Juu, sị, ‘Unu apụghị ịbịa ebe m na-aga,’+ otú ahụ ka m na-agwakwa unu ugbu a. 34  Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya,+ ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya.+ 35  Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”+ 36  Saịmọn Pita sịrị ya: “Onyenwe anyị, olee ebe ị na-aga?” Jizọs zara, sị: “Ị pụghị iso m ugbu a gaa ebe m na-aga, kama ị ga-eso m ma e mesịa.”+ 37  Pita jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, gịnị mere na apụghị m iso gị ugbu a? M ga-atọgbọ mkpụrụ obi m n’ihi gị.”+ 38  Jizọs zara, sị: “Ị̀ ga-atọgbọ mkpụrụ obi gị n’ihi m? N’ezie, n’ezie, ana m asị gị, Oké ọkpa agaghị akwa ma ọlị ruo mgbe ị gọnahụrụ m ugboro atọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Grik bụ “ebuliwo ikiri ụkwụ ya megide m.”